Boko Haram ji 'drone' enyo anyị - Ndị agha Naịjirịa

Drone Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ndị agha ji ụfọdụ ụgbọelu drone enyocha ebe ndị ha na-ebuso agha nọ

Nke a bụ akụkọ na-emeghee ọnụ.

Ndị agha Naịjirịa ekwuola na ndị agha Boko Haram ji ngwa agha akpọrọ drone na teknụzụ dị iche iche abata agha ugbua.

Ha kọwara na ihe a bụ ihe mere ọtụtụ ndị agha Naịjirịa na-anwụ n'aka ndị Boko Haram ugbua.

Ha kwukwara na ndị Boko Haram nwere ọtụtụ ndị agha sị mba ofesi soro ha n'ilụ agha.

Ndị agha ole nwụrụ n'ezie?

Ndị agha kwuru n'ime nwakpo a niile mere, ndị Boko Haram gburu ndị agha Naịjirịa ruru 23 nakwa ndị agha ọzọ ruru 31 bụ ndị meruru ahụ.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Onye nyere ndị Boko Haram drone?

Ha kọwara na ugbua ha na ndị ala Chad na-agba mbọ ịhụ na Boko Haram enweghị ohere ị nwakpo ha udi nwakpo ahụ ọzọ.

N'ime akwụkwọ ozi ha zipuru ndị ntaakụkọ, a kọwara site ụbọchị 2 ruo 17 nke ọnwa Nọvemba, ndị Boko Haram nwakporo ndị agha Naịjirịa n'obodo Kukawa, Ngoshe, Kareto na Gajiram na Borno steeti.

Mana okwu ndị mmadụ kpụ n'ọnụ ugbua bụ nwakpo awakporo ha n'obodo Metele n'ime Borno steeti.

Nwakpo Metele wuru ewu makana ihe nkiri gosiri etu ndị Boko Haram si gbuo ndị agha Naịjirịa pụtara n'elu soshal midia.

Ihe nkiri a gbawara ọtụtụ mmadụ obi.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a