World Environment Day: Ikuku ọjọọ ndị a nwere ike ibute ọnwụ

Anwụrụọkụ kojuru n'okporoụzọ Image copyright Getty Images

Otu United Nation wepụtara ụbọchị taa dịka ụbọchị nchekwa gburugburu ebe obibi nke a kpọrọ "Beat Air Pollution"

N'akwụkwọ ha wepụtara, ha kwuru na ndị mmadụ ruru nde asaa na-anwụ site n'ikuku ọjọọ kwa afọ.

Ụfọdụ ikuku ọjọọ ndị a na-esi n'igwe ọkụ, igwe eji esi nri, ebe a na-ekpofu ahịhịa nakwa ebe mposi dgz.

Agbanyeghị na ọtụtụ mmadụ anwụọla makana ha kubara anwụrụ sị n'igwe na-enye ọkụ, ọtụtụ mmadụ ka na-amụ igwe a n'ime ụlọ ha.

N'ime ọnwa Ọgọstụ nke afọ a, otu ezinaụlọ gụnyere di, nwunye na ụmụatọ nwụrụ na Port Harcourt makana a mụnyere igwe na-enye ọkụ n'ụlọ ha.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ọtụtụ mmadu na-eji igwe ọkụ arụ ọrụ

Ọzọ mere n'Oshogbo Osun steeti Nọvemba 29, ebe mmadụ atọ n'ime otu ezinaụlọ nwụrụ maka anwụrụ a.

N'afọ 2014 ndị "Good Governance Initiative" dere na mmadụ ruru puku 100,000 anwụọla n'aka anwụrụ a.

Mana ọbụghị sọọsọ anwụrụ sị n'igwe na-enye ọkụ nwere ike imerụ gị nnukwu ahụ n'ime ụlọ gị.

Anthony Mgbolu bụ dọkinta gbatagbata n'ụlọọgwụ gọọmentị dị n'Abuja kọwara ikuku ọjọọ ndị ọzọ nwere ike igbu mmadụ

Anwụrụ sị ọgwụ anwụnta (Insecticide)

Image copyright Getty Images

N'ọnwa Epurelu nke afọ a, ụmụaka atọ nwụrụ na Gana makana nne ha fere ọgwụ anwụnta ebe a na-ehi ura.

Dọkinta Anthony kọwara na ọgwụ anwụnta nwere kemikal dị iche iche mana nke akpọrọ "Organophosphate" na Bekee bụ nke kachasị njọ. Mgbolu kọwara na anwụrụ a akpọrọ "Organophosphate" jọrọ ezigbo njọ eji ya alụ agha kemikal.

"Otụtụ ọgwụ anwụnta a na-ere n'ahịa ekwesighị ibata n'imeụlọ makana ọ bụ ihe a na-eji egbu anwụnta na anụ ndị ọzọ n'ugbo"

Anwụrụ igwe na-enye ọkụ

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ọtụtụ mmadụ anwụọla maka ihe a

Mgbolu kọwara na Igwe na-enye ọkụ na-amịpụta anwụrụ akpọrọ 'Carbon Monoxide".

"Ọ bụ anwụrụ a na-egbu ndị mmadụ makana ọ na-ekupu "Oxygen" niile dị n'ebe ahụ.

"Ọ bụrụ na ụbụrụ mmadụ enweteghị 'Oxygen', ọnwụ na-abia n'ike n'ike", Mgbolu kọwara.

Anwụrụ eji esi nri (Cooking gas)

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Anwụrụ na-agba nnukwu ọkụ

Nke a sokwa na ihe nwere ike ịgbu mmadụ.

Ọbụghị makana o naghị arịa ahụ ịgba ọkụ mana makana o nwere ike ikusa ikuku oxygen''.

Mgbolu kọwara na nwere ike ịnwụ na-erughị nkeji iri maọbụrụ na ụbụrụ enweteghị 'oxygen'.

Mmanụ eji ete ụlọ (Paint)

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ọtụtụ ndị mmadụ amaghị na mmanụ nwere ike igbu mmadụ

Nke a bụ nnukwu nsogbu maọbụrụ na-etere mmanụ a ọhụrụ n'ụlọ.

Mgbolu kwuru na onye tere mmanụ ọhụrụ n'ụlọ ekwesighị ibanye yabụ ụlo ruo mgbe isi ahụ ga-apụ.

"Mmanụ a bu ọtụtu kemical na-ekusa oxygen bụrụkwa ihe ndị na-ebute ọnwụ maọbụrụ na ọdịghị n'ime ahụ."

Mmanụ eyere-eye (Bleached oil)

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Mmanụ nrị

Nke a nwere ike ibute nnukwu nsogbu n'ahụ maọbụrụ na ikubara anwụrụ ya n'ime ahụ ruo ogologo oge.

Ndị mwere ọrịa Asthma ka nke a kachasị egbu.

Dọkịnta Mgbolu kọwara na dịka anwụrụ ndị ọzọ dị n'isi akụkọ a, anwụrụ a na-achụpụ "Oxygen" nke na-ebute ọnwụ ngwa ngwa.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị