Atiku dịka ọchịchịrị n'ebe Buhari nọ- APC

APC asaala mmeri Atiku

Image copyright Getty Images

Otu ndọrọndọrọ ọchịchị All Progressives Congress ekwuola na Atiku Abubakar abụghị onye Naịjirịa kwesiri ịtụkwasị obi maka ebubo dị iche iche gbasara mmeruaka dị ya n'ishi.

Yekini Nabena bụ ọnụ na-ekwuchiri APC kwuru na Atiku bụ onye mba Amerika na-achọ maka mpu na aghụghọ nakwa ọ bụ onye na-efegharị otu ndọrọndọrọ ọchịchị dị iche iche makana ọ chọrọ ị bụrụ onyeisiala.

Nabena kwukwara na ị họpụtara onye ga-achị Naịjirịa na-etiti Buhari na Atika dịka ị họrọ na-etiti ihe na ọchịchịrị

Ndị ọrụ Anambra steeti etiila mkpu!

Image copyright Getty Images

Otu jikọtara ndị ọrụ Naịjirịa na Anambra steeti bụ Nigeria Labour Congress eboola gọọmentị steeti ahụ ebubo na ha anaghị akwụ ụgwọ ezumike nka dịka ha kwere nkwa.

NLC kwuru na ha na-ebe ego ezumike nka n'ụgwọ ọnwa ndị ọrụ steeti a kamgbe afọ 2014 mana o nweghị ụlọọrụ akụ ezumike nka nke Bekee kpọrọ Pension Fund Administrator na-anata yabụ ụgwọ.

Dino Melaye, Ben Bruce azaghị oku ndị uweojii

Image copyright @dinomelaye

Senatọ Ben Murray Bruce na Dino Melaye azabeghị oku ndị uweojii kpọrọ ha maka ngagharị iwe ha mere n'isi ụlọọrụ ndị uweojii n'ụbọchị ole na ole garaga n'Abuja maka ntuliaka ịhọpụta gọvanọ Osun steeti ebe APC meriri na yabụ ntuliaka.

Cheta na ndị uweojii zigara ha ozi ka ha bịa ụlọọrụ ha taa n'Abuja maka ịza ajụjụ gbasara ebubo na ha mebiri ọtụtụ ihe mgbe ha na-eme ngagharị iwe a.

Ethiopia emepela ụzọ ala ha

Image copyright Getty Images

N'Afrika, mba Ethiopia ekwuola na ha ga-akwụsị ịjụ ndị biara njem n'ala ha akwụkwọ ikike ịbata obodo site ugbua.

Ha kwuru na ha mere mkpebi a maka nkwekọrịta pụtara na ọgbakọ ndị African Union gba sara akwụkwọ ikike na ndị na-aga njem na Afrịka.

Lee ndị na-azọ ugo Ballon d'Or

Image copyright Getty Images

N'egwuregwu, Cristiano Ronaldo, Lionel Messi na Mohamed Salah esorola ndị ahọpụtara dịka ndị nwere ike ịturu ugo Ballon d'Or nke afọ a.

Gareth Bale, Kevin De Bruyne, Eden Hazard na ndị ọzọ so kwa.

Gee nkeji nke abalị a

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Lee ihe nkiri nke taa

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionIhe m ga-eme ma m nwee ohere ịchị Naịjirịa