Serena Williams: Ihe Chioma Ajunwa na ndị ọzọ na-ekwu

Serena Williams Image copyright EPA
Nkenke aha onyonyo Serena Williams kwuru na ya na-ebu agha a maka ụmụnwanyị niile

Serena Williams na-ewu ugbua na soshal midia maka ihe o mere n'asọmpi ikpeazu nke US Open.

Naomi Osaka meriri Williams na ya bụ asọmpị mana ọ bụghị mmeri a ka ndị egwuregwu tennis na-asọpụ isi na-ekwu ugbua.

Willams na-egbu ogbu asọmpị bụ Carlos Ramos nwere esemokwu maka na o boro Willams ebubo idaiwu egwuregwu a.

Mana Willams ekweghị na mkpebi a.

Ọ jụrụ ajụjụ na gịnị mere na onweghị ihe ha na-eme ndị nwoke na-eme udi ihe a? Gịnị mere na sọọsọ ụmụnwaanyị ka ha na-ata ụdị ahụhụ?

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Naomi Osaka bere akwa maka ihe a mere na yabụ asọmpi

Na ngwụcha yabụ egwuregwu, ha dara Williams nha ruru puku dọla iri na asaa.

Williams kpọrọ mkpebi a 'Sexicism' na Bekee.

Ihe ndị egwuregwu Naịjịrịa na-ekwu

BBC Igbo gbara nnukwu mmadụ abụọ n'egweregwu ajụjụ ọnụ gbasara okwu a.

Chioma Ajunwa bụ onye bubu ọgbaọsọ na Naijịrịa kwuru n'ezi okwu, Williams emeghị ka onye ha ga-elekwasị anya.

Ajunwa kwuru na: "Ihe Serena mere bụ ihe ihere, o kwesiri ịche mgbe ha gbachara asọmpị a. ọ gwa ogbuopi ahụ ihe di ya n'obi"

Yemi Owoseni bụ otu n'ime ndị isioche ngalaba na-ahụ maka egwuregwu tenis na Naịjirịa kwuru na onweghị ihe dị iche na iwu na-achị asọmpị ụmụnwoke na ụmụnwanyị.

O kwuru na ihe Serena Williams mere gosiri na o nweghị nsọpụrụ cha cha.

Mana Ajunwa kwukwara na ihe Willaims na-ekwu maka ịmegbu ụmụwanyị n'egwuregwu ọbụla bụ eziokwu.

Okwu a na-ekpo ọkụ na Social Media

@Rajeevbalasu dere na Serena ediela mmekpaahụ ọtụtụ afọ

‏@IAmSophiaNelson dere na ihe ka ndị ụmụnwanji jiri nji na-ahụ ụbọchị ụbụla nakwa na onweghị onye na-arịọ ha mgbaghara.

Lee ihe @Knightcartoons sere na social media

Ashley Hamond gbara ajụjụ na oge eruola anyị Serena gara ezumike nka?

Isiokwu Ndị Emetụtara