Adams Oshiomhole: Ihe isii o kwuru maka nkwekọrịta APC na AAC na ntuliaka 2019

Rotimi Amaechi na Adams Oshiomhole Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Adams Oshiomhole agọnahụla Amaechi n'okwu nkwekọrịta APC na AAC

Otu APC agọọla na akụkọ na-ekwu onyeisioche pati ha bụ Adams Oshiomhole agọnahụla mịnịsta na-ahụ maka njem bụ Rotimi Amaechi n'okwu gbasara nkwekọrịta APC na AAC na Rivas steeti bụ akụkọ ndị afọ njọ.

APC kwuru n'akwụkwọ ozi ha wepụtara nke Lanre Issa-Onilu bụ odeakwụkwọ mgbasaozi binyere aka na Oshiomhole na Amaechi dị na mma.

"Ihe Onyeisioche kwuru bụ na o nweghị nkwekọrịta e dere n'akwụkwọ ha na AAc nwere mana nke a apụtaghị na o nweghị nkwekọrịta ọbụla APC nke steeti nwere."

Onyeisioche otu APC bụ Adams Oshiomhole kwuburu mkparịtaụka ya n'ụlọọrụ ntaakụkọ Channels TV nwere na nsonso a na o nweghị mgbe otu ahụ na otu pati AAC ji nwee nkwekọrịta ịkwado onye ọbụla na ntuliaka ọkwa gọvanọ na Rivas steeti.

"O nwebeghị ebe m kwuru na anyị (APC ) na otu ọbụla nwere nkwekọrịta."

O kwuru nke a n'agbanyeghị na Rotimi Amaechi na ndị APC Rivas steeti dọnyere Awara Biokpomabo nke AAC ukwu na ntuliaka ọkwa gọvanọ e mere na Rivas na nso nso.

"O nweghị onye sị na pati anyị ya na ndị isi ọrụ APC n'etiti gbara ụka maka nkwekọrịta ọbụla."

Lee okwuisii Oshiomhole kwuru na-akpọtụ akpọtụ

1. "Inec akwụbaghị aka ọtọ na ntuliaka 2019."

2. "Inec kagburu ntuliaka ndị ejighị 'card-reader mee n'ebe ụfọdụ ma hapụ ịkagbu ya n'ebe ndị ọzọ."

3. "Ntuliaka 2019 e mere kwụ ọtọ, na enweghị mkpagbu ọbụla."

4. "Akpamaoke Inec megidere APC doro ewu na ọkụkọ anya."

5. "Steeti ndị anyị meriri doro anya, ha wereya nye pati ọzọ."

6. "Ndị ọrụ nchekwa rụrụ ndị nyere ha ego ọrụ."

Akukọ ga-amasị gị: