Akụkọ kacha mkpa na Wenezde: Bill Cosby agaala mkpọrọ

Ụmụakwụkwọ ụmụnwanyị Chibok ekpeela ụlọikpe

Ụmụakwụkwọ ụmụnwanyị Chibok ndị ka nọ n'aka Boko Haram akpụpụla gọọmentị etiti nakwa ọkaikpe ukwu Naịjirịa n'ụlọikpe Abuja makana onweghi ihe a ha na-eme ịzọpụta ha n'aka Boko Haram.

Ọ bụ ọkaiwu ha bụ Funmi Falana gbara akwụkwọ a. Oby Ezekwesili sokwa na ndị denyere aha na yabụ ikpe.

Madumere alagachiela n'ọkwa osote gọvanọ

Gọọmenti Imo steeti agaala ụlọikpe mkpegharị maka mkpebi kpebiri na Madumere ka bụ osote gọvanọ Imo steeti.

Cheta na ụnyaahụ, ụlọikpe n'Owere kpebiri na ọnọdụ ha jiri chuda Madumere dịka osote gọvanọ abụghị ihe iwu Naịjirịa kwadoro.

Bill Cosby agaala mkpọrọ

N'ofesi, Otu ụlọikpe n'Amerika atụọla ọkpaọchị bụ Bill Cosby nga nwereike isi afọ atọ ruo afọ iri.

A tụrụ Cosby dị afọ iri asatọ na otu mkpọrọ makana ọ wakporo otu nwanyị bụ Andrea Constand n'afo 2004.

Jose Mourinho ọ dị kwa mma?

N'egwuregwu, O dị ka Jose Mourinho na ndị ọ na-achịkọta na-enwe nsogbu ugbua.

Echiche a pụtara maka ihe nkiri pụtara na social media ebe ya na Paul Pogba na-enwe esemokwu ebe ha na-eme nkwado ha.

Mana Mourinho agọọla nke a.

D'Tigress eruola agba nke anọ

D'Tigress abaala agba nke anọ n'asọmpi iko mba ụwa nke egwuregwu Basketball n'eme ugbua na Greece.

Gee nkeji nke abalị a

Aha nkeananụānụ,

BBC Nkeji

Lee ihe nkiri anyị

Aha onyonyo,

Iri ji: Ndi ike pụtara n'uju na mgba Igbuzo