Brexit Deal: Theresa May agbalahụla nchụda dịka onyeisiala

Akụkọ dị mkpa:

Brexit Deal: Theresa May agbalahụla nchụda dịka onyeisiala

Ndọrọndọrọ ma Theresa May ọ ga-aga n'ihu ịrụ dịka onyeisiala mba Briten bere n'abalị Wenezde dịka ndị omeiwu mmadụ 325 tụnyere ya ka ọ nọrọ ,ebe mmadụ 306 kwuru ka o rituo.

Ndọrọndọọ ahụ bidoro ụbọchị Tuzde oge ọtụtụ ndị omeiwu mba tụrụ vootu megide Briten ịpụ na European Union.

Ndị ụlọomeiwu mba Briten ajula ibinye aka ka ha pụọ n'otu EU

Image copyright Getty Images

Ndị ụlomeiwu mba Briten mmadụ 202 kwenyere ka ha pụọ , ebe mmadụ 432 jụrụ.

Onye ndu otu Labour pati n'ụlọomewu bụ Jeremy Corbyn welitere okwu 'enweghị ntụkwasaobi' na Theresa May, nke nwere ike kpalite okwu ntuliaka na oge na adịghị anya.

Corby ibinye aka na vootu 'eenweghị ntụkwasaobi' ga-enye ụlọomeiwu ohere inwe mkpebi maka 'amaghị ọrụ' nke ọchịchị May.

Theresa May kwuru na na ya ga-ewepụta ohere maka ndọrịtaụka n'okwu a akpụ n'ọnụ.

Mohammed Adamu ebidola ọrụ dịka onyeisi ndị uweojii Naijiria

Image copyright Nigerian Police

Mohammed Adamu amalitela ọrụ dịka onyeisi ndị uweojii Naijiria dịka onyeisiala Naijiria tunyechara(decorated) ya ugo pụrụ iche.

Ibrahim Idris onye bụbu onyeisi ndị uweojii Naijiria lara ezumike taa bụ Tuzde, abali iri na ise nke ọnwa Jenuwarị afọ 2019 ka ọ nọzuru oge ya n'ọrụ oyibo dịka iwu Naịjirịa si kwuo.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Naijiria bụ Jimoh Moshood kwuru na onyeisiala bụ Muhammadu Buhari enyela iwu ka Mohammed Adamu bu osote onyeisi nji uweojii bido na-arụ dịka onyeisi ha.

Idris kelere onyeisiala nakwa ụmụ Naijiria maka nkwado ha.

Image copyright NPF Twitter
Nkenke aha onyonyo Ibrahim Idris onyeisi ndị Uweojii

Onye bụ Mohammed Adamụ?

Mohammed Adamu bụ onye Lafia dị na Nasarawa steeti banyere ọrụ uweojii dịka 'Cadet" n'afọ 1986 ebe o siri were gbalite n'ọkwa oosote onyeisi ndị uweojii.

Ọ gara onye garala ọtụtụ ọzụzụ ndị uwe ojii na Najiria na mba ofesi rụụ ọrụ dịka onyeisi ndị uweojii nke Ekiti nakwa Enugwu steeti.

A wakpola otu ụlọ oriri na nkwari na Nairobi

A wakpola otu ụlọ oriri na nkwari n'isi obodo Kenya bụ Nairobi.

Ihe ruru ogbunigwe abụọ gbara n'ebe ahụ ebe a nụkwara ụda egbe n'ebe ahụ dị n'akụkụ Westland ebe e nwere ụlọọrụ ndị mmaọ̄ụ nakwa ụlọ oriri na nkwari.

Ndi hụrụ ka ihe a mere kwuru na ha hụrụ mmadụ anọ bu ngwaagha ebe ha na-aba ụlọ ahụ ebe ha gbara ọtụtụ ụgbọala ọkụ.

A na-akpọpụta nd mmaọ̄ụ n'ime ụlọ ahụ dịka ndị uweojii gbochiri ebe ahụ ma na-agba mbọ ịgbapụta ndị tọrọ n'ime ụlọ ahụ.

