Uloma Rochas: Anyị ji "search warrant" gaa ụlọahịa nwunye Rochas Okorocha

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionEbubo na ụta na-aga n'ihu maka ihe mere na ụlọahịa nwunye Rochas Okorocha

Ebubo na ụta na-aga n'ihu maka ihe mere na ụlọahịa nwunye Rochas Okorocha bụ Nneoma Okorocha n'Owerri.

Ọ bụ ebe ahụ ka Kọmiti na ahụ maka ịnapụta akụ na ụba Imo steeti ndị mmadụ buuru laa na mgbe gara aga.

Ada Rochas Okorocha bụ Uloma Rochas-Nwosu onye nọ n'ụlọahịa ahụ mgbe ihe a mere na ụbọchị Fraide kwuru na ndị ọrụ ahụ ejighị ezigbo akwụkwọ ụlọikpe nyere bịa.

O kwukwara na otu onye n'ime ndị ahụ bịara ya bụ njem mara ya akantị nke onyeisi ndị kọmitii ahụ bụ Jasper Ndubuaku gọrọ.

Ndubuaku kwukwara na ndị otu ha wetere akwụkwọ ikike na ụlọikpe magistrati nke dị n'Owerri were mee ya bụ njem.

Image copyright Uloma Nwosu

Ụlọma sị na-okwu dawaara ha mgbe ọ sị ha weta akwụkwọ nyere ha ikike ịbịa na ya bụ ụlọahịa, mana akwụkwọ ha gosiri ya ejughị ya afọ.

BBC gbakwara onye ọkaiwu bụ Malachy Ugwumadu ajụjụ ka ọ gwa anyị ihe kwesiri ịdị na akwụkwọ ikike "search warrant".

Ugwumadu kwuru na ezigbo 'search warrant' kwesiri isi n'aka ezigbo ụlọikpe ma buru aha onye e ji maka ya nye ya nakwa ebe e ji maka ya nye ya.

Ọ bụrụ na edehie aka na otu n'ime ihe ndị a, ọ bụghị ya.

Gee ọnụ okwu Ugwumadu:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionOnyeokikpe kọwara ihe bụ sachi waranti

Nke a bụ akwụkwọ ikike Uloma sị na ndị kọmitii ji bịa n'ụlọahịa ya

Image copyright Uloma Nwosu

Lee ihe nkiri nwereike ịmasị gị

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionEtu esi ahazi Ji Kpacha

Akụkọ ga-amasị gị