Lagos: Fayose nwere ihe mberede okporoụzọ na 3rd Mainland Bridge

Akụkọ dị mkpa

Fayose nwere ihe mberede okporoụzọ

Ayo Fayose Image copyright @GovAyofayose
Nkenke aha onyonyo E meriri onye osote Gọvanọ Fayose bụ Kolapo Olusola-Eleka na ntuliaka gọvanọ e mere n'Ekiti na nso nso a.

Akụkọ na-eru Igbo ntị ugbua na-ekwu na Gọvanọ ochie ndị Ekiti steeti bụ Ayodele Fayose nwere ihe mberede okporoụzọ na akwammiri nke atọ dị na Legos n'ihihie Wenezde.

Odeakwụkwọ mgbasa ozi ya bụ Lere Olayinka depere nke a n'akara Twitter ya.

Image copyright NASS
Nkenke aha onyonyo Gabriel Onyewife na-anọchite anya Oyi/Ayamelum dị n'Anambra Steeti n'ụlọomeiwu nke nta

Onye na-anọchite mpaghara Oyi/Ayamelum dị n'Anambra Steeti n'ụlọomeiwu nta bụ Gabriel Onyewinfe agbarala APGA ụgbọ nwamkpi, ma banye PDP.

Onyeisi ụlọomeiwu bụ Yakubu Dogara gbara ama nke a oge ọ gụpụtara akwụkwọ ozi nke Onyewinfe detara n' ụbọchị Wenezde.

Nwaanyị nwr n'aka di ya

Image copyright Family Photo
Nkenke aha onyonyo Jessica Patel bụ onye na-akụ ọkwụ bekee

N'ofesi, otu nwoke ahịgbuola nwunye ya maka na ọ chọrọ ka ya na nwoke ibe ya biriwazịa ka di na nwunye.

Mitesh Patel gbara afọ iri atọ n'asaa (37) ga-aga nga afọ iri atọ maka igbu nwunye ya bụ Jessica dịka ọkaikpe Justice Goss si kpebie.

N'egwuruegwu,

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo James Tarkowski gbara bọọlụ ikpeazụ ya na ụbọchị atọ nke Nọvemba 2018

N'egwuruegwu, Burnley na Liverpool ga-ezute n'Elekere asaa an mmede a ebe Everton na Newcastle ga-akwatakwa otu mgbe ahụ na Goodison Park.

N'aka ọzọ, Man. U na Arsenal ga-akwakọrịta mpi n'Elekere asatọ an Old Trafford.

Gee nkeji mmgbede ebe a

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Buhari na ụmụaka Chibok

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Buhari kwuru na ọ bụrụ na ụmụaka Chibok alọtaghị, na ya aghaghị ezuike

Onyeisiala Muhammadu Buhari na ibe ya nke Swiss bụ Alain Berset, ezutela na Katowice dị na Poland ebe ha kpara maka ụzọ ọhụrụ ha ga-esi wee gbapụta ụmụakwụkwọ Chibok ka fọrọ n'aka ndị ntọ ha.

Ha zukọrọ ka e mechara ọgbakọ UN gbasara ihu eligwe nke a kpọrọ "COP24".

Elrufai akatọọla Atiku

Image copyright Nasir el-Rufai/Facebook
Nkenke aha onyonyo El-Rufai kwuru na PDP bitere ndị Niger ka ha bịa nọnyere ha n'achụmnta vootu

Aka na-achị steeti Kaduna bụ Nasir el-Rufai, ekwuola na pati PDP gara bite igwe mmadụ n'obodo Niger ka ha bịara achụmnta vootu ha mere n'ụbọchị atọ nke Disemba, 2018.

Mana ọnụ na-ekwuchitere PDP bụ Kola Ologbondiyan, kwuru na Elrufai ekwuputela etu pati APC si akwado ịtụbụta ndị mba ofesi na ntuliaka 2019.

N'egwuregwu,

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo ManCity ejirila poinyi ise gafee ndị nọ ha n'okpuru

Onyeisi otu egwuregwu bọọlụ Manchester City bụ Pep Guardiola ekwuola na etu otu ya si merie n'ikpeazụ dịka otu Watford nyechara otu ọkpụ goolu ebe ha agbatabeghi nke ọbụla, mgbe ha ka na-asọmpi ụnyaahụ (Disemba 4, 2018) gosiri na ị kwesighị izu ike n'asọmpi Premier League.

Mmeri a buliri Mancity n'elu tebulu Premier League dịka ha chịtarala pọịntị ise .

N'ofesi,

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo N'ime mmadụ iri ndị anatara akpa nwa onye nwụrụ anwụ wee tinye n'ahụ ha, nke a bụ nke mbụ nwerela isi

Otu nwaanyị amụọla akataka nwa nwaanyị ọhụrụ ka e werechara akpa nwa si n'ahụ nwaanyị ọzọ nwụgoronu tinye na nke ya.

Ihe a mere na São Paolo dị na mba Brazil. Akụkọ kwuru na nwaanyị a dị afọ iri atọ na abụọ enweghị akpa nwa kamgbe amụrụ ya.

Nkeji ututu

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe Nkiri

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionBurundi: Ụlọ ana-egbu mmadụ ka ọkụkọ