Abacha loot: A hụla ijeri naira 82 ego Abacha zufuru n'ala bekee

Akụkọ ndị dị mkpa:

Abacha loot: A hụla ijeri naira 82 ego Abacha zufuru n'ala bekee

Sani Abacha Image copyright AFP/GEtty
Nkenke aha onyonyo Abacha nwụrụ n' oche ka onyeisiala Naịjirịa n'afọ 1998

Ụlọikpe mba Briten ejichiela ego ruru ijeri naira 82(nde paụnds 211) bụ ego Sani Abacha zufuru site n'ụlọakụ dị na Jersey dị na Channel Island..

Dịka akwụkwọ akụkọ Metro.Uk siri depụta, Abacha onye chịburu Naijiria bido afọ 1993 rue 1998 zipụ ego site na ụlọakụ mba Amerịka.

Ha kwuru na ọ bụ n'aha British Virgin Islands a kpọrọ "Doraville Properties Corporation,'" ka e tinyere ego ahụ.

Cheta na n'afọ 2018, gọọmenti mba Swizzerland nyeghachiri Naijiria nde paunds 300 bụ ego Abacha zupụrụ.

Miyetti Allah: Akụkọ na ndi ọchị ehi na-achọ ịwakpo ala Igbo bụ ụgha

Gidado Sidikki Image copyright Gidado Sidikki

Onye isi otu jikọrọ ndị Fulani na-achị ehi a kpọrọ Miyetti Allah nke mpaghara Ọwụwa-Anyanwu Naijiria ekwuola na akụkọ na ndị Fụlani ọchịehi na-akwado iwakpo ala Igbo bụ ụgha.

Gidado Sidikki, onye kwuru nke a na mkparitauka ya na BBC Igbo sịrị na ndị ọchịehi nọ n'ọwụwa anyanwụ Nigeria enweghi nsogbu ọbụla maka na ha Ndigbo na-ebi n'udo.

Sidikki kwukwara na ọ bụrụ na ndị gọvanọ steeti ndị ọzọ di na Naijiria ga na-eme ka ndi ogbo ha nọ n'Ọwụwa anyanwu, agaghi enwe tigbuo-zọgbụo nile ndị a a na-aṅụ maka ya ebe nile.

Ndị Fulani na-achị ehi Image copyright Getty Images

O kwukwara na emume Sala gara nnọọ nke oma na mpaghara Ọwụwa-Anyanwụ n'ihi na ndị gọvanọ nyere ha nchekwa pụrụ iche nakwa ihe ndị ọzọ dị mkpa.

Abaribe: Ihe Ndigbo chọrọ bụ ka e mee anyị ka e mere ibe anyị

Enyinnaya Abaribe

Senetọ na-anọchịte Abia-South n'ụlọomeiwu ukwu bụ Enyinnaya Abaribe ekwuola na ihe kachasị Ndigbo mkpa na Naijiria bụ ka e mee nwata ka e mere ibe n'okwu gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị, ikpemkwụmọtọ na nchekwa.

Abaribe onye kwuru nke a na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere na nsonso onye jiri Boko Haram na Ipob maa atụ tụrụ arịrị na ndị agbụrụ ndị ọzọ mee ihe ahapụ ha mana Igbo mee ihe, ọ pụọ iche.

Kano State Anti-Corruption Commission: Chụtuonu Sanusi n'ọkwa Emir

Emir Sanusi na Ganduje Image copyright @Dawisu
Nkenke aha onyonyo Emir Sanusi na Gọvanọ Ganduje edoziela ka ọ bụ ọchị abụ ụtọ?

Ngalaba gọọmenti Kano na-ahụ maka mkpesa banyere nrụrụaka tụnyeela alo ka akwụsị Emir Kano bụ Sanusi Lamido Sanusi ọrụ n'ike.

Ha na-ebo ya ebubo imefu ijeri N3.4 bido n'afọ 2014 rue 2017.

Mana n'agbanyeghị nghọtahie a dị n'etiti Sanusi na Gọvanọ Kano bụ Ganduje, ha abụọ kerele onwe ha nke ọ ma n'emume oriri Eide Fitr nke Sanusi nọ n'isi ya taa bụ.

Cheta na gọọmenti Kano steeti kewapụtara alaeze (emirate) anọ ọhụrụ ebe ọ bụbu naanị otu na steeti ahụ nke ọtụtụ ndị mmadụ na-arụtụ aka bụ iji kwalata Sanusi nku.

