Rochas Okorocha: Ndị omeiwu Imo achụọla ndị niile Okorocha were n'ọrụ ka ọ na-apụ

Akụkọ dị mkpa

Achụọla ndị Okorocha were ọrụ gbanụ gbanụ

Ụlọ omeiwu steeti Imo akagbuola ọkwa ọchịchị gbanu-gbanu niile ọchịchị Rochas Okorocha mere ka ọnwa Maachị afọ a gachara.

Ụlọ omeiwu a n'ọgbakọ ha nwere n'ụbọchị Monde bụ ụbọchị atọ nke ọnwa Juun gwakwara ọchịchị ọhụrụ enwere na steeti Imo ka ọkpọtụrụ otu ọrụ na-ahụ maka mpụ bụ EFCC nakwa ụlọ ọrụ ndị ọzọ iji natacha ego niile ha sị na- ezukọrọ na steeti ahụ.

Ụlọ omeiwu ahụ gakwara n'ihu ma kagbuo atụmatụ nhọpụta nke otu "board" dị iche iche nke ọchịchị Okorocha mere.

Ka osila dị, ụlọ omeiwu a mekwara ka amata na ha akwụsịtula ndị isi oche otu council 27, ndị osote ha nakwa ndị Councilor enwere na steeti Imo ọrụ n'ihi erubeghị isi nye iwu ụlọ omeiwu a.

Ha gwaziri ndị DAGs nọ n'okpuru ọchịchị ime obodo ka ha weghara ọchịchị council ka ọ dị ugbu a.

Nkenke aha onyonyo Ndị ọchịchị ime obodo na-eme ngaghari iwe n'Owere

Ndị agha Sudan awakpola ndị na-eme ngagharị iwe

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionỌda egbe na-ada ka a na-achụsa ndị na-eme ngagharị iwe

Ndị agha na mba Sudan gbara mmadụ iri na atọ tọgbọrọ ka ha gara itisa ndị na-eme ngagharị iwe maka iwelata ọchịchị n'aka ndị mkpọrọ.

Ndi agha were ọchịchị na mba ahụ kemgbe achụrụ Omar Al-Bashir n'ọkwa

Jay-Z sozi na nd bụ ide ego nwere ijeri dọla

Jay-Z bụ onye oti egwu mbu nwere ijeri dọla n'aka, dịka ọlụ ntaakụkọ Forbes siri kwuo.

Dịka Forbes dere, ọbụghị sọ nanị egwu ka Jay-Z jiri kpata ego ya.

Jay-Z na-ere akwa site na akara ya ọ kpọrọ "Rocawear, nwe ebe a na-eti egwu na internet akpọrọ Tidal, ma nwekwa Roc Nation - ebe a na-ahazi egwu na nwaga egwuregwu dị iche iche.

Aka akpara nwaanyị gburu nwa ya

Image copyright Getty Images

Aka ndị uweojii akparala nwaanyị asị gburu nwa ya nwaanyị dị obere n'obodo Amankanu Amuri dị n'Enugwu Steeti.

Ozi ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Enugwu bụ Ebere Amarizu zitere BBC Igbo kwuru na nwaanyị a n'ogogo afọ iri atọ ebe nwa ya dị otu afọ na ọnwa ise.

Asị na nke a mere n'ụbọchị iri atọ nke ọnwa Mee.

Amaraizu sị nyocha ka na-aga n'ihe ịmata ihe mere nwaanyị a ji gbuo nwa ya bụ nke ọ na-enyere ndị uweojii aka na n'ime nyocha.

Kọmishịọna ndị uweojii n'Enugwu Steeti bụ Sulaiman Balarabe enyela iwu ka ndị uweojii ngalaba nyocha sie imi n'ala chọpụta etu nke a si mee.

Dịka ọ dị ugbua e dosala ozu nwata nwaanyị a n'ụlọ ozu Agbani dị n'Enugwu Steeti.

