A machiela mmanya na-ekeli utu ka utu nwoke jụrụ ọdịda dịka ọ ṅuchara ya

Akụkọ ndị dị mkpa taa:

Mmanya na-ekeli utu abụrụla ahịa iwu na mba Zambia

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ụmụnwoke Zambia na-'enweta onwe' ha

Ndị na-achị mba Zambia amachiela mmanya mpọ ka ha mechara nyocha gosiri na o nwere ihe na-ekeli utu n'ime ya.

Na nkọwa ndị ọrụ gọọmentị Zambia ihe ahụru n'ime mmanya bụ ihe eji eme ọgwu amu ike akpọrọ Viagra.

Mmanya a kpọrọ "Six Energy Natural Power drink" na Bekee bụ nke ụlọ ọrụ Revin Zambia na-arụpụta ma na-erekwa na mpaghara ọwụwa anyanwụ Afịrịka.

Na mba Uganda, otu nwoke ṅwụrụ mmanya tiri mkpu na ihe ojiri bụrụ nwoke ekweghi ada ada nakwa na ọsụsọ gbajuru ya ahụ.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionLee ihe ụmụnwaanyị na-akpa n'azụ ụmụnwoke

N'okwu ha kwuru ụbọchi Wenezde, ndị ọrụ gọọmentị na obodo Ndola dị na Zambia, bụ ebe a na-arụpụta mmanya a, nyere iwu ka a gaa ahia niile bughachite mmanya a.

Tilyenji Mwanza bụ ọnu na-ekwuru obodo Ndola kwuru na akwụkọ mgbasaozi na nchoputa emere na mba Sawụt Afịrịka nakwa mba Zimbabwe kwadoro nke ha ma gosi

na onwere mgbọrọ ọgwụ akpọrọ "Sildenafi Citrate", bu ihe ama na-ekeli utu.

Ndị na-ekwuru ụlọ ọrụ Revin Zambia etinyebeghi ọnụ n'okwu a.

Mana n'ọnwa Janụwarị onyeisi ụlọọrụ ahụ aha ya bụ Vikas Kapoor gwara BBC na dịka o si mara "onweghi ihe na-ekeli utu di na mmanya ha"

PDP ekpeela Jọstis Inyang n'aka NJC

Image copyright Getty Images

Otu PDP ekpela Jọstịs Ekwo Inyang nke Ulọikpe Ukwu dị n'Abuja n'aka otu na-ahụ maka ndị ọkaikpe bụ NJC n'ịchafụ maka ịkwusi mkpokọta na mkpọpụta mpụtara ntuliaka ọkwa gọvanọ Bauchi steeti.

Cheta na Gọvanọ steeti ahụ bụ Mohammed Abubakar kpụpụrụ Inec ụlọikpe maka ibidogharị ịgụ nakwa ịkpọpụta vootu enwetere na ntuliaka nke ndị gọvanọ nke steeti ahụ.

Okorocha akpụpụla Inec Ụlọikpe

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Rochas Okorocha bụ gọvanọ Imo steeti

Govanọ Imo steeti bụ Rochas Okorocha akpụpụla Inec Ụlọikpe ịrịọ ka ha nye ya asambodo mmeri o meriri na ntuilaka dịka onye nnọchite anya Imo West Senatorial zone,ebe zọrọ otu ọkwa ahụ n'aha SDP bụ Henry Unaeze ajaala Inec ka ha hiwe mmeghari ntuliaka maka ọkwa ahụ.

Cheta na na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere Prof. Francis Ibeawuchi,onye kpopụtara Okorocha dịka onye meriri gwara BBC Igbo na a manyere ya amanye mee otu a.

Buhari jụru ibinye aka n'akwụkwọ

Image copyright @bashirahmad
Nkenke aha onyonyo Muhammadu Buhari ga-enwere ọnọdụ dịka onyeisiala Naịjiria nke ugboro abụọ ya.

Onyeisala Naijiria Muhammadu Buhari ajụla ibinye aka n'iwu ise ndị ụlọomeiwu ukwu zigara ya.

Nke a gụnyere ikike mgbasaozi na ịntanet na iwu ndị ọzọ bụ nke ọ sị na iwu ndị ahụ metụtara ọtụtụ ihe mana o nweghị nke o lebanyere anya ọfụma.

Libya 2 - 0 Nigeria

Image copyright Chris Okereke
Nkenke aha onyonyo Otu egwu bọlụ ndị etọrụbeghị afọ iri na atọ

N'egwuruegwu, otu ụmụọkorobia erubeghị afọ iri abụọ na atọ nke Bekee kpọrọ Under 23 nke Naịjirịa amalitela ịgba ọnyụpa n'agba nke mbụ egwuruegwu ha na ndị mba Libya.

Ndị Libya ji ọkpụ abụọ asataghị ihe were mee Naịjirịa taa kpuchie ọnụ na ya bụ asọmpi AFCON ụbọchị Wenezde.

Gee nkeji anyị

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe nkiri

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionChristchurch: Buo agha megide iyi ndụ egwu n'ụwa niile- Jacinda Arden

Akụkọ ga-amasị gị

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a