Building collapse in Lagos: Aisha Buhari gara ileta ndị ụlọ dakwasịrị

Aisha Buhari Image copyright Twitter/AishaBuhari

Akụkọ dị mkpa:

Nwunye onyeisiala bụ Aisha Buhari agaala ileta ndị merụrụ ahụ ka ụlọelu dara ma gbuo ndị mmadụ na Legọs, ụbọchị ole na ole gara aga.

O kperela ndị ọdachi a dakwasịrị ekpere.

Aisha kwuru sị na obi dị ya ụtọ ịhụ ka ndị ihe mere na-agbake, ma kelekwaa gọọmentị Legọs steeti maka ịgbata ọsọ enyemaka.

Cheta na ụlọelu ahụ dagidere ma ụmụakwụkwọ ma ndị na-ere ihe n'okpuru ya.

Ntuliaka Rivas tara isi ọkammụta

Ọnwụ Ferry Gberegbe bụ ihe ihe ọtụtụ kpụ n'ọnụ ugbua, dịka Gọvanọ Nyesom Wike gara mgbaru n'ụlọ ya.

Image copyright Rivers state Government
Nkenke aha onyonyo Gọvanọ Nyesom Wike gara mgbaru n'ụlọ Gberegbe

Gberegbe rụrụ ọrụ dịka onye nnọchiteanya PDP n'okpuru ọchịchị Khana oge e mere ntuliaka ọkwa gọvanọ na Rivas steeti, hụrụ ọnwụ ya n'anya ka ọ gara ịrụ ọrụ e dinyere ya.

Site n'ihe onyonyo na-agagharị na soshal midia, egbe otu onye uweojii gbapụrụ, tụrụ Gberegbe bụ onye nkuzi na Rivers Poly dị na Bori n'afọ, mere ka e buga ya ụlọọgwụ ebe ọ nọ lakwuru chi ya.

N'akwụkwọ ozi si n'ụlọọrụ gọọmentị Rivas steeti, Gọvanọ Wike kwere nkwa ilekọta ezinaụlọ ya ka ọ gara mgbaru na be ya, ma kwuo na ọ ga-enye ha nde naịra abụọ (N2m) ka e ji zụọ ụmụ anọ Gberegbe hapụrụ, n'agụmakwụkwọ.

Wike kwekwara nkwa iwuru ha ụlọ ma tinyekwa aka n'akwamozu ya.

Uche Secondus bụ onyeisioche PDP, dugara Wike mgbaru a, ma kwuo na ihe a tara isi Gberegbe, bụ makana "ndị uweojii na ndị agha abụrụla ndị ndọrọndọrọ ma bụrụkwa ndị na-arụ ihe ndị ndọrọndọro ziri ha".

Ka BBC kpọtụrụ Nnamdi Omoni bụ ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii na Rivas steeti, o kwuru na ha na-elebanye anya n'ihe niile gbasara ọgbaghara/ọgụ na mgba dapụtara na ntuliaka a.

Ndị mmadụ anwụọla n'IDP camp,

Dịka otu Norwegian Refugee Council si kwuo, mmadụ asatọ anwụọla ebe ihe ruru mmadụ puku iri na ise enweghizi ebe obibi dịka ọkụ nwatakịrị ji esi nri gbasara ma mụnye ọkụ n'ebe ndị gbara ọsọndụ na-anọ n'obodo Gajiram dị na Bọrọnu steeti.

N'akụkọ si mba ọzo,

Ajọ ifufe egbuola ihe ruru mmadụ iri abụọ na anọ ebe ihe ruru mmadụ iri anọ ka na-efu, na mba Zimbabwe.

Image copyright Reuters

Ajọ ifufe a akpọro Idai, malitere na mba Mozambique na mgbede Tọọzde gara aga, tupu ọ banye Zimbabwe ebe ọ na-ebu ma ụlọ, akwammiri nakwa okporoụzọ.

N'egwuregwu,

Otu egwu basketbọọlụ ụmụnwaanyị Naịjiria ga-ezute Rọshịa, Ajentina na Koriya, n'asọmpi iko mbaụwa ga-amalite n'ụbọchị iri atọ na otu nke ọnwa Ọgọst, na mba Chaịna.

Gbenga Daniel agbaala ndọrọndọrọ ọchịchị "arụkwaghịm",

Gbenga Daniela chịburu Ogun steeti ma bụrụkwa onyeisi ngalaba nhazi achụmnta vootu Atiku Abubakar na ntuliaka 2019, ekwuola na ọ ga-awụsa ọwa n'ihe banyere ndọrọndọrọ ọchịchị.

