Rochas Okorocha: 'A kwụsịrị m onye nchịkọta ego Imo steeti ọrụ obere oge'

#ụbọchị ncheta emume HIV/AIDS

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo HIV/AIDS egbuola ụtụtụ mmadụ n'ụwa

Dịka tata bụ ụbọchị ntecheta maka emume HIV na AIDS, ndị ọrụ ahụike adọọla aka na ntị na sị onye aṅụla nga ma oyibo anaghị.

Dọkịnta Anthony Mgbolu bụ onye ya na BBc nwere mkparita ụka kwuru an ọnụọgụ ndị na-ebuete ya bụ nje na ụwa ụgbụa na-arị elu.

Buharị amapụla njem na Poland

Image copyright @bashirahmad
Nkenke aha onyonyo Muhammadu Buhari gara njem ọrụ na Lọndọn

Ọzị ọzọ na-erụ anyị ntị ugbua na-ekwụ na ọnyeisiala Muhammadu Buharị amapụla nje na mba Polandi bụ ebe ọjire nzụkọ mbaụwa bụ ebe anakpa maka ọdịmma mbara eligwe an ala nke bekee kpọrọ climate change. Buharị pụrụ nje a tata bụ Satọde.

Sam Gyimah agbaala arụkwaghị maka Brexit

Image copyright Uk Parliament
Nkenke aha onyonyo Sam Gyimah bú onye nke iri gbagoro arúkwaghí na gómenti Theresa May maka Brexit

N'ofesi, Onye ọzọ agbala arụkwaghị maka ihe ha hụrụ dịka amaghị eme mba Briten n'okwu gbasara Brexit.

Sam Gyimah bụ minista na-ahụ maka ụzụ na mahadum bụ sị na ihe ya hụrụ na mkpakọrịta ụka Breten an Uk gosiri an ya bụ ụdọ adịghị ọkụkọ mma na ọnụ.

Super Falcons 4 - 3 Bayana Bayana

Image copyright NFF
Nkenke aha onyonyo Super Falcons ebutala iko AWCON ugboro itoolu ugbua

N'egwuruegwu, Super Falcons ji ọkpụ goolu anọ asatara atọ were merie Bayana Bayana na Accra Ghana tata, Man City ewerela ọkpụ atọ asatara otu nyụọ ndị Bournemouth anya. Egwuruegwua abụọ a ka na aga n'ihu dịka akụkọ a na-aga.

Gee nkeji anyị nke mgbede a

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Rochas esepụla Stella Udogu ọnụ n'ara

Gọvanọ Rochas Okorocha ekwetela ka akwụsị ọrụ onye nchịkọta ego Imo steeti bụ Stella Udogu maka akwụghị ụgwọ ọnwa ndị ọrụ ka ọnwa abụọ gafechara dịka ya bụ gọvanọ sị nye iwu ka o mee.

O kwuru nke a mgbe a na-eme emume ncheta nke iri anọ ndị ọrụ ụlọ ọrụ okpuru ọchịchị Imo steeti n'Owerri.

Okorocha kwukwara ka chụọ ndị isi ụlọakụ ebe akwụnyere ego ụgwọ ọnwa ndị ọrụ okpuru ọchịchị Imo steeti ma weghachite ego mara n'elu ya.

Ọnụ na-ekwuchitere Okorocha bụ Sam Onwuemeodo wepụtara akwụkwọ ozi ebe Okorocha kuru ihe a .

Mana Onwuemeodo gwara BBC Igbo na ya bụ iwu Okorocha tiri adịgo ire ebe a na-eche ka ụlọakụ meghe ka ewe nwuchie ndị isi ha ahụ.

Okorocha kwukwara ka chụọ ndị isi ụlọakụ ebe akwụnyere ego ụgwọ ọnwa ndị a ma weghachite ego mara n'elu ya.

O kwukwara na udiri agwa na-ete ọchịchị ya ule maka ndị nchịkọta ego na-edowe ego ụgwọ ọnwa ndị ọrụ ka o wee wetere ha ọmụrụ nwa.

Inec akatọọla ntuliaka imeụlọ

Nkenke aha onyonyo E mere ọkammụta Mahmood Yakubu onyeisi Inec n'ọnwa ọktoba afọ 2015

Onyeisioche ụlọọrụ Inec bụ Mahmood Yakubu, ekwuola na ntuliaka nke imeụlọ ọtụtụ otu ndọrọndọrọ ọchịchị dị iche iche mere n'afọ 2018 iji wee zọọ oche ọchịchị dị iche iche bụ nke kachasị

nwee ntụpọ n'oge na-adịchaghị anya Naịjirịa mewere ya bụ ntuliaka.

O kwuru na etu ọ dị ugbua, na ụlọ ọrụ ha esonyela n'ikpe ruru narị atọ na iri isii na isii kamgbe emechara ntuliaka a.

Agba nke ikpeazụ AWCON 2018

Image copyright Twitter/NFF
Nkenke aha onyonyo Super Falcons ebutala iko AWCON ugboro itoolu ugbua

N'egwuregwu , Super falcons na otu egwuregwu bọọlụ ụmụnwaanyị South Africa ga-achịpụ ya taa n'elekere ise nke mgbede.

Cheta na ha ga-agba agba nke ikpeazụ iji wee wepụta onye ga-ebuli iko mba Africa n'asọmpị ụmụnwaanyị nke afọ 2018.

Ọnwụ George H W Bush

Image copyright Reuters
Nkenke aha onyonyo George H W Bush chịrị Amerịka afọ anọ(1989-1993)

Aka chiburu mba Amerịka bụ George H W Bush nke nnukwu anwụọla n'afọ iri itoolu na anọ .

Ọ bụ nwa ya nwoke George W Bush kwuputere nke a .

Bush nnukwu chịrị mba Amerịka afọ 4 (1989-1993).

Nkeji ututu

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe nkiri

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media caption#WorldAIDSDay: 'Arịala m ọrịa hiv/aids ruo afọ 4 ka kwụrụ chim'