Muna na-eto n'Amerịka mana ọ na-asụ Igbo karịa ụfọdụ ndị nọ n'ala Igbo

Muna na-eto n'Amerịka mana ọ na-asụ Igbo karịa ụfọdụ ndị nọ n'ala Igbo

Ebe ụfọdụ na-agbaga mba ofesi iji gbalarị ịsụ asụsụ Igbo, Obyno Daddy-Muna na nwunye ya bụ Sweet Diva Olivia na-akụziri nwa ha Igbo ebe ha bi n'Amerịka.

Nwa ya nwaanyị bụ Muna na-egosi mmasị dị egwu gbasara asụsụ na omenaala Igbo dịka nna ya si egosi ya.

Otu ihe ịtụ n'anya gbasara Muna bụ na agbanyeghi na a mụrụ ya n'ala Bekee, ọ naghị asụ Igbo dịka onye ofesi, ọ na-asụ ya dịka onye Igbo toro n'ala Igbo.

Obyno na Sweet Diva na-enwe ọṅụ ikuziri nwa ha Igbo maka na ọ na-eme ha niile a na-enwe ezi mmekọ dịka nna, nne na nwa.

O kwuru na ya na nwunye ya na-agba mbọ hụ na ndị ha na-akpọta ileta nwa ha n'Amerịka ga na-enyekwa aka kwadoo ya bụ asụsụ Igbo ha na-akụziri nwa ha.

Obyno ekwuola na onye ọbụla na-akụzighịrị nwa ya Igbo bụ ya ka ụta dịrị na ngwụcha.

Akụkọ ga-amasị gị: