New Minimum wage: "Ụgwọ opekatampe dị m mkpa"

Onyeisiala Muhammadu Buhari Image copyright @Mbuhari/Twitter

Kọmiti Muhammadu Buhari kpokobara gbasara ilebanye anya n'ụgwọ opekatampe enyela ya nchọpụta ha taa n'Abuja.

Onyeisiala Muhammadu Buhari si n'akara Twitter ya kwuo na ihe gbasara ụgwọ opekatampe dị ya mkpa.

Ihe ndị ọzọ o kwuru bụ na a na-eche ndi ụlọomeiwu ka ha nye iwu gbasara usoro ụgwọ opekatampe ọhụrụ.

Image copyright AKPO YEEH

Onye na-azọ ọkwa osote Govano n'okpuru otu AAC na Rivas steeti bụ Bomba Yeeh agbahapụla otu ya.

O kwuru na ọ bụ n'ihi etu Chibuike Amaechi bụ minista na-ahụ maka njem siri zọkọrọ ihe niile gbasara ya bụ pati.

Cheta na Amaechi pụtara ikwado otu AAC na ntuliaka ọkwa Gọvanọ nke e mere na steeti ahụ n'ụbọchị 9 nke ọnwa Maachị.

Ihe mere na Legọs

Gọọmentị Legọs dọrọ ndị mmadụ aka na natị ọ kachasị ndị bi n'ụlọ ndị a na-akwado ị kwatu sị ha gaa chọọ ebe ọzọ biri.

Arịrịọ a na-abịa dịka ụlọ ọzọ dara na Legos Island n'ụbọchị nke ga-eme ya ụlọ atọ n'ime izuụka abụọ.

O nweghi onye merụrụ ahụ maọbụ nwụọ n'ọdachi nke atọ a.

Anyị wuchie n'Imo steeti

Ndị otu AA: Peter Igwe, Ikenna Okata, Ifeanyi Opara, Donatus Obiakor, Augustine Anyanwu, Endy Nwanyanwu, Ifeanyi Ejim. Ifeanyi Okponwa nakwa Ekemezie.

Haa niile bụ ndị isi okpuru ọchịchị itoolu nke otu Action Alliance machiri maka mmegide iwu na ọchịchị ya bụ Pati.

Na mba ofesi,

Ngalaba ahụike na mba Kongo ekwuola na ihe karịrị mmadụ otu puku enwetala ọrịa Ebola ọhụrụ ebe ihe karịrị mmadụ narị isii anwụọla site n'ọrịa a.

Ha kwuru na mwakpo a na-eme ụlọ ọgwụgwọ dị icheiche so n'ihe na-eme ka ọnụọgụgụ ndị nwere Ebola na-arị elu.

N'egwuregwu,

Naịjirịa emeriela mba Libya dịka ha kwatara ya taa n'ọgbọ egwuregwu Stephen Keshi n'Asaba.

Ha ji ọkpụ goolu anọ asataghị otu dọkaa neeti ndị mba Libya.

Victor Osimhen nke aha ya na-ewu na soshal midia bụ onye nyere goolu mbụ.

Akụko BBC Igbo na nkeji

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ndị ọnụ na-eru n'okwu gara hụ Nnia Nwodo

Nkenke aha onyonyo Nnia Nwodo onyendu Ohaneze Ndigbo

Ndị ọnụ na-erU n'okwu n'Alaigbo ebugarala onyeisi Ohaneze Ndigbo bụ Nnia Nwodo ụkpa ekele maka ịkwụsịke ya na atụmatụ Ihazịgharị Naijiria n'agbanyeghị mgba okpuru na ọnwụnwa so ntuliaka 2019.

Ndị mere njem a n'ịzụụka a garanụ gụnyere Achike Udenwa, Okwesilieze Nwodo, Azu Agboti, Onyema Ugochukwu , Dubem Onyia nakwa A.B.C. Nwosu bụ ndị kwuru na Ndịgbo mere ka a tụrụ anya na ya bụ ntuliaka.

Cheta na Nnia Nwodo n'ozi keleburu Ndigbo maka ndị ha họpụtara na ntuliaka ọkwa gọvanọ na ndị ụlọomeiwu nke steeti n'Ọwụwa Anyanwụ were sị na ndị a họpụtara bụ ndị ga-akwadọ nhazigharị Naijiria.

Image copyright Nnia Nwodo

N'ozi o wepụtara , Nwodo sịrị , "Asị m ka ha were ohere kelekwa ụnụ ọzọ maka pụta na nhọpụta a họpụtara maka ndị ga-ejere anyị ọkwa gọvanọ na na ụlọomeiwu na steeti dị iche iche.

"Ihe juru m afọ na nhọpụta ụnụ mere bụ ndị ụmụ họpụtara ndị anyị mara na ha ga-akwado Ohaneze gbasara nhazighari Naijiria, ụnụ mere ka anyị siri were kwuo."

Nwodo onye rịọrọ ndị Igbonọ obodo oyibo na ndị jiegoakpataego(businessmen) ka ha bịa jịkọ aka mepee Alaigbo, "Anyị ga-etibuta be anyị ka ọ bụrụ ihe nkiri na ndị jụrụ anyị kwere, ka ndị na-agbara anyị ọsọ chọrọ anyị bịa."

Ndị kwe ndị ekwe na mmejuputa ntuliaka 2019

Nkenke aha onyonyo Akara njirimara PDP na APC

Dịka Jeremiah Useni nke PDP na-ekwu na ya ga-aga ụlọikpe maka mpụtara ntuliaka gọvanọ Plateu steeti bụ nke Inec kpọpụtara Simon Lalong nke APC dịka onye mmeri, otu APC ajụla mpụtara nke Benue na Sokoto steeti nke Inec sị na ọ bụ otu PDP meriri.

Ọnụ na-ekwuru APC na Sokoto steeti bụ Bello Danchadi gwara ndị ntaakụkọ na nrụrụaka karịrị na ya bụ mmezụ ntuliaka e mere na Satọde.

Ụlọikpe agọlara Trump

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Donald Trump boro ndị isiala mba Syria na Rọshịa ebubo maka ihe mere na Syria

N'ofesi e, ụlọikpe nnyobe anya ekwuola na ha ahụghị aka Donald Trump nke Amerika na Russia na ịgba ntuliaka mba Amerika mgbaokpuru na 2016.

Onyeisioche ya bụ ụlọikpe bụ Robert Mueller ekwughịzị ka o nwere ka Trump siri gbochie ụlọikpe ilebanye anya na ya bụ okwu.

Azọgbụọla otu onye na Zimbabwe

Nkenke aha onyonyo A zọgburu otu nwoke na ọgbọ egwuruegwu ebe ndị mba ahụ na-ezute Congo Brazaville

N'egwuruegwu, a zọgbuola otu onye bịara ikiri bọọlụ na Zimbabwe dịka ndị mba ahụ na ndị Gongo Brazaville pụtara ịma ọkaibe na Iko G nke asompị mba Africa.

Zimbabwe ji ọkpụ abụọ asataghị ihe sị ya bụ nwaamadị laa n'udo ma tozuo dịka ndị ga-aga ya bụ asọmmpi na Ijipt.

Nkeji ụtụtụ

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Akụkọ ga-amasị gị

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a