Image copyright Facebook/Gbenga Daniel
Nkenke aha onyonyo Gbenga Daniel chịrị Ogun steeti afọ asatọ, site n'afọ 2003 ruo afọ 2011

N'akwụkwọ ozi o kesara nke BBC nwetara, o kwuru site na bido n'ụbọchị 14 nke ọnwa Maachị, na ọ chọrọ igbado anya n'ọrụ ndị ọzọ na-abụghị ndọrondọro ọchịchị.

O kwuru na ọ chọrọ ikpọlite ngalaba o hibere maka nlekọta ndị mmadụ anya n'efu nke ọ kpọrọ "Gateway Front Foundation (GFF)", na ndụ.

Ndịagha so gbosaa ntuliaka Rivas steeti

'Komiti Inec hiwere ilebanye anya n'ọgbaghara so ntuliaka ọkwa gọvanọ e mere na Rivas steeti ewepụtala ozi ihe ha chopụtara were kwuo na ndị agha Naijiria na ndị agboro bụ ndị wakporo ebe a na-achịkọta mpụtara ntuliaka,majaa ndị ọrụ Inec ma gbosaa ọrụ ha.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Inec kwuru na ndịagha Naijiria so gbosaa ntuliaka e mere na Rivas steeti

Onyeisi gbasa ozi Inec bụ Festus Okoye kwuru n'ozi o wepụtara na Fraide na komiti ahụ chọpụtara na e mela ntuliaka ọkwa gọvanọ na ụlọomeiwu nke steeti n' ọtụtụ n'ime ọdọ atụmvootu ma kpọpụta mpụtara ha tupu a kwụsị ihe niile gbasara ntuliaka na steeti ahụ.

Cheta na Inec kwụsịburu nchịkọta na mkpọpụta mpụtara ntuliaka ọkwa gọvanọ na ụlọomeiwu e mere na Rivas n'abali 10 nke ọnwa Maachi n'ihi akụkọ tigbu-zọgbuo, so ya bụ ntuliaka.

______________________________________________________________________________________________________________________________________________________

Okwui Enwezor efereela ụwa a aka

Image copyright EPA
Nkenke aha onyonyo Okwui Enwezor, onye bụbu onyeisi, Haus Der Kunst, bụ ulọ nchekwa nka na mba Germany

Nwafọ Igbo bụ ọkaibe na idokwa ihe nka ama ama na mbauwa bụ Okwui Enwezor ,onye Awkuzu, Anambara steeti anwụọla ụbọchị Fraide na mba Germany ka ọ rịachara ọrịa kansa afọ ole na ole.

Enwezor onye gbara afọ iri ise na ise tupu ọ nwụọ bụbu onyeisi Haus Der Kunst(pronounced -house de Kọnst) bụ ulọ nchekwa nka na mba Germany.

__________________________________________________________________________________________________________________________________________________________________________________

Ụlọelu ọzọ adaala n'Ibadan,Oyo steeti

Nkenke aha onyonyo Ụlọelu dara n' Ibadan

Ụlọelu nwere ogogo atọ a na-arụ arụ adala dagide dị na-arụ ọrụ na ya na Molete, Ibadan, Oyo steeti ụbọchị Fraide.

Nke a na-eme abali abụọ ụlọelu dachara na Legọs gbuo mmadụ iri abụọ ma merụọ ọtụtụ ahụ.

Ka ọ dị ugbua, a zọpụtala mmadụ asaa n'ime ndị ụlọ ahụ dagidere dịka ndị nọ ebe ihe mere siri kwuo.

__________________________________________________________________________________________________________________________________________________________________________________

New Zealand Shootings: Aka akparala Brenton Tarrant

Image copyright Reuters
Nkenke aha onyonyo A kpụpụrụ Brenton Tarrant, onye dị afọ 28, ụlọikpe ụbọchị Satode maka mwakpo a wakporo ụlọụka Alakụba abụọ na Nu Ziland

A kpụpụla Brenton Tarrant, onye a na-enyo enyo dika isi a hụrụ kwaba okpu na ihe ọdachi ịgbagbu mmadụ iri anọ na itoolu nke mere n'ụlọụka Alakuba abụọ na mba Nu Ziland ụlọikpe

Akụkọ na-ekwu na mmadụ iri atọ na itoolu ndị merụrụ ahụ ka na-anata nleta n'ụlọọgwụ.

__________________________________________________________________________________________________________________________________________________________________________________

Fifa ga-amalite asompi Klọb mbaụwa n'afọ 2021

Fifa akwadola ka e nwee asọmpi otu egwuregwu iri abụọ na anọ nke ga-ebido ọnwa Juun, afọ 2021 n'agbanyeghị na Europrean league ekwuola na ha agaghị esonye n'asọmpi ahụ.

Gee akụkọ ndị a n'ebe a:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a