South East Governors: 'Anyị ga-akpụlata Nnamdi Kanụ ma ndị Ipob metụ onye ọchịchị ala Igbo ọzọ aka'

Governor David Umahi na Nnamdi Kanu Image copyright Twitter/@GovDavidUmahi

Otu jikọtara ndị gọvanọ Ọwụwa Anyanwụ ekwuola na ha ga-akpụlata Nnamdị Kanụ ala Naịjiria ka e kpee ya ikpe ma ọ bụrụ na ndị otu ya bụ Ipob metụ onye ọchịchị ala Igbo ọzọ aka.

Otu ahụ kwupụtara nke a site n'akwụkwọ ozi nke onyeisi ha bụ gọvanọ David Umahi nke Ebonyi steeti wepụtara ụbọchị Tuzde.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionIhe ndị ntoroọbịa chọrọ ka ndị gọọmenti mere ha

Umahi kwuru na mba Kanu bara gbasara ịwakpo ndị gọvanọ ma ha bịa mba ofesi bụ mkpọtụ nkịti ka nwa amadị ahụ na-eme.

" Anyị na-adọ aka na ntị na onye Ọwụwa Anyanwụ ọzọ a wakporo ebe ọbụla n'ụwa niile, anyị ka akpụlata Nnamdị Kanu ka ndị mmadụ ṅaa ntị ya n'ọkụ.

"Ọ bụ ara na onye chọrọ ọchịchị na enweghị ihe ọ ma maka ya na-eche na anyị a bụ ndị gọvanọ ga-akwado ogbugbu ndị ndị be anyị maọbụ were ala ezughị ezu nyefee ndị ọchịehi."

Image copyright South East Governors Forum

Ha gakwara n'ihu ma kwuo na ọ bụụ na Kanu ji obi ya niile ekwu ihe ọ na-ekwu ya buru agha bugara ndị ọchiehi ogbu ọchụ na mba 100 o kwuru na Ipob gbanyere mgbọrọgwụ.

N'aka nke ọzọ ndị gọvanọ ọwụwa anyanwụ rịọkwara onyeisiala Muhammadu Buharị ka ọ gbatịkwuo oge e nyere tupu e mechie ọdụ ụgbọelu Akanu Ibiam nke dị n'Enugwu.

Ha kwuru na nke a ga-enye ha ohere ịwepụta atụmatụ ndị ọzọ ga-enyere ndị njem ụgbọelu aka na mpaghara ahụ.

N'akwụkwọ ozi ha zipụtara ụnyaahụ, ndị gọvanọ ahụ chọkwara ka a machie ndị ọchịehi ịkpụ ehi na-akpagharị n'okirikiri ala Igbo.

Ha kwuru na nke ahụ na-akpata nsogbu nakwa ọgbaaghara n'obodo.

Ndị mịnịsta ga-ebido ọrụ taa

Image copyright Twitter/Bashir Ahmed
Nkenke aha onyonyo Ụfọdụ ndị mịnịsta ọhụrụ.

Taa ka a ga-edu ndị mịnịsta onyeisiala Muhammadu Buhari họpụtara n'iyi ọrụ ma kwuputakwa ngalaba gọọmentị ha ga na-elekọta.

Nke a na-abịa dịka ndị mịnịsta ọhụrụ a nwechara ntụgharị uche abalị abụọ ebe a nọrọ kụziere ha usoro nakwa etu e si arụ ọrụ na gọọmentị.

Na mmechi ntụgharị uche ha n'Aso Rock Abuja ụnyaahụ, Buhari dọrọ ndị mịnịsta ahụ aka na ntị ka ha tinye uchu n'ọrụ ha iji mee ka ndị dịwanyere ụmụ Naịjiria mfe.

Ọ gwakwara ha ka ha ghara ịkpa iche n'ọrụ ha n'ihi na gidigidi bụ ugwu eze.

Kadịnal ga-aga mkpọrọ

Image copyright Reuters
Nkenke aha onyonyo Kadịnal George Pell nwere ike ịnọgide na mkpọrọ ruo afọ 2022

N'ofesi, ụlọikpe mkpesa na mba Australia ekwuola na ikpe a mara George Pell, onye ji ọkwa "Cardịnal" n'ụka Katọlik, maka imetọ ụmụntakịrị nwoke abụọ n'afọ 1996, bụ ihe ziri ezi.

