Gọọmenti biko zọpụta Alaigbo n'aka mbuze - Ntorobia Ohaneze

Ebe foto si, CHUKWUMA OKPALA
Mbuze na-akpa mkpamkpa n'ọtụtụ n'ala Igbo
Ndị ntorobia otu Ohaneze Ndigbo na-arịọ gọọmentị etiti ka ha gbata ọsọ enyemaka maka mbuze na-ebibi ọtụtụ ebe n'Ebonyị na Abia steeti.
N'ime akwụkwọ osote onyeisi otu a bụ Obinna Achuonye degara gọọmentị, ha kwuru na mbuze emeela ka okporo ụzọ Abakaliki/Ugep n'ime Ebonyi steeti nakwa Isuikwuato n'Abia steeti buru ebe agbara ọnya ọnwụ.
Mbuze achụpụla ndị mmadụ n’ụlọ ha na Nanka
Ha dekwara na ndụmọdụ ha na-enye gọvanọ Ebonyi steeti bụ David Umahi bụ ka ya na onyeisiala Naịjirịa kwado onwe ha maka ịhu na ala Igbo nwetara uru kwesiri iru ha aka.
N'ọnụ okwu ha; "Gọọmenti Buhari na-arụ ọtụtụ ọrụ n'ala Igbo mana ọbụrụ na gọvanọ ndị dị iche iche n'ala Igbo anaghị agba mbọ ịhụ na gọọmentị etiti chetara ha oge ọbụla ma ha chọ ịrụ ọrụ ọbụla na Naịjirịa, ala Igbo agaghị enwe mmepe ka ha siri chọ."
Achuonye dere na Ihe bụ nsogbu kachasị ugbua n'ala Igbo bụ mbuze nakwa na oge ịtinye ọnụ na ya bụ okwu bụ ugbua.
Akụkọ ga-amasị gị