Christian Chukwu nọ n'ugboelu ugbua na-aga ụlọọgwụ na London

Christian Chukwu Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Chiarman Christian Chukwu

Onye nchịkọta egwuregwu bọọlụ bụ Christian Chukwu, na-arịa ọria gwara BBC Igbo na ya nọzị n'ugboelu n'ụtụtụ a n'iji gaa ụlọọgwụ ga-agwọ ya bụ ọrịa na London.

Ị ga-echeta na Femi Otedola kwetara ịkwụ ụgwọ ụlọọgwụ ruru $50,000 maka ọrịa Christian Chukwu.

Chuwku gwara Ebere onye ntaakụkọ BBC Igbo n'ekwenti na aha ụlọọgwụ ya na-aga bụ St John and Elizabeth hospital na London.

Gere okwu ya ebe a:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionChristian Chukwu agawala ala Bekee ịnata ọgwụgwọ

Mana ọ matabeghi ihe na-arịa ya kpọmkwem.

Akụkọ ga-amasị gị

Isiokwu Ndị Emetụtara

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a