End SARS: Ndị Naịjirịa amalitela iti mkpu 'End SARS' ọzọ

Ndị ọrụ SARS

Ndị Naịjirịa agbanyela aka n'isi ọzọ na-eti otiti sị ka a kwụsị ngalaba uweojii a kpọrọ SARS (Special Anti-Robbery Squad).

Nke ugbua malitere dịka otu onye boro ha ebubo ịnwụchi ya ma mee ya ka ọ bụ onye ohi ka ha kwụsịrị ya n'elu ọgbatumtum dịka o si n'ụlọ enyi ya nwoke alọta.

@Rayscode kọrọ etu ndị uweojii si nwụchikwaa nwaokorobịa ọzọ ha hụkwara n'ụzọ.

Nke a mere ka ndị mmadụ nọrọ na Twitter na-ekwuputa etu o si metụta ha, ma na-ekwu ka e mechie ngalaba SARS kpamkpam.

@SnowChiff kọwara etu e si maburu enyi ya n'Enugwu steeti, ma kwuo na ha amaghị ebe e bu ha gaa.

@hashtag2weets kwuru na ị bụrụ onye Naịjiria ma i soghi tie mkpu mmechi a, na gị mara na o nwereike irute gị mgbe ọzọ.

Pịa #EndSARS na Twitter ka ị hụ etu ndị mmadụ si kọwaa ihe ha gabigara.

Ọgụ chara n'etiti ndị ọkwọụgbọ tanka na ndị uweojii

Ndị uweojii Legọs steeti na ndị Presidential Task Force akọwaala ihe mere dịka ọgụ dapụtara n'ogige Lillyport dị na mpaghara Ijọra na steeti ahụ taa.

Akụkọ si ebe ahụ pụta kwuru na ọ bụ maka etu e si ana ndị na-anya tanka ụgwọ ụtụisi ha na-amaghị isi na ọdụ ya mere ka ha wee iwe, tụgharịa baa ndị uweojii ọgụ.

Dịka akụkọ a si kwuo, ọgụ a tara isi otu onye na-agara onwe ya, mana ndị uweojii ekweghị ekwu ma ọ bụ ka ọ bụ asị.

BBC kpọtụụrụ ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii na Legọs bụ Bala Elkana, onye kwuru na ndị otu ya amaghị maka ya, kama na ọ bụ ndị Task Force a ga-ama maka ya.

Ebe ndị nke Task Force na-ekwu na ọ bụ ndị uweojii Legọs steeti kwesịrị ikwu ihe gbasara ya.

Ozu mmadụ 39 a hụrụ na mba Briten

Image copyright Facebook
Nkenke aha onyonyo A kpọpụtala aha Mo Robinson, si mpaghara County Armagh, dịka ọkwọụgbọala bu ozu ndị ahụ

Akụkọ si mba Briten apụta na-ekwu na ozu mmadụ iri atọ na itoolu a hụrụ n'ime trailer n'obodo Essex ụnyaahụ, bụ nke ndị Chaịna.

Ndị uweojii anwụchiela Mo Robinson dị afọ iri abụọ na ise maka ịkwọ ụgbọala bu ozu ndị ahụ.

Egwu e birila ọkụ na Europa League

Ndị na-akwado otu egwuregwu Arsenal nakwa Man United ga-ama ma ha a ga-ebu ọnụ alaba ụra n'abalị a mgbe ha ga-agba n'asọmpi Europa League.

Ụzụ atụọ n'Enugwu maka ọkụ tanka n'akụkụ GOSHEM Estate

Egwu bara ndị mmadụ ahụ ụnyahụ mgbe otu tanka bụ mmanụ petrolu wufuru ụfọdụ mmanụ ya n'Estate ọhụru n'akụkụ GOSHAM n'Enugu dị n'Enugwu steeti.

Ya bụ akụkọ bịara na sochal media be ndị mmadụ na-eche na ya bụ ihe agbaghịzị aka.

Ọnye ntaakụkọ anyị ga-etere anyị ka ihe sịrị kwuru ebe ahụ.

N'aka ọzọ, dịka ọkọchị na-atụnye ụkwụ, gọvanọ Enugwu steeti bụ Ifeanyi Ugwuanyi akwala ndị ọrụ mmenyụ ọkụ na steeti ahụ ka ha kee nkwụcha maka ọkụ ọgbụgba.