Onyeisiala Buhari ahapụla Saudi Arabia

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo O mebeghi otu izuụka Buhari si Amerịka ebe ya na Donald Trump nwere ọgbakọ lọta.

Onyeisiala Buhari ahapụla mba Saudi Arabia bụ ebe ọ gara ọgbakọ iri na anọ nke ndị otu a kpọrọ Organisation of Islamic Cooperation mere.

N'ọgbakọ ahụ Buhari kelere ndị otu a maka mbọ ha na-agba iji hụ e chekwara ọdọ mmiri Chad ka ọ ghara imebi.

Pope Francis arịọla mgbaghara

Image copyright Reuters

Onyeisi ụka Katọlik n'ụwa niile bụ Pope Francis arịọla ndị obodo Roma dị na mba Romania mgbaghara maka ịkpaoke na mmegbu emere ha n'ime ọtụtụ afọ.

Pope Francis bụ onye rịọrọ arịrịọ a n'aha ụka Katọlik niile mgbe o mere njem nleta na mba ahụ.

Onweghi nwaanyị m bara n'ike - Neymar

Image copyright Getty Images

Nwafọ Brazil na-agba bọọlụ bụ Neymar agọrọla ụkwụ na aka ya n'ebubo na odinara otu nwaanyị n'ike n'obodo Paris

Ndị uweojii wepụtara sị na otu nwaanyị na-arụ Neymar na ọ bara ya n'ike n'ime ụlọ ndịna France bụ ebe ọ na-agbara PSG bọọlụ.

Nwoke liri nwa ya na Ndụ

Nkenke aha onyonyo Loverth Odah - Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Ebonyi steeti

Ka anyị bido n'Ebonyi steeti ebe otu nwoke akpọrọ Anthony Sunday ji aka ya lie nwa ya nwaanyị dị ọnwa ise na ndụ.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Ebonyi steeti bụ Loveth Odah gwara ndị nta akụkọ nke a ebe ọ nọ kwuo na ya bụ nwoke sị na ọ bụ ọnwụnwụ tinyere ya n'ọnọdụ ahụ.

Aisha Buharị akụwa akị oyibo ndugbe

Image copyright Twitter/AishaBuhari

Ụnụ anatakwara ego enyemaka gọọmenti ruru naira puku iri ?

Onye na-ajụ?

Aisha Buhari, mgbe ọ gara njem nleta na ogbe ndị gbara ọsọ ndụ na Kastina steeti ụbọchị Satụde. Ndị ahụ zara ya oolo na ya bụ ajụjụ.

Trump ekwuo ọzọ

Image copyright Getty Images

N'ofesi, mba Amerika a nawala mmadụ ọkpa agwọ.

Gịnịkwa ọzọ?

Onyeisiala Trump si onye ọbụla ga-abịa mba ahụ ga-ebiputa nkata niile dị na sochal midịa ya ruo afọ ise ma were ya bịa maka ajụjụ ọnụ visa ha.

Andy Ruiz kụpụrụ Anthony Joshua mkpụru ọkwụrụ n'anya

Image copyright Reuters

N'egwuruegwu, ọ dịkwa ka aka ji Liverpool kemgbe afọ iri na anọ ahapụla ha.

Liverpool ji okpụ goolu abụọ zuo Tottenham ike n'ahụ maburu iko Championship, ebe Andy Ruiz kụpụrụ Anthony Joshua mkpụrụ ọkwụrụ n'anya wee turu ụgọ n'egwuruegwu ọkpọ mbaụwa.

Andy meriri Joshua na agba nke asaa ka o tituchara ya n'ala ugboro anọ.

Nke a mere ka Andy bụrụzịa ọkaibe na ọkpọ n'ogogo nke "heavyweight".

Ndị mmadụ na-eche na ume Andy ezughị imeri Joshua, mana ihe meziri gbagwojuru onye ọbụla anya.

Nkeji ụtụtụ

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ịkọ mgbe niile

Akụkọ ga-amasị gị

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a