Akụkọ dị mkpa n' ụbọchịụka: Oby Ezekwesili abaala ọsọ onyeisiala

Akụkọ dị mkpa taa

Oby Ezekwesili abaala ọsọ onyeisiala

Oby Ezekwesili

Ebe foto si, Getty Images

Akụkọ na-erụ anyị ntị bụ na Oby Ezekwesili otu onye na ndị isi otu 'Bring Back Our Girls'(BBOG)chọrọ iso zọọ ọkwa onyeisiala na 2019.

Ezekwesili nwetara ikike ịzọ n'aha pati Allied Congress Party of Nigeria(ACPN).

N'akwụkwọ ozi o wepụtara n'ụbọchị Satọde, o kwuru na ihe dunyere ya n'ịpụta bụ ịgbanwe ọnọdụ ahụhụ ụmụ Naijiria.

Ọ sịrị: "Obi ụfụ ịhụ ka ndụ ndị mmadụ na-agbada, obi mwute na anyị bụzị isiobodo ogbenye ọnụ ntụ na mbaụwa dịka mmadụ dị nde 87 bụ ndị dara ogbenye mgbeneke nakwa akwa arịrị na ụmụaka anọghị n'ụlakwụkwọ na-abawanye."

Atiku Abubakar emeriela

Atiku Abubakar

Ebe foto si, @atiku

Nkọwa foto,

Atiku Abubakar chiburu dịka osote onyeisiala Naịjirịa

Onye chịburu Naịjrịa n'ọkwa osote onyeisiala bụ Atiku Abubakar emeriela na ntụlịka otu PDP mere iji chọpụta onye ga-azọrọ ha ọkwa onyeisiala na Naịjirịa.

Atiku ji vootu 1,532 merie, ebe ndị so ya n'azụ bụ Aminu Tambuwal nakwa onyeisi ụlọomeiwu ukwu bụ Bukola Saraki nwetara 693 na 317 n'aka n'aka.

Aisha Buhari ọgbapụla egbe ọzọ?

Aisha Buhari

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto,

A mara Aisha Buhari, nwunye onyeisiala Muhammadu Buhari dịka onye na-ekwu uche ya enweghị egwu ọbụla

Nwunye onyeisiala Muhammadu Buhari bụ Aisha Buhari apụtala ịkatọ usoro esi azọ ọkwa ọchịchị na Naịjirịa

Iwe ya bụ na ụfọdụ mmadụ mefuru ego ịzọ ọkwa ọchịchị ebe ndị pati ma ụma tụnyere ndị nọ bu n'ọkwa.

Na mba ofesi,

Cabral Libii ebe ọ na-atụ votu

Dị ka mba Kamerun na-eme ntụlịaka onye ga-abụ onyeisiala ha, Cabral Libii na Maurice Kamto bụ ndị so azọ ya bụ ọkwa etipula mkpu nrụrụaka. Oby Ezekwesili abaala ọsọ oyeisiala

Ha kwuru na ntụlịaka ahụ anaghị a aga n'ụzọ kwụ ọtọ ma zie ezi.

Gee Nkeji nke mgbede a:

Aha nkeananụānụ,

Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

APC ahọpụtala Buhari

Ajumobi, Oshiomhole na Buhari

Ebe foto si, @BashirAhmaad

Nkọwa foto,

Oshiomhole na ndí isi pati APC kpọpụtara Buhari dịka onye ga-azọrọ APC

Otu APC akpọpụtala Muhammadu Buhari dịka onye ga-azọ ọkwa onyeisiala n'aha pati ha na ọgbakọ ukwu ha nwere n'Eagles Square, Abuja ụnyaahụ.

N'otu aka ahụ, PDP ebidola ịgụ vootu pụtara n'ime ntuliaka imeụlọ nke ha na-aga ugbua na Portharcourt.

Onye ha họpụta ịzọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa na Buhari ga-azọ mbe na abọ nke bụ oke na 2019.

Biko, gaa websait anyị bụ bbcigbo.com ka ị gụrụ akụkọ ihe niile na-eme ugbua na ntuliaka ahụ.

Brett Kavanaugh aburola otu ọkaikpe n'ụlọikpe ukwu n'ala Amerika

Brett Kavanaugh

Ebe foto si, Getty Images

N'ofesi, e duola Brett Kavanaugh iyi ọrụ dịka otu n'ime ndị ọkaikpe n'ụlọikpe ukwu nke mba Amerika.

Kavanaugh bụ onye onyeisiala Amerịka Donald Trump họpụtara mana otu nwanyị aha ya bụ Christine Ford na-ebo Kavanaugh ebubo mwakpo, mana Kavanaugh na-agọ ebubo a.

N'Egwuregwu, Manchester United meriri Newcastle ọkpụ atọ asatara abụọ

Mourinho

Ebe foto si, Getty Images

Jose Mourinho ga-enwe obele ezumike n'ihi na otu ya bụ Manchester United meriri Newcastle ọkpụ atọ asatara abụọ.

Kepukepu kwuburu na ManU ga-achụ Mourinho maka mmeri a na-emeri ha kemgbe.

Gee nkeji nke ụtụtụ a

Aha nkeananụānụ,

Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Lee ihe nkiri anyị

Aha onyonyo,

Etu nwaanyi a si buru Igbo n'isi ga-atụ gị n'anya