E boro Pell ebubo na o metọrọ ụmụntakịrị ahụ n'afọ 1996 nakwa 1997.

Ụlọikpe nta mara ya ikpe n'ọnwa Maach afọ a ma tụọ ya mkpọrọ afọ isii, mana Pell gbaghara mkpebi ahụ n'ụlọikpe mkpesa.

Ọkaikpe atọ nyochara ya bụ ikpe, abụọ n'ime ha wee kweta na ikpe mara Pell n'eziokwu.

Nke a pụtara na Pell ga anọ n'ụlọ mkpọrọ afọ isii ma ọ bụrụ na ụlọikpe ukwu nke Australia kwado ikpe a mara ya.

Egwuregwu bọọlụ ụkwụ n'Ijipt

Image copyright Reuters

N'egwuregwu, otu na-achịkọta egwuregwu bọọlụ na mba ụwa bụ Fifa e hiwela otu gbata gbata ga-enye aka hazie egwuregwu bọọlụ na mba Egypt ruo afọ 2020.

Cheta na ndị isi otu na-elekọta egwuregwu bọọlụ n'obodo ahụ bụ Egypt Footbal Association gbara arụkwahịm n'ọnwa gara aga oge e dulara ha n'ike n'asọmpi iko mba Afrịka.

Buhari eduola ndị minista iyi ọrụ

Onyeisiala Muhammadu Buhari eduola ndị minista ọhụrụ n'iyi ọrụ ma tinye ha na ngalaba ha na-achịkọta.

Image copyright Twitter/Bashir Ahmed

Ụmụafọ Igbo dịka Uche Ogah nwetara ọkwa Minista steeti na-ahụ maka Nlekọta ngwuputa ihe dị n'ala, Sharon Ikeazor nwetara Minista steeti na-ahụ maka gburugburu, Emeka Nwajiuba nwetara Minista steeti na-ahụ maka Agụmakwụkwọ so n'ime ha.

Gụọ ya n'uju ebe a: Ogah, Ikeazor na Nwajiuba ketara ngwupụta ihe dị n' ala, gburugburu nakwa agụmakwụkwọ

Ebe Chris Ngige, Ogbonnaya Onu, na Geoffery Onyeama ka ji ọkwa ha jibu mbụ.

Ndị uweojii anwụchiela ndị otu ha anọ

Image copyright LAGOS POLICE COMMAND
Nkenke aha onyonyo Ndị uweojii a bụ ndị nọ n'ihe onyonyo ahụ

Ndị uweojii Legọs steeti anwụchiela ndị otu ha anọ maka igbu mmadụ abụọ ha jidere maka ebubo ohi ekwentị dịka ihe nkiri fegharịrị na soshal midia.

Bala Elkana bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Legọs steeti kwuru na ihe ndị uweojii ahụ mere megidere iwu ndị uweojii gbasara etu e kwesịrị isi lekọta ndị a nwụchiri a na-enyocha maka ihe ọbụla.

Ndị uweojii kwuru na ndị otu ha ahụ bụ Ịnspektọ Fabiyi Omomayara, Sajentị Olaniyi Solomon, Sajentị Solomon Sunday na Kọpọral Aliyu Mukaila, na-arụ ọrụ n'ụlọọrụ ndị uweojii dị n'Iba.

Cheta na nso nso a ndị ọha mmadụ na-eti mkpu maka etu ndị uweojii si egbu ndị mmadụ na eleghị anya n'azụ.

N'ofesi,

Mba Amerịka etinyela iwu ọhụrụ ga-ahụ na ndị mbịarambịara na-ejighi akwụkwọ bata nwereike ịnọgide na nnwụchi, taa nchara.

Image copyright Getty Images

N'egwuregwu,

Franck Ribery dị afọ iri atọ na isii ka na-akpa ike na bọolụ dịka o sonyere ndị otu egwuregwu Fiorentina n'efu.

Image copyright Getty Images

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionOsita Amakaeze: Ndị ntorobia chọrọ ndị ndu ga-ezi ha ụzọ ọma