Paris Club Refund: Ajụjụ steeti gọọmentị kwesiri ịza

Ndị gọvanọ ọwụwa anyanwụ
Nkenke aha onyonyo Akụkọ na-ekwubu na ndị gọvanọ mpaghara ọwụwa anyanwụ adighị n'otu.

Okechukwu Okere bụ onye ọnụ na-eru n'okwu n'ihe gbasara okwu ego gwara BBC Igbo na ego 'Paris Club Refund' gọọmentị etiti na-ekwe nkwa na ha ga-ekenye steeti di iche iche na Naịjirịa ga-ala n'iyi maọbụrụ na gọọmentị etiti agbaghị ndị steeti ajụjụ dị ezigbo mkpa.

Cheta na gọọmentị etiti nyere mkpebi gbasara ọnọdụ steetị ọbụla na Naijiria gunyere nke ndị ala Igbo ga-anọ tupu ha esoro n'ime okike ego ahụ gọọmentị chọpụtara na mba France nke akpọrọ Paris Club Refund na bekee.

Gọọmentị kwuru na ha ga-enye steeti niile ego ruru ijeri dọla abụọ na nde isi na asatọ ($2.68bn) dịka ego nke ikpeazu ha ga-anata n'ego a achọpụtara.

Mana ministri na-ahazị ego Naijiria bụ Ministry of Finance na bekee ekwuola na ọbụrụ na steeti di iche iche emeghị ụfọdụ ihe, ha gaghị eso n'okike ego a.

Kedu ihe a na-atụ anya n'aka ndị steeti a?

Gọọmentị kwuru na steeti niile kwesiri ịkwu ego niile a jiri ndị ọrụ ha

Steeti niile ga-agbakwa mbọ kwuchiete ego ha gbaziri n'aka gọọmentị n'afọ 2016 nke akpọrọ Budget Support Loans.

Ọzọ bụ na Steeti niile ga-akwụchasị ego niile ha kwesiri ịkwụ na nkwekọrịta Presidential Fertilizer Initiative ha na gọọmentị nwere ka mgbe afọ garaaga.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ụfọdụ ndị ọrụ n'Imo steeti na-ekwu na gọọmentị ka jiri ha ụgwọ

Ọnọdụ ọzọ bụ na steetị niile kwesiri ịnata ego ruru ha aka n'ime ngalaba Universal Basic Education Commission, gọọmentị na-ekwu na ego a ga-akwalite akwụkwọ primari na steeti di iche iche.

Cheta na gọọmentị na steeti di iche iche na-enwe nsogbu maka ego ahụ kemgbe afọ 1995.

Ajụjụ Okere na-ajụ?

Okere gwara onye ntaakụkọ anyị na tupu ha ekenye ndị steeti a ego, gọọmentị kwesiri ịjụ ihe a ga-eji ego ahụ nwere mee.

Ọzọ bụ na, o nwere uru ga-apụta na ihe a steeti gọọmentị dị iche iche ga-eji ego a mee?

Nke atọ bụ na, steeti gọọmentị dị iche iche a ga-ekwe nkwa na ndị ga-achị n'ihu ga-akwado ebumnobi ha ebe ha tinyere ego ahụ.

Mana Okere kwuru na ihe na-agbawa ya obi bụ na ọ cheghị na ndị gọọmentị ga-enwe ike ịza ajụjụ ndị a.

Gọvanọ dị iche iche n'ala Igbo ha di njikere?

Na mmemme ụbọchị ndị ọrụ ha mere n'afọ a, ndị ọrụ Imo steeti putara n'igwe na-ebe akwa na gọọmentị dị iche iche n'ala Igbo ka na-eji ha ọtụtụ ụgwọ ọnwa, nakwa ego ezumike nka akporọ "pension" na Bekee.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ipob malitere n'ala Igbo makana ọtụtụ mmadụ na-ekwu na gọọmentị etiti echefuola ndị Igbo

Ndị ọrụ gara ezumike nka kwuru na ụbọchị ahụ na gọọmentị steeti ha ka na-eji ha ụgwọ ruru ọnwa iri atọ ruo iri ise na anọ.

Ọtụtụ n'ime ha na-ebe akwa na ọdịghị mma na gọọmentị na-ebe ego ezumike n'ime ego ọnwa ha makana ego ahụ ezughi ezu.

Mana gọvanọ dị iche iche dịka gọvanọ Rochas Okorocha nke Imo na-ekwu na onweghị ụgwọ ọbụla o ji ndị ọrụ ya.

Akụkọ ga-amasị gị

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media caption'Not to young to run' abụghị maka ogbenye ọnụ ntụ - APC

Isiokwu Ndị Emetụtara