Ụlọikpe ukwu sị na iwu akwadoghị mwepụ Madumere
Eze Madumere enwerela mmeri n'ụlọikpe

Ebe foto si, Channels TV
Eze Madumere bụ osote gọvanọ Imo Steeti
Akụkọ na-eru anyị ntị ugbua na-ekwu na ụlọikpe ukwu akagbuola nchụpụ ahụ a na-achọ ịchụpụ osote gọvanọ Imo steeti bụ Eze Madumere.
Ọkaikpe Benjamin Iheaka kwuru na ya bụ usoro achọrọ iji chụpụ Madumere adịghị n'akwụkwọ iwu ala Naịjirịa.

Ebe foto si, PDP Official Facebook page
Uche Secondus bụ onyeisioche ndị PDP kemgbe ọnwa Disemba 2017
Otu pati APC adọọla Uche Secondus nke PDP aka na ntị maka ajọ okwu ha sịrị na ọ gwara ha.
N'akwụkwọ nke onye osote odeakwụkwọ mgbasa ozi APC tinyere aka, ha sị na ọ bụ ịkpụ ugwu ya n'ala site n'ibo ebubo na APC na Inec gbara ha mgba okpuru na ntụlịaka e mere n'Osun steeti n'izuụka gara aga.

Ebe foto si, Getty Images
Donald Trump onyeisi óchíchí mba US
Na elenu o, ka ọgbakọ mbaụwa UN na-aga n'ihu ugbua ebe a na-atụ alo maka udo na nchekwa tọrọ atọ n'ụwa, Donald Trump nke Amerika emeela ka ngwere dara elu.
Donald Trump kpapụrụ ndị isi ibe ya ọchị ka ọ sị na gọọmentị ya arụọla ọrụ ndị ọzọ arụnwụghị n'afọ abụọ ọ chigoro.

Ebe foto si, Getty Images
Mourhino zuru Lampard na Chelsea
N'egwuruegwu, nna na nwa ga-akwakọta mpi mgbe otu Derby County ga-ezute `Manchester United n'elekere asatọ nke abalịa.
Cheta na Frank Lampard bụ onye nkuzi ndị Derby ugbua mụrụ ọrụ n'aka Jose Mourinho oge ha nọ na Chelsea.

Ebe foto si, Getty Images
Ngeria Air
Minista na ahụ maka njem ụgbọelu bụ Hadi Sirika ekwuola na asiri ndị mmadụ na-agba na ọ bụ enweghị ndị nkwado mere ya bụ ụlọọrụ ụgbọelụ jiri pịachie nkụ bụ ụgha.
Sirika sị ya bụ ụlọọrụ ụgbọelụ nwere ọtụtụ ndị ụkwụ siri ike n'ala bụ ndị nwere mmasị ịsonye na ụlọọrụ Air Nigeria.
Gee nkeji anyị
Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile
Luka Modric enweela mmeri

Ebe foto si, Getty Images
Luka Modric bụ onye FIFA turu ugo dika onye kachasị agba bọọlụ na ụmụnwoke n'afọ a.
Marta Vieira da Silver bụ onye turu ugo nke ndị ụmụnwaanyị.
Mohammed Salah bụ onye turu ugo dịka onye nyere goolu nke kachasị tụụ ụtọ.
Ndị ntọ atọhapụọla ndị njem so God is Good?

Ebe foto si, Getty Images
Ha tọrọ ndị a n'ime izuụka abụọ garaaga.
Mana ndị ntaakụkọ Premium Times dere na ụfọdụ ezinụlọ kwuru ego ntọhapụ tụpụ ha atọhapụ ndị be ha.
Ndị uweojii gwara BBC Igbo na ha ka na-eme nchọpụta maka ihe mere, ma kwụkwa na ọ bụ eziokwu na-onwere ndị a tọọrọ.
Gịnị na-eme n'Osogbo?

Egwu dịkwa n'ọfọdụ ebe n'Osogbo isi obodo Osun steeti o.
Onye ntaakụkọ BBC kwuru na ụda egbe dara na mpaghara Alekuwodo n'ime steeti ahụ ụnyaahụ.
Cheta na Alekuwodo bụ otu n'ime obodo a ga-eme ntụlịaka ọzọ ga-ahọpụta gọvanọ nke steeti ahụ.
Akụkọ kwuru na mgbọ meruru nwa nwaanyị dị afọ iri na abụọ na ụmụnwoke abụọ ahụ na ọgbaghara ahụ.
N'ofesi

Ebe foto si, Getty Images
Ndị so n'ime nkwekọrịta nụklịa nke mba Iran ekwuola na ha ga-achọpụta ụzọ ọhụrụ ha na mba Iran ga na-azụ ahịa agbanyeghị na Amerịka esepuola aka na ya bụ nkwekọrịta.
Mana ọtụtụ ndị amamihe gbasara okwu a na-ekwu na ọ ga-afịa ahụ makana ego Iran adaala kamgbe Amerịka sepuru aka na yabụ nkwekọrịta.
Gee nkeji anyị
Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile
Lee ihe nkiri nke ụtụtụ a
Idemmiri achụpụla ndị Ogbarụ, Anambra Steeti n'ụlọ ha.