FRSC ehiwela ụlọikpe mbugharị n'okporoụzọ

Akụkọ dị mkpa

Ulọọrụ 'Road Safety' ehiwela ụlọikpe mbugharị

Ụlọọrụ Road Safety Image copyright FRSC/Facebook

Ụlọọrụ na-ahụ maka Ejealọ njem ụgbọala bụ Road Safety ekwuola na ụlọikpe mbugharị dị narị abụọ na otu nke ha hiwere maka ndị nnupuisi n'iwu na-achị okporoụzọ ga-amalite ọrụ na Monde.

Onyeisi ha bụ Boboye Oyeyemi kwuru na onye ọbụla nupuruisi n'iwe ndị a ga-agba ekeresimesi nke ya n'ụlọ mkpọrọ.

Mkparịtaụka ndị ndu Chad Basin

Ndị ndu mpaghara Chad Basin Image copyright @BashirAhmaad
Nkenke aha onyonyo Ndị bịara ọgbakọ nke taa gụnyere Onyeisiala mba Chad bụ Idris Deby Itno, Onyeisiala Nijee bụ Mahamadou Issoufuo na Praịm Minista mba Kamerun bụ Philemon Yang.

Agha Boko Haram ga-agwụ site n'amara Chineke, Nke a bụ okwu onyeisiala Buhari gwara ndị ogbo ya si mba ndị ọzọ mejupụtara Chad Basin n'ọgbakọ ha nwere n'Abuja.

Ọgbakọ ha a bụ maka ịkpa nkata ụzọ ọhụrụ eji ebuso Boko Haram agha karịsịa n'oke ogbugbu ndị agha mba ndị a.

N'ofesi

Ndị yi uwe odo odo eme ngagharịiwe na mba Fransị Image copyright AFP

Ndị yi uwe odo odo eme ngagharịiwe na mba Fransị e nupula isi na mmachị gọọmentị ma gaa n'ihu na ngagharịiwe nke werela izuụka ise.

Nke a malitere n'ihi ntinye ego n'ụtụisi mmanụ ụgbọala mana ọ baala n'okwu ndị ọzọ nke gụnyere inwogharị agụmaakwụkwọ.

N'egwuregwu

Asọmpi Manchester City na Everton Image copyright Google

Nkeji

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ịkọ mgbe ọbụla

Ihe nkiri

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionBBC African Footballer of the Year 2018: Mohammed Salah atụrụla ugo

Ndị Uweojii adọọla ndị omekaome aka na ntị

Ndị uweojii Naịjirịa Image copyright NP/Twitter

Ndị ụweojii n'Anambra steeti akala ndị na anata oriri ekeresimesi obi, sị ha natawa na egwu adịghị.

Haruna Mohammed bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ sị na ndị otu ha na ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ ga-anọ ebe niile ma dọkwaa ndị na-agba egbe aṅụrị Bekee kpọrọ "Knockout" aka na ntị ha sepụ ya bụ aka enwe n'ofe n'izu a.

Ndị agha Naịjirịa eweliela mmachi UNICEF

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ndị agha Naịjirịa na-ebuso Boko Haram agha, mana ndị Boko Haram Kpọrọ ekwo nkụ

Ndị agha Naịjirịa eweliela mmachị ha machiri otu UN na-ahụ maka ọdịmma ụmụaka akpọrọ Unicef.

Cheta n'ụbọchị Fraịde na ndị agha Naịjirịa boro Unicef ebubo na ha na-agbara ndị omeketereihepụụjọ Boko Haram ama.

Image copyright Reuters
Nkenke aha onyonyo Ọ teela ndị Izrel mewere ka ụwa kwete na isiobodo ha bụ Jerusalem

N'ofesi, mba Australia esorola na mba nab atara West Jerusalem dịka isiobodo mba Israel.

Praịm Minista mba Australia bụ Scott Morrison sịkwa na ha nabatakwara ndị palistain ịkwụrụ onwe ha dịka mba nke ha, ma were East Jerusalem mere isiobodo ha.

Mo Salaheturula ugo ọkaibe nke Afrika

Nkenke aha onyonyo Mo Salah BBC African Footballer nke 2018

N'egwuruegwu, Mohammed Salah nke Ejipt eturula ụgọ ọkaibe nke BBC African Footballer nke afọ 2018.

Salah dị afọ iri abụọ na isii (26) bụ onye kacha nye goolu n'asọmpi "Premier League" ma bụrụkwa onye nyere goolu niile Egypt nyere na iko mbaụwa.

Gee Nkeji ụtụtụ

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ịkọ mgbe ọbụla

Akụkọ ga-amasị gị

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a