Kidnapped Turkish men: A zọpụtaala ndị mba Turkey mmadụ anọ a tọọrọ

Akụkọ ndị dị mkpa taa bụ Fraide (26/7/2019):

A zọpụtaala ndị mba Turkey mmadụ anọ a tọrọ

Image copyright Nigeria Police Force
Nkenke aha onyonyo Ndị Turkey a zọpụtara na Kwara steeti

Ndị uweojii na Kwara steeti kwuru na ha azọpụtala ndị mba Turkey mmadụ anọ ndị ntọ tọrọ na steeti ahụ.

Onyeisi ndị uweojii na steeti ahụ bụ Kayode Egbetokun gwara BBC na azọpụtara ha n'ime ọhịa ụbọịchị Friade, abalị 26 nke ọnwa Julai afọ 2019.

A nwụchiburu otu onye n'ime ndị ntọ ahụ ụbọchị Tọzde, ma nwetakwa ndị ogbo ya abụọ ụbọchị Fraide., nke mere ka ndị otu ha tọghapụ ndị ha ji.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionMaazị Usman Chinedu Mbaekwe gwara BBC Igbo ihe ọ gabigara n'aka ndị ntọ.

A tọrọ Senerapal dị afọ 40; Seyit Keklik dị afọ 25; Yasin Colak dị afọ 33 nakwa Ergun Yurdakul dị afọ 35 bụ ndị ọrụ ụlọọrụ na-ewu ewumewu n'ụbọchị Satode gara aga ebe ha na-aṅụ mmanya n'ime obodo Gbale dị n'okpuru ọchịchị Edu, na Kwara steeti.

Ndị ntọ ahụ kwuburu ka e nye ha nde narị naira anọ , mechaa, gbadata na otu narị nde naira. Mana onyeisi uweojii kwuru na o nweghị ego a kwụrụ ha.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionKidnappers: Ndị ntọ asaala asịsa

Ị hụla mpụtara WAEC ị lere n'ọnwa Mee na Juun?

Image copyright Getty Images

Igwe mmadụ amalitela nchọpụta mpụtara ule WAEC ha lere n'ọnwa Mee nakwa Juun n'afọ a.

WAEC kpọrọ oku ka ndị mmadụ gaa mee nchọpụta mpụtara ha site n'akara Twitter ha.

Ha gosikwara usoro ndị mmadụ ga-esi mee nchọpụta a n'ịntanetị.

Lee ihe ha kwuru n'ịchafụ ebe a

  • Gaa na site ha bụ waecdirect.org
  • Denye akara njirmara ule gị n'ebe a ga-egosi gị
  • Họpụta afọ i lere ule gị
  • Họpụta ụdịrị ule ị lere
  • Depụta ọnụọgụgụ dị na kaadị (ị ga-azụta)
  • Depụta ọnụọgụgụ nzuzo kaadị gị
  • Ị tinye ihe niile a, ị zipu ya site n'ụzọ ha gosiri ebe ahụ.

NYSC agbarụọla ihu maka asambodo adịgboroja si mahadum dị n'Afrika

Image copyright @nysc_ng
Nkenke aha onyonyo Ụfọdụ ndị Naịjirịa na-ekwu na ife ala nna adịchaghị oke mkpa tụmadị ọbụrụ na a ga-akọga ụmụ mmadụ na steeti na abụghị nke ha.

Ngalaba gọọmenti na-achịkọta ndị na-efe ala nna ha bụ NYSC agbarụọla ihu dịka ha na-ebo ebubo na ụfọdụ mahadum n'Afrịka na-eresi ndị Naịjirịa etozughi etozu asambodo.

Ha kwuru na n'ọdịnihu, sọsọ mahadum ndị ụlọọrụ Naịjirịa na mba Afrịika dị icheiche nyochara ka ha ga anabata.

Na mba ofesi,

Image copyright Getty Images

Mba Kenya ekwetala na ha ga-agụkọ nwoke, nwaanyị na ndị abụghị nwoke maọbụ nwaanyị na mba ha dịka ha na-akwado ibido ngụkọ mmadụ n'ọnwa Ọgọst.

N'egwuregwu,

FIFA amachiela otu onye ọrụ ngalaba bọọlụ na Sierra leone bụ Abu Bakarr Kabba ma daa ya nha dọla puku iri ise ebubo ịna aka azụ na nrụrụaka ndị ọzọ n'ihe gbasara bọọlụ.

Gee Nkeji ebe a

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionBBC Nkeji

Ozil na Kolasinac agbalahụla ndị ohi

Image copyright Press Association
Nkenke aha onyonyo Kolasinac na Ozil

N'egwuregwu, ndị egwu Arsenal abụọ agbalahụla ọnwụnwa ndị ekperima abụọ chọrọ ịwakpo ha na London.

Akụkọ na-ekwu na onweghị ihe mere Mesut Ozil na Sead Kolasinac ebe ndị uweojii London ka na-achọ ndị mere ihe ahụ.

Ozil ji ụgbọala ya bụ Mercedes G Class 4x4 na ebe akpọrọ Golders Green Road mgbe ndị ohi ji ọgbaatumtum wakporo ha.

Mgbe ihe mere, Ozil hapụrụ ụgbọala ya gbaba n'otu ụlọnkwarị ebe a na-ere nrị ndị mba Tọọkị akpọro Likya ebe Kolasinac majawara ndị ahụ.

Ndị na-ere nri ebe ahụ bịara nyere ha aka chuwa ndị ekperima ahụ.

Onyeisiala Muhammadu Buhari ga-abata taa

Muhammadu Buhari Image copyright Facebook/Femi Adesina

Onyeisiala Muhammadu Buhari nọ mba Liberia bụ ebe ọ ga-esonyere gọmenti mba ahụ n'emume ncheta mwere onwe ha.

Dika akwụkwọ ọkụekwe ya bụ Garba Shehu tinyere aka, Buhari ga adabatakwa Naịjirịa taa bụ Fraịde.

Ogbunmigwe agbala n'ogige IDP na Maiduguri

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ihe karịrị mmadụ nde abụọ bụ ndị bere ka ugo na-enweghị ebe obibi maka mwakpo Boko Haram, dịka ngakaba UNHCR si kwuo

Akụkọ na-eru anyị ntị bụ na ndị a na-eche na ha bụ Boko Haram gbara ogbunigwe n'ebe ndị gbara ọsọ ndụ na-anọ n'obodo Dalori dị nso na Mahadum Maịduguri.

Otu nwata akwụkwọ nọ na Mahadum Maịduguri kwuru na mgbọ tụrụ ụmụakwụkọ abụọ na- ekpe ekpere n'ime Mahadum ahụ.

EU achawala Boris Johnson ọkụ

Image copyright @BorisJohnsonTwitter

Dịka Boris Johnson malitere ọru ka Praịm Minsita nke Mba Briten ndị EU agwala ya na ha aghịdị ege ya ntị maka atụmatụ o wepụtara maka Brexit

Maazi Johnson chọrọ ka ahazigharịa nkwekọrịta Briten na EU nwere maka ọpụpụ ha na otu ahụ.

Gee akụkọ ndị a niile n'otu nkeji

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionBBC Nkeji

Akụkọ ga-amasị gị