Sudan crisis: A hụrụ ego mbute dị $130m n'ụlọ Oma al-Bashir
Akụkọ ndị dị mkpa:
A hụrụ ego mbute n'ụlọ Omar al-Bashir
Ebe foto si, Reuters
A hụrụ ọkpụrụkpụ ego n'ụlọ onyeisiala mba Sudan achụpụrụ achụpụ bụ Omar al-Bashir ebe amalitela inyocha ya maka ịtụ mgbere ego.
Ndị ọrụ nchekwa hụrụ ego dị na yuro, dọla nakwa paụnds ndị Sudan nke ọnụ ọgụgụ ya ruru nde dọla narị iri atọ.
Akụkọ kwuru na akpọchiela ya n'ụlọ mkpọrọ nchekwa dị elu akpọrọ Kobar bụ ebe a ga-anọ gbaa ya ajụjụ ọnụ.
Otu onye kwara ndị ntaakụkọ na ego ndị dị n'ime ikpe dị icheiche.
Nwaanyị amụọla ejima na mkpọrọ
Ebe foto si, Getty Images
Nwaanyị nọ na mkpọrọ dị n'mkpọrọ Afọkang dị na Calabar, Cross River steeti amụọla ejima nwoke na nwaanyị.aka mpụ a kpọghị aha ya amụrụejima nwoke na nwaanyị ụbọchị Tọzde.
Kọmịshọna ahụ ike na steeti ahụ bụ Inyang Asibong kwuru na gọọmenti steeti ahụ ewegharala ịlekwa ụmụaka ahụ amụrụ ọhụrụ dịka nne ya dara ahụ ka ọ mụchara ha.
Buhari agbatịala oge Tanko Muhammad dịka ọkaikpe ukwu Naijiria
Ebe foto si, @NGRPresidennt
Onyeisiala Naijiria bụ Muhammadu Buhari ejirila ọnwa atọ gbatia oge Tanko Muhammad dịka onye ọkaiwu ukwu Najiria.
Ọ bụ ojeozi Buhari n'ihe gbasara ịntanet bụ Bashir Ahmaad kwupụtara nke a n'igwe Twitter ya.
Onyeisiala Buhari nyereburu Muhammad ọkwa n'ọnwa Januwarị afọ ka ọ kwụsịchara Walter Onnoghen onye jibu ọkwa ahụ ọrụ n'ike n'ihi ebubo ekwupụtaghị akụ ya niile.
Mwepụ ewepụrụ Onnoghen n'ike kpalitere ụka dịka ọtụtụ ndị Naijiria na-ebo ebubo na nke a bụ iji nye ohere ka onye ga-adonyere ndị mere wuruwuru na ntuliaka 2019 ukwu nọrọ n'isi mmiri.
O nweghị ndị ọrụ Inec anyị nwụchiri - DSS
Ebe foto si, @Inecnigeria
Ndị ọrụ Inec na oge ntuliaka e mere n'ọnwa March afọ 2019
Ngalaba otu Ndị uweojii nzuzo a kpọrọ DSS n'aha ịchafụ ekwuola n' o nweghị otu eziokwwu dị n'akụkọ na-efeghari na soshal midia nke na-ekwu na ha nwụchịrị ndị ọrụ kọmpụta Inec a na-enyo maka inye Atiku na ndị otu PDp akara igbe ozi Inec.
DSS kwuru na o nweghị mgbe ha kporo oku maọbụ nwụchie onye ọru Inec ọbụla.
______________________________________________________________________________________________________________
Buhari ọ nọ n'ụzọ ije karịa n'ụlọ?
Ebe foto si, @BashirAhmaad
Muhammadụ Buhari anọọla na mba ofesi otu afọ, abalị iri atọ na itoolu n'ime afọ atọ na ọnwa iri ọ chịrịla dịka onyeisiala Naijiria.
Abalị otu nari na iri na asaa n'ime ndị a bụ ihe ọ tụnyere na nlekọta ahụike ya dịka ụlọntaakụkọ Punch siri gbakọọ ya.
Mba Buhari kachasị gaa bụ Briten, Amerịka nakwa France and ọtụ mba n'Afrịka.
Njem ya wetara nkwekọịta Niajiria na mba ndị ọzọ n'ihe gbasara bu agha buso ndị otu Boko Haram mana owebataghị ego ndị oji ego achụ ego mba ọzọ na Naijiria.
______________________________________________________________________________________________________________
NCEF,Uwazuruike akatọọla ikpe a mara Onnoghen
Otu ndị okenye ndị ụka Kraist a kpọrọ National Elders Forum ekwuola n'ikpe a mara Walter Onnoghen bụ onye bụbu ọkaikpe ukwu Naijiria bụ 'agha jihad megide ndị otu Kraist nke bidoro oge a chụdara Yakubu Gọwon n'ọkwa onyeisiala n'afọ 1975."
N'okwu ya, Goddy Uwazuruike bụ onye ọkaiwu na onye bụbụ onyeisi otu Aka-Ikenga, sị na mkpebi ahụ bụ ihe e cherelarị eche tupu e bido ya.
"Ebe ka ha wetara ihe akaebe gosiri ebubo ha boro dịka onye ọrụ CCB kwuru na ha enyochabeghị akwụkwọ mkpọpụta ihe Onnoghen nwere."
Ọ gara n'ihu kwuo na ya na-ele anya na Onnoghen ga-agbagha okwu ahụ n'ụlọikpe mkpegharị.
______________________________________________________________________________________________________________
Ihe mere Alan Gracia nke Peru ji gbuo onwe ya
Ebe foto si, Reuters
García sị na aka ya dị ọcha n'ebubo a na-ebo ya
Alan Gracia onye bụbu onyeisiala mba Peru gbagburu onwe ya ụbọchị Wenezde dịka a na-achọ inwuchi ya maka ebubo nrụrụaka, kwuru n'ozi ọ hapụrụ na ya gburu onye iji gbalahụ ndị iro ya na ndọrọdọrọ ọchịchị ịkpụ ya n'ala.
______________________________________________________________________________________________________________
E tinyegh ị anya na mmiri were họpụta Solkjaer- Jermain Jenas
Ebe foto si, Getty Images
N'egwuregwu,
Onye gbaburu England bọọlụ bụ Jermaine Jenas ekwuola na nhọpụta a họpụtara ole Gunner Solkjaer dịka onye nchịkọta Man. U adabanyeghị n'anya ya.
Jenas kwuru na ndị mere nke etinyeghị anya na mmiri were nwe mkpebi ahụ dịka Man dawachara ukwu n'asompi ha na Barcelona gbara iji banye agba nke ọkara-ikpeazụ na Champions League.