NLC: 'Anyị ekwenyeghị na N27,000 dịka ụgwọọnwa opekatampe'

Akụkọ ndị dị mkpa:

NLC ekwenyeghị na N27,000 dịka ụgwọọnwa opekatampe

Image copyright Getty Images

Otu jịkọrọ ndịọrụ bụ NLC n'aha ịchafụ akatọla nkwado nke otu ndị ọchịchị nke a kpọrọ 'National Council of State nyere ka a kwụwa ha puku naira iri abụọ na asaa dịka ụgwọọnwa opekatampe.

Odeakwụkwọ otu ahụ bụ Peter Ozo-Eson, kwuru na na National Council of state enweghị ikike ikwu ihe ọzọ ebe ha na gọọmenti nwecharala nkwekọrịta ego ole a ga-akwụ.

Theophilus Danjuma na-eti mkpu atụmatụ wuruwuru na ntuliaka na-abịa

Image copyright Theophilus Danjuma/Facebook

Onye bụbu Mịnịsta nchekwa Naijiria bụ Theophilus Danjuma etiela mkpu na-ebo ebudo na e nwere atumatụ ime wuru wuru na ntuliaka n'abia.

Danjuma onye kwuru nke a na Takum, Taraba steeti ebe a gbapere ụlọọrụ nyocha ọbara, kwuru na a nwere atụmatụ ibute ọgbaghara nke ga-eme ka a kpọbata ndị agha na ndị uweojii were ha mee wuruwuru na ntuilika.

O rịọrọ ndị Taraba ka ha kwado ka udo chịa na ntuliaka ahụ.

Ohanaeze na-emegide Buhari- APC Ọwụwa-anyanwụ

Image copyright Ohaneze/Facebook
Nkenke aha onyonyo Nnia Nwodo Bụ onyeisi Ohaneze Ndigbo

Ndị APC ọwuwa anyanwụ na-ebo otu Ohaneze Ndigbo ebubo itinye aja na gari mbo achumta vootu Buhari n'Owuwa anyanwu.

Ha kwuru na otu ahụ hiweere nzuko imeobi ha ụbọchị Buhari kwesiri ime achumta vootu n'Owuwa anyanwụ.

Emiliano Sala na-efu efu

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Emiliano Sala si FC Nante nke Frenchị ligu Cardiff Premia Ligi

Egwu ji ndị mmadụ dịka a na-atụ uche na ọgba bọọlu mba Argentine bụ Emiliano Sala nọ n'otu ụgbọelu a na-efu efu kemgbe abali Monde.

Ndị ihe nwa amadi na-agbara Cardiff City bọọlu na-amasị si Nantes(pronounced -nonts) dị na mba France na-aga Cardiff oge ụgbọelu ọ nọ n'ime ya furu.