Kedu ihe mere mmadụ 800,000 ji egbu onwe ha kwa afọ?

Ụdọ igbu onwe
Nkenke aha onyonyo Gịnị butere udị emume a?

Ọgbakọ na-echekwa ahụ ike na mba ụwa niile bụ World Health Organistion ekwuola na mmadụ ruru nari puku asatọ (800,000) bụ ndị na-egbu onweha kwa afọ.

Ha kwukwara na ihe a bụtere ọnwụ n'etiti ndị mmadụ dị afọ iri na ise ruo afọ iri abụọ na itoolu n'afọ 2016.

Ha kwuru nke a n'ime akwụkwọ ha zipuru maka ncheta ụbọchị ịkwụsị ogbugbu onwe nke akporọ World Suicide Prevention Day na bekee.

Ha kwuru na ihe ndị mmadụ kachasị egbu onwe ha bụ ịkwụụdọ nakwa iji egbe gbagbuo onwe ha.

Ha kwusiri ike na ihe a na-emetuta onyeọbụla ma ọganyara maọbụ ogbenye.

Nkenke aha onyonyo Ndị na-aṅụ ọgwụ ike nwere ike igbu onwe ha

WHO kwukwara na ọ bụ ndị mba ndị aka adịchaghị n'ego na-enwe ndị kachasị egbu onwe ha.

N'ime nyocha ha mere, ha chọpụtara na otu mmadụ na-egbu onwe ha na nkeji iri anọ ọbụna.

Nakwa na mmadụ ruru iri na ise na-anwa igbu onwe ha n'ise ụbọchị niile.

WHO dọrọ onyeọbụla na ṅụ nnukwu mmanya nakwa ndị na aṅụ ọgwụ ike aka na ntị makana ọ bụ omume a na-ebute echiche igbu onwe.

Omenala Igbo

Ogbugbu onwe bụ arụ n'ọtụtụ omenala dị icheiche gunyere Alaigbo, mana ọtụtụ ndị ntorobia ka na-egbu onwe ha na steeti dị icheiche gunyere Alaigbo.

WHO na-ekwu na makana ogbugbu onwe bụ arụ na ndị nwere echiche ịgbu onwe ha anaghị achọ ikwupute okwu maọbụ gwa ezinụlọ ha nsogbu ha.

Ha kwukwara na ruo ugbua sọọsọ mba ruru iri atọ na asatọ mere ịkwụsị ogbugbu onwe ihe di ezigbo mkpa n'ala ha.

Akụkọ ga-amasị gị