"Guff na-akpọfe m n'ala ndị mmụọ"

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ise igbo ọ dị njọ?

Kemgbe mba Canada sonyere na ndị mba kpebiri na o nweghị mmehie dị n'ise igbo okwu ise ya amalitela ọzọ na mba ụwa.

Ọ bụ eziokwu na onweghị mmehie dị na ise igbo?

N'ime akwụkwọ ozi United Nations zipuru n'afọ gara aga, ha dere na mmadụ ruru nde 158.8 bụ ndị na-ese igbo na mba ụwa niile.

Na mba ụwa ọ bụ sọọsọ mba atọ tinyela ya n'iwu ala ha ka ndị mmadụ na-aṅụ ya ka ọ si masiri ha.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Igbo nwere ike ị butere mgbaka isi maọbụrụ na onye ahụ na-ese ya nke ukwu ọge ọbụla

BBC Igbo gbara ụfọdụ ndị Naịjịrịa na-ese ahịhịa echiche ha gbasara okwu a: ''o nwere njọ dị n'ise 'guff'?''

"Ọ bụ obi mgbawa nunyere m n'ise guff"

Celestine (ọ bụghị ezigbo aha ya) gwara BBC Igbo na ọnọdụ ọ hụrụ onwe ya mgbe o bidoro bụ ihe nunyere ya ise guff.

"Enweghị ọrụ bụ ihe dubara m n'ihe a.

"O nweghị ihe m na-arụ. Nke a butere ahụ mgbakasị mana oge m bidoro ise guff, ahụ akụda m"

O kwukwara na: "Ugbua enwetela m ọrụ, anagha m aṅụzi ya ka m sị aṅụ"

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ọtụtụ ụmụnwanyị na-esekwa guff

Onye ọzọ kpọrọ onwe ya 'Stone-Cold' gwara BBC Igbo na ise guff bụ ihe masiri ya makana o na-eme ya obi ọma.

N'ọnụ okwu ya, ''Anaghị m eri nri ọfụma naani ise igbo mana anaghị m atụ egwu na ọ ga-arịa m ahụ".

Onye ọzọ aha ya bụ Sylvester gwara BBC Igbo na igbo bụ ihe sị ala ndị mmọ malite n'ụwa.

O kwuru na: "Ihe a na-ahịa ahụ ịkọwa, mana ọ na-akpalite mmụọ m oge ọbụla m sere ya."

Ọ na-ata m ahụ

Mana ise igbo na-ebute kwa ụfọdụ nsogbu na-ahụ ha dịka ha siri kọwa.

Dọkịnta Anthony Mgbolu kọwara na ise igbo na- akọ ha ụra n'anya meekwa ka ndị na-aṅụ ya na-ahụ ihe na-adịghị.

Sylvester kwuru na oge ya enweghị ego, igbo na-ata ya ahụ n'ihi na igbo na-eme agụụ nri oge ọbụla.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ha kwuru na ọ na-akpọfụ ha gawa ala mmọ

Ọ gara n'ihu kwuo na "Mana abụ m onye nka, ise guff na-akpọfe m n'ala ndị mmọ makana ọ na-enye m ike ika nka nke ọma'

Celestine na nke ya kwuru na oge ọbụla ya esighi guff, ọ na-eme ka iri nri hịa ahụ.

Mana o na-arịọ ka a ghara iwepụ itinye ise igbo n'iwu ala Naijiria n'ihi na ọ ga-emebi obodo.

Celestine kwuru, "Ọtụtụ ụmụntorobia anyị ga na-esi ya dịka ndụ dị na ya. Ọ bụghị ihe a ka anyị chọrọ ugbua.

"Ihe anyi chọrọ bụ ndozi ala Naịjirịa, ya kachasị mkpa"

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị