Akụkọ dị mkpa: NLC agwala ndị ọrụ ha laghachị n'ọrụ
Akụkọ dị mkpa taa:
NLC akpọbiela abụbụ ọrụ
Ebe foto si, NLC Blog
Ndịọrụ chọrọ ụgwọọrụ opekatampe ọhụrụ
Akụkọ na-eru anyị ntị ugbua ekwuola na otu jikọtara ndị ọrụ Bekee niile a kpọrọ Nigerian Labour Congress akwụsịla abụbụ ọrụ nke ha kpọkọrọ n'izuụka gara aga.
Onyeisi NLC bụ Denja Yaqub kwuputara nke a n'ozi ha gụpụtaara ndị ntaakụkọ n'Abụja taa.
Gụọ maka abụbụ ọrụ ahụ ebe a: NLC: Ka abụbụ ọrụ sịrị kwụrụ n'alaigbo
PDP Enugwu ahọpụtala Ifeanyị Ugwuanyi
PDP Enugwu ahọpụtala Ugwuanyị maka ndọrọndọrọ ọchịchị 2019
PDP Enugwu steeti akwadola Ifeanyi Ugwuanyi dịka onye na-eburu ha ọkọrọtọ na ndọrọndọrọ gọvanọ steeti ahụ na 2019.
N'otu aka ahụ, APC Abịa steeti ekwekọrịtala ka Onyeisiala Muhammadu Buhari pụta maka ịzọ ọchịchị onyeisiala 2019.
Theresa May sị nauche ya dị na Brexit
May: Gọọmentị anyi kwesịrị ime otụtụ ihe
Aka na-achị mba Britain bụ Theresa May ekwusiela ike na obi siri ya ike na ya ga-ahazinwu nnwereonwe Britain a kpọrọ 'Brexit' na Bekee.
May kwuru nke a n'ịsa okwụ ndị sị na ọ maghị ihe ọ na-eme gbasara etu azụmahịa mba Britain na ndị EU ndị ọzọ ga-adị mgbe ha kewara.
Cristino Ronaldo nwere ike ịtụmmadụ mkpọrọ
Ebe foto si, Getty Images
Cristiano Ronaldo agwala ụmụ ụwa aṅalantị n'ebubo otu nwagbọghọ na-ebo na ọ kwasoro ya iko n'ike n'afọ 2009.
Ọkaiwu Ronaldo ekwukwaala na ha ga-akpụpụ akwụkwọ akụkọ ndị Jamani bụ Der Spiegel bụ ndị buru ya bụ akụkọ ụgha, ụlọikpe.
PDP eyigharịala ntuliaka imeụlọ ụfọdụ steetị.
Ebe foto si, Getty Images
N'akukọ yiri ibe ya, otu ndọrọndọrọ APC ekwuola na eyigharịala ụbọchị ha ga-eme ntuliaka nke ime ụlọ na PDP nke Imo, Lagos na Kano steeti mana ha ekwubeghị ụbọchị ha ga-eme yabụ ntuliaka.
USAID adoola aka na ntị maka ihe nwere ike imebi ntuliaka Naịjirịa na 2019
Ebe foto si, Getty Images
Otu sị mba ofesi na-elebanya na nkwadebe ntuliaka Naịjirịa nke afọ 2019 na-ekwusike na egwu na-atụ ha gbasara nkwadeba ntuliaka a.
Ha kwuru na ọtụtụ ihe dị iche dịka nsogbu ndị omekome, orire vootu nakwa ozi asị na social media nwere ike imebi ntuliaka a na 2019.
Akwa adaala n'Indonisia
Ebe foto si, EPA
N'ofesi, ala mara jijiji egbuola mmadụ karirị narị anọ n'asatọ n'ala Indonisia.
Ndị gbatagbata kwuru na ha ka na-achọ ndị dị ndụ n'ebe a ihe a mere.
Jose Mourinho ọ ga-achịkọta Man U n'ihu?
Ebe foto si, Getty Images
N'egwuregwu, Rio Ferdinand bụbụ onye ọgba bọọlụ otu Manchester United ekwuola na oge eruola ndị na-achị otu bọọlụ Manchester United lebe anya ma Jose Mourinho ga-abụ onye nchịkọta otu a ma ha na-aga n'ihu.
O kwuru nke a maka ọkpụ atọ asatara otu West Ham jiri meri ha ụnyahụ mana onweghị ihe Man U na-ekwu ugbua maka okwu a.
Gee nkeji nke ụtụtụ a
BBC Nkeji
Lee ihe nkiri nke taa:
Etu nwaanyi a si buru Igbo n'isi ga-atụ gị n'anya