Etu m si hapụ ọrụ ụlọakụ wee tụtụwa plastiki
Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi

Waste to Wealth: Etu m si hapụ ọrụ ụlọakụ wee tụtụwa plastiki

Ọrụ ụlọakụ so n'ọrụ kacha enye ego n'ụwa niile nke mere ọtụtụ ndị mmadụ ji achọ ya.

Mana Idu Okwuosa, onye si mba ofesi lọta Naịjiria, hapụrụ ọrụ ya n'ụlọakụ wee malite ịtụtụ plastiki ndị mmadụ tufuru n'okporo ụzọ.

Okwuosa kọwaara BBC Igbo etu o si ewere plastiki ndị a nyefee n'aka ndị ga-eji ya arụpụta ihe ọzọ.

O jikwa ya enye ọtụtụ ndị mmadụ ọrụ ha ji akpata ego ha ji egbo mkpa.

Ọrụ Okwuosa na ndị ọrụ ya na-enyekwa aka igbochi mkpamkpa idemmiri na-akpa n'obodo site n'iwepu ihe ndị na-anọchisi ọwa mmiri.

Akụkọ ndị ọọ ga-amasị gị: