Nigeria Election 2019: Ọgụ na mgba dị n'etiti ndị 'Buhari ga-emeri' na ndị 'Buhari ga-ada'

Ndị na-akawado ndọrọndọrọ Image copyright Getty Images

Ọtụtụ mmadụ na-ajụ ihe mere onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari ji ewusike na soshal.

Ebe ụfọdụ na-akọwa ihe mere ha ji chọ ka Buhari merie, ndị ọzọ chọrọ ka ọ daa.

Ndị chọrọ ka o merie malitere wuwe na soshal kamgbe Buhari malitere achụmta vootu.

Mana taa bu Februwarị iri na abụọ ,ndị mmadụ bidoro kwuwe ihe mere ha ji choọ ka Buhari kwara lawa ma emecha ntuliaka na-abịanụ.

Ihe ndị chọrọ ka Buhari merie na-ekwu n'elu soshal:

@jubray8644 kwuru na Buhari ga-emeriri ọfụma na Lagos steeti.

@Samuelochai kwuru na Buhari emeriela rị.

@RichardOkoronk1 kwuru na Chineke kpọtara Buhari ka onyere ụmụ Naịjira aka ya mere ọ ga-eji merie.

@lerries kwuru na nwunye onyeisiala Buhari na-enyere ya aka eme achụm

Ihe ndị na-achọghị ka Buhari merie na-ekwu.

‏@Naijadailyfeed kwuru na onye na-emeghị ọfụma ekwesighị ịnwe ohere ịbata oche onyeisiala nke abụọ.

@tboss_guy kwuru na onweghị onyeisiala ga-achị ala Naịjirịa karịa afọ anọ karịa ma onye kwesiri ka enye ya maka ọrụọma ọrụrụ.

@akaebube kwuru na ihe akpụrụakpụ dị n'ịhu ebe esi a baa obodo Abuja.

@IdamLydia kwuru na okwute a na-ama onyeisiala Buhari ma ọ na-aga achụmta vootu n'ụfọdụ ebe gosiri na ndị ochere hụrụ ya n'anya akwadoghị ya.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: