Cameroon: Ndị ntọ atọọla ụmụakwụkwọ ọzọ ruru 20

Akụkọ dị mkpa

Ndị ụmụakwụkwọ Kamerun Image copyright Reuters

N'Afịrịka ndị ntọ atọọla ụmụ akwụkwọ iri abụọ n'ụlọakwụkwọ Lords Bilingual Dị n'obodo Kumba, nke dị na ọwụwa anyanwụ Kamerun.

BBC chọpụtara na a tọọrọ ụmụakwụkwọ a n'isi ụtụtụ taa bụ ụbọchị 20 n'ime ọnwa Nọvemba.

Ndị uweojii kwuru na ugbua ha na-eleba anya na yabụ mkpamkpa.

Onwebeghị ndị na-ekwu na ọ bụ ha mere ihe a.

Onweghị akara anyị zuru - APC

Akara ndị APC Image copyright @APCNigeria

Onyeisi mgbasa ozi maka achụmnta vootu nke onyeisiala Muhammadu Buhari, bụ Festus Keyamo ekwuola na ebubo na ha zuru akara "NextLevel" ezu bụ ụgha.

Cheta na ihe na-akpọtụ na soshal midia bụ ebubo a na-ebo na APC kọpịrị akara njirimara ụlọakwụkwọ mahadum dị n'Amerịka wee mee akara ozi ịchụnta vootu ha.

Ihe mere m jiri gụ Chizoba - Paul Okoye

Paul Okoye Image copyright @rudeboypsquare

Paul Okoye gwara BBC Igbo na ọ gụrụ egwu ọhụrụ ya bụ Chizoba makana ọ chọrọ ịkpalite mmọ ndị na-kwado ya.

Okoye kwuru na o tiri egwu a kamgbe otu afọ gara aga, ma kwukwa na ya bụ otiegwu nke mere na ọ ga na-agụ ihe ọbụla metụta ya n'obi.

Biko gaa nụ na websait anyị bbcigbo.com ka ịnụta ihe niile Paul gwara anyị.

Ogbunigwu egbuola mmadụ 43 na Kabul

Ndị ogbunigwe meruru ahụ Image copyright EPA

N'ofesi, otu onye yi ogbunigwu n'ahụ egbuola onwe ya na mmadụ iri anọ na atọ ndị ọzọ n'obodo kabul na mba Afghanistan.

Ndị gbatagbata kwuru na ugbua, onweghị ndị na-ekwu na ọ bụ ha mere ihe a.

Cahill agaala ezumike nka

Cahil Image copyright Getty Images

Tim Cahill bụ ọgba bọọlụ mba Australia agaala ezumike nka.

Cahil dị afọ iri atọ na asatọ, gbara asọmpị ya nke ikpeazu n'ime asọmpị Ọstralia na Lebanon gbara.

Ọstralia ji ọkpụ ato merie Lebanon.

Gee nkeji n'otu nkeji

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe nkiri

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionOkwu Uche Nwosu

Ịkwe n'aka ofesi Naịja, Legọs

Handshake across the Niger Image copyright Getty Images/Ohaneze/Soyinka
Nkenke aha onyonyo Adebanjo, Soyinka na Nwodo

Ndị Naijiria nwere agba gụnyere; Wole Soyinka, Ike Nwachukwu, Nnia Nwodo nakwa onye okenya otu Afenifere bụ Ayo Adebanjo ekwola na o nweghị ihe ga-egbochi ihazigharị obodo Naịjirịa na mpagghara, na mpaghara.

Ha kwuru nke a na nzuko ụmụnna Aka ikenga kpokobara na Legos ụnyahụ nke a kpọrọ 'Handshake across the Niger.

PMB Ekelela ndị ụka Alakụba na Eid-El-Maulud

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Onyeisiala Naịjirịa si na gọọmenti ya

Onyeisiala Muhammadu Buhari ebunyela ụmụ Naijirịa ndị na-ekpe ụka Alakụba ụkpa ekele maka emume nke Eid-El-Maulud bụ ụbọchị ncheta Prọfet Muhammed.

Image copyright @officialEFCC

Ọkụ agbala ụlọọrụ EFCC dị na Wuse 2, Abuja n'abalị ụnyahụ ka ọ kụchara Elekere Asaa dịka onye ọrụ ndị ụlọọrụ a bụ Kayode Oyetunde sị kwụọ.

Nrụrụ aka Richard Akindele

Image copyright OAU/Fb
Nkenke aha onyonyo Richard Akindele bụbu onye nkuzi na mahadum Obafemi Awolowo, Ile ife

Ụlọikpe ukwu dị n'Osogbo atụbala ọkammụta Richard Akindele na mkpọrọ maka ikpe ịchọ ịdịna nwaakwụkwọ aha ya bụ Monica Osagie ka o were bufee ya n'ule akwụkwọ.

Supa Lig

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Aleksander Ceferin bụ onyeisi Uefa

N'egwuregwu, onyeisi ndị Uefa bụ Aleksander Ceferin na ogbo ya bụ Andrea Angnelli agọọla aka na ụkwụ na o nweghị mgbe ha ji cheta echiche iwepụta lig ọzọ a kpọrọ supa lig.

Lee ihe nkiri anyị ebe

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionChike Ukaegbu: O nweghi ihe jịkọrọ ndị kara nka na ọdịnihu anyị

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a