Doctor's strike: Ahụike agbaala ọnyụpaa n'Imo - NMA

Abụbụọrụ Image copyright Getty Images

Akụkọ na-eru BBC ntị ugbua na-ekwu na ndị dibia bekee na-arụ ọrụ n'ụlọọgwụ gọọmentị amalitela abụbụọrụ amaghị mgbe ọ ga-ebi.

Onye bụbu onyeisi otu jịkọrọ ndị dịbia bekee a kpọrọ 'Nigeria Medical Association' na Bekee, ngalaba nke n'Imo steeti bụ Darlington Akukwe kwurula na o teele aka ya bụ oke mmiri ruwere.

Akukwe sị na ihe kariri afọ abụọ ugbua ka ndị ọrụ ahụike natawara mkpirisi ụgwọọnwa ha.

Ọ sị na nke ugbua ka njọ maka na ụgwọ ọnwa ha ji anata ụlọ be ha erughị pasenti iri atọ ma e wepụchaa ụtụisi bụ nke anaghị ezu ime ihe ọbụla.

Akukwe kwuru na nke a mere "ka ndị ọrụ ahụike gbapụcha n'Imo steeti" n'ihi ego ha anaghị ezukwara ha nri.

Ọ sị na-abụbụọrụ a bụ "ka ọha nụrụ olu anyị were mara nke bụ eziokwu, makana ihe na-ewu na ọbaozi intaneti niile abụghị eziokwu bụ nke sị na a kwụchaala ndị niile ụgwọ n'Imo steeti".

Akukwe sịkwa na ihe na-ese okwu abụghị naanị ụgwọọnwa ndị ọrụ ahụike, nakwa ngwaọrụ e ji arụ ọrụ adịghị.

"Ụlọọgwụ niile dakasiri adakasị, ọgwụ adịghị n'ụlọọgwụ. Ebe a na-ele ndị mmadụ ahụ dị ka ebe a na-azụ ezi".

Akukwe kwukara na ha bụ ọdịmma ndị mmadụ n'obi nke mere na ha hapụru ndị dọkinta nwere ụlọọgwụ nke ha ka ha nọrọ n'ọrụ were nwee ike ilete ndị ahụ adịghị.

Ọ sị na ha nwere olilieanya na gọọmenti na-abata ga-eme ka ihe dị iche dị, na abụbụọrụ a bụkwa maka ị dọ ha aka na ntị ka ha mara ebe asụrụasụ dowere odo.

BBC Igbo gakwara n'ihu kpọtụrụ Kọmishọna steeti ahụ na-ahụ maka ahụike bụ Angela Uwakwem bụ onye sị na ya "rịọkwara ndị dibia bekee a ka ha ghara ịgba ya bụ abụbụọrụ makana ọrụ ha dị mkpa".

Uwakwem sịkwa na ya rịorọ ha ka e jiri nwayọọ kpaa ya bụ ihe akpa ka ofe rọọrọ arọ were zuo nri mana ha jụpụrụ isi.

O kwuru na gọọmentị kwadoro ndị dọkịnta a ka ha si n'ego ọbụla ha rụpụtata kwuzuo onwe ha ụgwọ ọbụla mafọro n'ụgwọ ọnwa ha.

O kwukwara na tupu ya abata n'ọrụ dịka Komishona, na o nwere nghọta ndị ọrụ bekee niile nwere maka ụgwọọnwa bụ nke ya amaghị nke ọma bụ nke kpatara e ji akwụbiri ha ụgwọọnwa.

Akụkọ ga-amasị gị

Lee ihe nkiri a

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionOdo festival: Otu ndị Nkwo n'Enugu steeti si eme oriri Odo

Isiokwu Ndị Emetụtara

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a