A mabeghi ndị mere ihe a.

A gbara ụgbọala PDP iii ọkụ n'Enugwu

Image copyright Louis Amoke

Ụgbọala isii nke ndị otu pati PDP gụnyere Sienna bus atọ na Coaster bus atọ nke ebiri ọkọlọtọ ndị PDP ma dọta ya n'otu ụlọ dị n'Osadebe streetị Ogui New Layout, na ncherita ihu WTC Enugwu.

Dịka onye n'ekwuchitere ndị uwe ojii ọnụ ha n'Enugwu bụ Ebere Amarizu siri kwuo onweghị onye mara ka ya bụ ọkụ siri malite ma gbapịa ụgbọala ndị ahụ.Amarizu kwuru na ọ bụ enyemaka ngwangwa ndị uwe ojii nakwa ndị ọrụ mgbanyụ ọkụ bụ Fire Service mere na ya bụ nnukwu ọkụ abaghị n'ụlọ gbara ogige ahụ gburu gburu.

Image copyright Loius Amoke

O sikwa na otu aka ahụ rịọ ndị mmadụ ka ha mara na ugbua bụ oge ọkụ ọgbụgba ji akpa ike, n'ihi ya onye ọbụla kwesiri igbochi ụzọ ọbụla ọkụ nwere ike iji ghọrọ ụlọ ma ọ bụ ngwongwo.

Ekweremadu sị na ya na akwadosi PDP ike

Image copyright Ike Ekweremadu
Nkenke aha onyonyo Ekweremadu, nwụnye ya na nwa ya nọ n'ụlo ya mgbe ndị a ji egbe bata

Ana m akwado mmeri PDP na ntuliaka 2019.

Ike Ekweremadu bụ onye ana ebo ebubo na uche ya adịghịzi na PDP kwuru nke a ụbọchị Monde mgbe okwuru na ya na Peter Obi na ndị gọọvamọ ọwụwaanyụ enwela ọtụtụ nzụkọ maka nke a.

Idris gbara afọ iri isii taa nke bụ na o kwesiri ịla ezumike nka mana kepukepu na-ekwu na gọọmenti etiti nwere ike ịgbatikwu oge ya.

Ịkpata mpekele ihe eji eme ntuliaka ga-ebe na 8 Febuwari

Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Ha na-akpọ ndị mmadụ bịa were PVC ha dịrị njikere maka ntuliaka

Independent Electoral Commission INEC ekwuola na ụbọchị ikpeazụ aga akwụsi ịnye akwụkwọ ikike eji eme ntuliaka bụ PVC bụ na mkpụrụ ụbọchị asatọ (8) nke Febuwari.

N'aka ọzọ INEC ewuchiela ekwentị maọbụ ihe ọbụal eji ese foto na ebe ana atụ vootu dika onyeisioche ha na Kano steeti bụ Okamuta Riskuwa Shehu si kwuo.

Ụwaagbaa"Theresa" gharị maka Brexit

Image copyright Getty Images

N'ofesi, oruola ka aga amata ebe ọsụ ụtara dowere ọdụ na amụma Brexit nke mba Briten.

Theresa May bụ onyeisi obodo ahụ na-arịọ ndị pati ya ha ekwela ka ihere mee ha site na-ịme ka ya bụ Brexit kpụọ afọ n'ala.

Serena bụ ọkaibe na Australia Open

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Serena williams

Agụ nwaanyị tenis bụ Serena Williams egosila na ya bụ agadị anaghị aka nka na egwu ọmaara agba sịte na-imeri Tatjana Maria na Australia Open.

Serena gbara afọ iri atọ na asaa ga-enweta nturu ugo grand slam nke iri abụọ na anọ (24) ma ọ nweta mmeri nke agba abụọ a ọ banyere.

Gee nkeji Igbo

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Lee ihe nkiri

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionEze Kaduna: Ndị Igbo nọrọ ebe ọbụla ha denyere aha tuọ vootu

Akụkọ kachasi