Emir Sanusi na Gọvanọ Ganduje Image copyright @Dawisu
Nkenke aha onyonyo Emir Sanusi duru ndị bịara maka emume Eide fitri n'ofufe ụbọchị Tuzde

Sanusi dịka Emir nke 'Kano Metropolitan Area' bụ onye duru ndị ụka alaụka nọ na Kano n'emume Eide Fitr nke afọ a.

N'egwuregwu,

Johanna Konta Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Konta emeribeghị n'asọmpi a sọrọ na Roland Garros tupu asompi nke afọ a

Johanna Konta nke mba Briten emeriela Sloane Stephens were banye n'agba nke ọkara ikpeazụ n'asompi French Open.

Konta onye dị afọ iri abụọ na asatọ ga-ezute Petra Martic nke mba Croatian maọbụ arketa Vondrousova nke mba Czech n'asompi na-abịa.

Gee akụkọ ndị a n'otu nkeji ebe a:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Willie Obiano ekpogharịala ndị ọrụ gọọmenti

Obiano Image copyright GovernorObianoFacebook
Nkenke aha onyonyo Obiano meriri na ntuliaka ha mere n'afọ 2017 we bụrụkwa gọvanọ nke ugboro abụọ

Ka anyị bido n'Anambra steeti ebe Gọvanọ Willie Obiano kpoghariri ndị ọrụ kọmishona steeti ahụ ụnyahaụ bụ Monde.

Obiano sị na ọbụghị maka amaghị eme ka ya ji mee nke a kama ọ bụ ka uchu wee batakwa n'ọrụ ọzọ.

Mike Okonkwo onye nọbụ Minịstri na-ahụ maka gburu gburu nọzị Ministri arụm ụlọ ebe Emeka Ezenwanne ga na-ahụzị maka ụmụ akụrụngwa ọha mmadụ ji enyere ndụ aka a kpọrọ 'public utilities' n'asụsụ bekee.

N'otu aka ahụ, Obi Nwankwo bụzị kọmishona na-ahụ maka gburu gburu, Nnamdi Onukwuba ga na-elekota ihe gbasara ọrụ ubi, Afam Mbanefo ga na-ahụ maka ikwalite ndị ntorobia nakwa akụnụba obodo, ebe Bonaventure Enemali na-elekọtazi ihe gbasara ala.

Obiano nyere ndị kọmishọna ọhụụ ahụ izuuka abụọ i ji hazie onwe ha ma bidokwa ọrụ na egbughị oge ọbụla.

Ndị isi na-ekele ndị ụka Alakụba

Chukwuemeka Ihedịoha, Bukola Saraki na ndị isi ndị ọzọ ekelela ndị ụka alakụba maka mmemme ha na-eme taa bụ Eid-Mubarak:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media caption'Na anyị bụ ndị Igbo emeghị ka anyị ghara ịbụ ndị ụka alakụba'

Buhari ekweghị maka uweojii steeti

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Buhari o ga-enwe ike merị Boko haram?

Geenụ nti o, Onyeisiala Muhammadu Buhari sị na onwekweghị mgbe ya ji tinye aka n'akwụkwọ ka ndị steeti obula nwee ndị uweojii nke ha o.

N'aka twitter ya, onyeisiala nyere ọnwa atọ iji lebe anya na ya bụ akwụkwọ nchọpụta edere maka ịhazigharị mpaghara uweojii akpọrọ SARS.

Trump na May ga-ahụ taa

Image copyright Getty Images

Nke na-akpọtụ na mba ụwa taa bụ na Onyeisala mba Amerika bụ Donald Trump ga-enwe mkparịta ụka miri emi ya na Ogbo ya nke Briten bụ Theresa May.

Ha ga-akpa ọtụtụ ihe nke gụnyere mgbanwe mbara ihu igwe Bekee kpọrọ "climate change" taa bụ abali nke abụọ Trump batara UK

Senegal ekwojiela Eagles nku

Image copyright NFF

N'egwuruegwu, ndị egwu bọlụ Senegal akajiela Flying Eagles nku n'ike na asọmpị Fifa ndị erubeghị afọ iri abụọ.

Senegal ji ọkpụ goolụ abụọ asatara otu dulaa Eagles na ya bụ asọmpi.

Akụkọ ga-amasị gị

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a