Buhari chọrọ ịkwụ ndị ruburu na Nigerian Airways ụgwọ ezumike nka

Akụkọ kachasị mkpa taa:

Ego Buhari mapụtara

Mịnịstrị na-ahụ maka akụnaụba Naịjirịa, kwuputara na Onyeisiala Buhari ebinyela aka n'akwụkwọ maka inye ndị mahadum gọọmentị ijeri naịra iri abụọ ozugbo ozugbo ka ha nwee ike kuru ume ọhụrụ.

O kwukwara ka e wepụta ijeri naịra iri abụọ na abụọ (N22billion) iji kwụọ ndị rụburu na ngalaba ụgbọelu Nigerian Airways Limited ụgwọ ezumiike nka ruru ha.

Ụgwọ a Buhari kwuru ka a kwụọ ndị ọrụ ụgbọelu a na-abịa ka afọ 15 emechiri ngalaba ahụ gachara.

Cheta na n'afọ 2017, Hadi Sirika bụ mịnịsta na-ahụ maka njem ụgbọelu kwuputara na Onyeisiala Buhari kwere nkwa ịkwụ ụgwọ a.

Ijeri naịra 22 a Buhari kwuru ka a kwụọ bụ naanị pasentị 50 dị n'ime Ijeri naịra 45 gọọmentị kwenyeburu na a ga-akwụ n'ime Ijeri 78 ndị ọrụ ahụ gwaburu gọọmentị ka ha kwụọ.

Zainab Shamsuna Ahmed bụ mịnịsta na-ahụ maka akụnaụba Naịjirịa kwuputara ozi a n'akara Twitter ya.

Buhari na UNGA

N'akụkọ yiri ya, Onyeisiala Muhammadu Buhari na nwunye ya atụla ụkwụ n'obodo New York ebe ọ ga-ekwu okwu n'ọgbakọ United Nations General Assembly n'ụbọchị Septemba 25 nke 2018.

Na mba ofesi,

Ndị Rọshịa ekwuola na ha ga-ezigara ndị mba Sịrịa ngwaagha ga-ekpuchitere ha ụgbọelu ha.

Image copyright Getty Images

Nke a na-abịa ka ndị mba sịrịa gbaturu otu ụgbọelu mba Rọshịa n'amaghị ama n'izu gara aga oge ha na mba Izrel na-akwata ya.

N'egwuregwu,

Ihe ọma emeela n'ụwa egwuregwu bọọlụ ụmụnwaanyị ka achọrọ ibido inye ha ihe nturugo Ballon d'or maka nwaanyị kachasị agba bọolụ.

Image copyright Getty Images

A ga-enye nke mbụ na ngwụcha afọ 2018 a.

Gere akụkọ ndị a n'otu nkeji ebe a:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ịkọ mgbe ọbụla

Saraki etinyela ọnụ na mkpebi ntuliaka Osun

Image copyright Getty Images

Onyeisi ụlọomeiwu ukwu bụ Bukola Saraki dere na soshal midia na echiche ya bụ na INEC emeghi nke ọma maka mkpebi ha mere banyere ntuliaka ịhọpụta govanọ Ọshụn steeti e mere ụbọchị ole gara aga.

Mana ọtụtụ mmadụ katọrọ ihe o kwuru, makana ha sị na ọbụghị mbụ ụdịrị ihe a na-eme, ma kwukwa na usoro ya dị n'iwu Naịjirịa.

Ihe mere senate ji dọtịa ụbọchị mmepe ha

Ụlọọmeiwu ukwu agaghị emepe na Septemba 25 ka ha siri kwu na mbụ.

Ode akwụkwọ ụlọọrụ a bụ Mohammed Sani-Omolori, kwuru na ha mere mkpebi a maka ntuliaka imeụlọ na-eme ugbua n'otu ndọrọndọrọ ọchịchị abụọ kachasị n'ime ụlọomeiwu ugbua.

Achọpụtala ndị atọrọ n'oke osimiri Naịjirịa

Image copyright Getty Images

Ngalaba na-ahụ maka ndị ọrụ ụgbọmmiri na Naịjirịa ekwuola na ha amatala aha mmadụ iri na abụọ ahụ ndị omekome tọrọ na oke osimiri dị n'akụkụ Naịjirịa.

Ha kwuru na mmadụ asaa n'ime ha si mba Philippines ebe mmadụ ise ndị ọzọ si mba Slovenia, Ukraine, Romania, Croatia na Bosnia bịa.

Cheta na a toro ndị a ebe ha si Port Harcourt na-aga Legọs n'ụbọchị Satọde gara aga.

Toonu Tiger Woodsdike!

Image copyright Getty Images

N'egwuregwu, Ọ fọdụrụ obere ka Tiger Woods bee akwa n'ụbọchị 24 nke ọnwa Septemba, 2018.

O nwetara mmeri n'asọmpi 'Tour Championship' nke mere n'Atlanta USA. Nke a mere ya nke mbụ kemgbe o na-enweta mmeri ọbụla n'egwuregwu golf kemgbe afọ 2013.

Gee akụkọ anyị n'ụtụtụ a

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ịkọ mgbe ọbụla

Lee ihe nkiri anyị

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionIri ji: Ndi ike pụtara n'uju na mgba Igbuzo