Insecurity: Anyị ga-enye onye Igbo ọbụla nwere mmasị ichi ehi nkwado

Ọwụwa anyanwaụ Image copyright Presidency/Twitter
Nkenke aha onyonyo Ndị gọvanọ ọwụwa anyanwụ Naịjirịa

Gọvanọ ise ndị ọwụwa-anyanwụ ekụliela n'ọgbakọ mbụ ha nwere kemgbe ọnwa Mee mkpụru ụbọchị iri abụọ na itoolu ha nweghara ọchịchị.

Ha tinyere ọnụ na ọkpụrụkpụ okwụ ụfọdụ metutere steeti ọwụwa-anyanwụ nke gụnyere nchekwa, Ruga, akụ na ụba nakwa ihe ndị ọzọ.

Ndị nọ na ya bụ ọgbakọ bụ Gọvanọ Ugwuanyi (Enugwu steeti), Okezie Ikpeazu (Abia), Osote gọvano Anambra na Imo steeti bụ Nkem Okeke nakwa Gerald Irona.

Ndị gọvanọ a kwekọrịtara ihibe kọmiti ga-elebe anya n'ọrụ nchekwa bụ nke a ga-ehibe otu ndị nche ọrụ ha bụ ilekọta ndị nche n'ime ọhịa na ụzọ niile dị n'ọwụwa-anyawụ gbaa gburugburu.

N'ozị ọ gụpụtaara ndị nta akụkọ, onyeisioche nzụkọ ahụ bụ Gọvanọ Ebonyi steeti bụ Dave Umahi, kwuru na ndị otu a ga na-agba ama maka ọnọdụ nchekwa na steeti ndị a.

Ha sị na ndị kọmiti a ga-ahụkwa maka nchekwa ọnwa, paịpụ, mmanụ agbidi gafere ala Igbo.

Ha kwusikwara ike na ọwụwa-anyanwụ enweghị ala maọlị maka ogige ndị ọchịehi akpọrọ Ruga.

Umehi kwukwara na gọmentị ha ga-akwadọ onye ọbụla nwere mmasị na ọrụ ịkpa ehi, ezi, osikapa nakwa akụkụ ubi ndị ọzọ.

Ha gwara ndị ọbụla nwere mmasị n'ọrụ ndị a gaa na steeti ha dị icheiche maka nke a.

Nzuko a kwara arịrị maka ọnọdụ ọdọụgbụelụ Akanu Ibiam International bụ nke dị n'Enugwu bụ ebe ha kpọkuru gọmenti etiti ka ha gbatara ha ọsọ enyemaka.

Ha jakwara Gọvanọ Ugwuanyi ike maka mbọ ọ gbara n'ihu na ya bụ ọdọụgbụelụ ka na-arụ ọrụ ugbua.

Ndị gọvanọ a jikwa ohere a kpọkuo gọmenti etiti ka ha bịa mezie okporoụzọ awara-awara nke Enugwu-Ọnisha, Enugwu-Pọtakọtụ, Okigwe-Owerri nakwa Owerri-Umuahia dịka ha kelere ha maka ọrụ ha n'akwammiri nke abụọ oshimiri Naịja.

Akụkọ ga-amasị gị

Lee ihe nkiri anyị ebe a

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionEtu esi ahazi Ji Kpacha