Tinubu agaghị abụ onyeisiala ma Buhari rituo - Onyeisi Miyetti Allah

Akụkọ ndị dị mkpa:

Tinubu agaghị abụ onyeisiala ma Buhari chichaa- Onyeisi Miyetti Allah

Ahmed Tinubu Image copyright @AsiwajuTinubu

Onyeisi Miyetti Allah bụ Abdullahi Bodejo ekwuola na okwu na Ahmed Tinubu ga-achi Naijiria ma Buhari rituo n'ọkwa bụ ajambene.

Na mkparịtaụka ya na ụlọntaakụkọ Sun nwere ụbọchị Satọde, Bodejo kwuru , na ọ bụ ndị Ugwu ga-aga n'ihu na-achị.

"Ihe m ma bụ na Tinubu enweghị ike ịbụ onyeisiala Naijiria. Nke ahụ bụ eziokwu.

"Ọ kaala. O nwere ike karịa Buhari na ịka nka. Ụfọdụ na-eche na Tinubu bụ nnukwu mmọnwụ mana ọ bụghị."

Bodejo kwukwara na ọ ga-esi ike onye Igbo ịchị n'ihi n'okwu ya," ha bu ihe ọjọọ n'obi."

Ọ gara n'ihu kwuo na ndị Ugwu ga na-achị ọgbọ na ntuliaka ọbụla e mere n'ihi na ndị ndịda enweghị efe ị ga-atụ vootu dịka ịchụ ego na-aka ha mkpa karịa.

"Ndị nọ na Ndịda Naijiria enweghị efe. I chere na onye Igbo ga-ahapụ ọdọ ahịa ya gaa kwụrụ n'ahịrị awa isii maka ịtụnyere mmadụ? E wezụga ma ha agbanwere tupu 2023."

"N'Ugwu Naijiria, ndị mmadụ dị njikere ịkwụ n'ahịrị bido n'ụtụtụ rue abalị iji tụnyere otu onye.

Ndịgbo anaghị etinye uchu na ndọrọndọrọ ọchịchị, na achụmta ego ka ha na-etinye uchu."

Tụnye ndị a na-ebo ebubo igbu Nọọsụ n'ụlọmkpọrọ- ọkaikpe

Nkenke aha onyonyo Gọọmenti Britain adịla njikere ịrụ ụlọ nkpọrọ na'Naijiria

Ụlọikpe majie dị n'Enugwu enyela iwu ka a nwụchie n'ụlọmkpọrọ mmadụ atọ bụ ndị ọrụ ụlọọgwụ Federal Neuropsychiatric Hospital, Enugu, maka ebubo igbu osote onyeisi ndị nọọsụ n'ụlọọgwụ ahụ bụ Dr Maria Amadi.

Ndi uweojii n'Enugwu steeti kpụpụrụ Afam Ndu, Stella Achara nakwa Ruth Buzo-Maduka ụlọikpe maka ebubo ịtụ ajọ alo na igbu mmadụ.

Ndị ntọ tọrọ ndị ọrụ Shell abụọ

Ndị uweojii agbaala ama na a tọrọ mmadụ abụọ welitere isi n'ụlọọrụ Shell ebe e gburu ndị uweojii na-echekwa ha na Rivas steeti ka ha na-alọta njem ọrụ.

A taala Neymar ahụhụ maka ihe o dere na soshal midia

Image copyright Getty Images

Uefa amachiela Neymar nke PSG isonye n'asompi Yurop atọ maka ịkparị ndị na-egbu bọọlụ n igwe okwu Instagram ya ka a gbagbuchara Manchester United na Champtions League.

Gere akụkọ dị ndị mkpa taa na ntị ebe a:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile