Naira Marley na-agụrụ anyị egwu ka nwa nza - EFCC

Image copyright EFCC/Twitter

Ndị ụlọọrụ EFCC ekwuola na dịka ha ga-enyocha Naira Marley na ndị ogbo ya maka ebubo metụtara n'iji wayo nata ndị mmadụ ego n'ịntaneti Bekee na-akpọ (Internet Fraud), ha na-enyere ha aka na nnyocha.

Onye kwuru nke a bụ Tony Orilade bụ ọnụ na-ekwuchitere ndị EFCC dị na Legọs.

Ọ gụnyere ndị ha machịrị ka ọgụụ egwu Afeez Fashola (e jiri Naira Marley mara), Omoniyi Temidayo Raphael (aka Zlatan), Tiamiu Abdulrahman Kayode, Adewunmi Adeyanju Moses na Abubakar Musa.

Ndị EFCC machịrị ya site n'iwakpo ha n'ụbọchị Fraide Mee 10, 2019 na Ikate, Lekki na Legọọs.

A ga-echeta na Naira Marley gụrụ egwu metụtara iji wayo nata ndị mmadụ ego n'ịntaneti.

Ndị ntorobia Igbo: Belatanụ Ihe eji alụ nwaanyị

Ndị ọbịa na-etinye ọnụ n'okwu

Ndị ntorobia Igbo akpola oku ka obodo dị n'Igbo wedata ihe ndị ọ na-eri iji lụọ nwaanyị n'ala igbo.

Ndị ntorobịa kwuru a nke na mkparịtaụka BBC hiwere na Facebook ụbọchị Fraide rụtụ®ụaka na ihe isi ike, ihe ilụnwaanyị na-erị nakwa oke mgbuchi nne nna na Igbo na-egbuchi ụmụ ha ndị nwaanyị so 'ihe na akpata alụghhị di maọbụ nwaanyị n'oge.

ANC meriri na ntuliaka na Saụt-Afrika mana

Onye ga-emeri na Sawut Afrịka?

ANC meriri na ntuliaka na Saụt-Afrika mana nke bụ mbụ pati ahụ banyere n'ọchịchị kemgbe 194 na enweta ihe pekarịrị 60%.

Ndị ma ihe a na-ekwu na ndọrọndọọ ọchịchị kwuru na ihe ha juiri merie bụ nkwa Cyril Ramaphosa kwere ibu agha megide nrụrụaka nakwa ikwalite akụnaụba ala ahụ nke na-akpụ afọ n'ala.

Mmiri riri mmadụ 50 ka gbọmmiri kpuru na Tunisia

Ndị mbịarambiara azọpụtara n'afọ 2015 na Libya Image copyright Reuters
Nkenke aha onyonyo Otu United Nation kwuru na ihe ruru mmadụ isii na-anwụ kwa ụbọchị n'afọ 2018 dịka ha na-agbalị ịgafe mba ofesi site na okeosimmiri 'Mediteranean'

Ụgbọmmiri kpuru n' okeosimmiri Tunisia, mmiri rie ike karịrị mmadụ 50.

Ụlọakụkọ mba ahụ kwuru na mmadụ ruru 70 ndị e chere zọpụrụ ije ha na Libya nwụrụ n'ọdachi ahụ.

A na-arụ aka n'ọtụtụ ha sị mpaghara ọdịda anyanwụ Afrịka,

E kwuru na a zọpụtara mmadụ 16, ebe a hụkwarala ozu mmadụ atọ.

Iwe na-ewe ndị bọọlụ na-amasị

Champions League trophy and Uefa trophy Image copyright Getty Images

N'egwuregwu,

Ndị na-akwado otu Liverpool, Tottenham, Chelsea na ewela iwe maka na enyere ha naanị otu n'ime oke atọ akwụkwọ e ji aba n'ọgbọ egwuregwu maka ngwụcha asọmpi ndị Yurop.

Gee akụkọ n'otu nkeji ebe a:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ụlọikpe Anambra adaala Kọmịshọna ndị uweojii nha

Uloikpe n'Anambra Image copyright Getty Images

Ụlọikpe n'Anambra steeti adaala onyeisi ndị uweojii na ndị ọrụ ya abụọ nha nde Naịra iri na ise (N15) maka ịnapụ Emmanuel Arinze ịkike dịrị ya dịka mmadụ.

Ọkaiwu Dilibe Amaechina sị na nha a bụ maka ịdọ ndị uweojii aka na ntị maka ajọ akparamaagwa ha na akpasa ndị mmadụ.

Ndị uweojii abụọ a bụ Abdu Osu na Sagenti Oviaede Mamode jidere ya bụ onye okaikpe na ọnwa Disemba afọ 2018 taa ya ahụhụ dị iche iche ma kpọchikwa ya n'ụlọọrụ ha karịa oge iwu kwuru.

Ụlọikpe ebufeela Ikpe Rochas Okorocha 16 nke ọnwa Mee

Image copyright PIUS UTOMI EKPEI
Nkenke aha onyonyo Okorocha kwuru na Igbo na Ipob abụghị otu ihe

Ụlọikpe n'Abuja ebufeela Ikpe gbasara akwụkwọ ikike Rochas Okorocha gbara Inec maka asambodo ya ụbọchị iri na ise nke ọnwa Mee.

Ụlọikpe gbakwụnyekwara otu pati Peoples Democratic Party (PDP) dịka ndị okwu ahụ metụtakwara.

Cheta na agbakwubunyere Nwachukwu Clement nke KOWA Party, Precious Nwadike nke United Progressive Party, UPP, Uche Ibeh nke Labour Party, nakwa APGA.

CJTF atọhapụla ụmụaka 874 gụnyere ụmụaka nwaanyị 106

Image copyright Getty Images

Otu ndị nche nkịtị so ebu agha megide Boko-Haram a kpọrọ 'Civilian Joint Task Force' na Bekee atọhapụla ụmụaka 874 gụnyere ụmụaka nwaanyị 106 ha ji arụ ọrụ na Maidguguri, isi Obodo Borno steeti.

Kemgbe ọnwa Septemba afọ 2017 CJTF bụ otu so na otu United Nations gụnyere na otu na-emegide ikike dịrị ụmụaka site iji ha arụ ọrụ binyere aka n'akwụkwọ ịkwụsị nke a, ha atọhapụla ụmụaka ruru 1,727.

Onye nnọchịte anya Ụnicef na Naijiria bụ Mohamed Fall, toro CJTF maka ịzọbụ ụdị ụkwụ a.

Fall onye sokwa na onyeisi oche na otu ọrụ United Nationa na-enyobanye anya n' okwu ịkpagbu ụmụaka kwuru sị, "Tinye uchu na ichekwa ikike dịị ụmụaka bụ ihe kwesịị ka eto ma kwalite."

Ogbugbu mmadụ n'Ebonyi steeti

Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Samuel Ortom gọvanọ Benue steeti

Ka na-ekwu ka na-ekwu o, na Benue steeti, Gọvanọ Samuel Ortom enyela Eze obodo Ado nọ ketere Ebonyi steeti abalị asaa iji chọpụta ndị aka ha dị n'ogbugbu mmadụ anọ ndị Ebonyi steet.

Ọ dọrọ aka na ntị na Eze obodo ọbụla achọpụtara na-ezochi ndị omekome, na ya ga-amachipu ha.

Egbe ọnụ ndị China na US

Image copyright Getty Images

N'ofesi, anyị abata ebe mba US na China na-egberikọta onwe ha egbe ọnụ maka azụm ahịa.

US bugoro utuisi ngwaahịa China sịte na pesenti 10 ruo pesent iri abụọ na ise. Obi adịghị China mma maka nke a dịka ha n'eche ihe ha ga-eme US.

Arsenal 4 - 2 Valencia

Image copyright Reuters
Nkenke aha onyonyo Mgbe Alexandre Lacazette nke Arsenal nyere goolu nke abụọ ha

N'egwuruegwu e, ụmụibe dịka Chelsea na Frankfurt gbara onwe ha otu ọkpụ onye laba onye laba, Arsenal enwerela ọkpụ anọ asatara abụọ nyụọ Valencia anya n'abalị ụnyahụ.

Nke pụtara na Chelsea na Arsenal ga-akwata ya na agba nke ikpeazụ n'egwuruegwu Europa league.

Gee Nkeji anyị ebe a

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Akụkọ ga-amasi gị

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a