N'ozi ahụ bụ nke odeakwụkwọ steeti ahụ bụ Simon Ortuanya gụpụtara ndị ntaakụkọ, gọvanọ gwara ndị ọrụ mmgbanyụ ọkụ ka gagharịa mara ebe nwere ike iribido ha mperi ma ụdị ihe ahụ mee ma gwa ya ozigbo.

Ndị NYSC erie ka bọsụ

Image copyright TWITTER/@NYSC_NG

Nke pụtara n'abalị ụnyahụ bụ na ndị ji otu afọ efe alanna bụ Nigeria Youth Corpers na Bekee ga-eso rite elele na ụgwọ ọnwa opekata mpe gọọmenti etiti tinyere ndị ọrụ.

Minista na ahụ maka ndị ndorobịa na mmegheri ahụ bụ Sunday Dare tinyere ozi a n'akara twitter ya n'abali ụnyahụ.

Dare kwuru na Onyeisi ndị NYSC bụ Brig Gen Shuaibu Ibrahim ga-akọwa nrite ahụ mgbe ya na Minista okwu ego dị n'aka kpachara n'uzuụka ọzọ.

Cheta na n'ọnwa Apreelu 2019 ka gọọmenti kwetere na ha ga-etinye ego n'ụgwọ ọnwa opekatampe ndị ọrụ, ebe ha na otu ndị ọrụ kapịrị ya bụ nkwa ha kwere ha ọnụ n'izu gara aga.

Buhari ekelele Trudeau maka mmeri ya

Image copyright Getty Images

Onyeisiala Muhammadu Buhari ekelela ogbo ya nke Canada bụ Justin Trudeau maka mmeri o meriri na ntuliaka nke abụọ dịka onyeisiala nke mba ahụ.

Buhari na-eche na mmeri ya ga-adọtị ọdịnamma Naịjirịa na Canada.

Buhari sị na ya tụrụ anya na ahịa mba abụọ ahụ zụru afọ gara aga bụ nke ururu nde $948.4 ga-agba mkpị n'ọchịchị ọhụrụ ya a.

O kwukwara na njem nlete otu gọvanọ mba ahụ bịara na Naịjrịa na afọ 2018 mere ka ọ mata ka Naịjirịa si etinye enyemaka mba Kanada n'ọrụ maka ndị mkpagbu Boko Haram metutara.

Trump na Turkey

Image copyright Getty Images

N'ofesi, onyeisiala Donald Trump enweliela mmachipu gọmentị ya machiri mba Turkey.

Nke a na-eme ka Russia na Turkey kwekọrịtara ịdowe ndị agha na okeala Turkey na Kurd maka ikwusi agha nke malitere ebe ahụ maka ọpụpụ Amerika.

Turkey malitere ịbasa ndị Kurd agha mgbe Amerika kpọpụrụ ndị agha ha na mberede bụ ndị nọbụ nche n'okeala ahụ.

Turkey na-ahụta ndị Kurd ka ndị agha omekataraihe puọ ụjọ.

Mana ndị mba ụwa anaghị ahụ ha otu ahụ.

The agha Kurd nyeere Amerika aka lụsa ndị ọmekataraihe pụọ ụjọ kporo onye ha ISIS agha na Syria.

Agbanyeghị ụtọ Amerika na ndị Kurd, Trump kwuru na " ndị ọzọ bịa lụtụ ọgụ n'ala nkwafu ọbara a".

Ọtụtụ mmadụ katọrọ ya bụ agwa Trump kpara ọkachasị ndị Pati Democrat nakwa ndị pati ya bụ Republicans otu o si gbahapụ ndị Kurd eleghị anya n'azụ, agbanyeghị ahụhụ niile ha so ha taa n'agha ISIS.

Buhari agụgharịala aha ọzọ

Image copyright @bashirahmad
Nkenke aha onyonyo Muhammadu Buhari gara njem ọrụ na Rọshịa

Onyeisiala Muhammadu Buhari agụgharịala Ministri na ahụ maka mkparịta ụka bụ Ministry of Communication aha ya.

Malita ụgbụa, ya bụ Ministri ga-ebido ịzazị Ministry of Communication and Digital Development.

Onyeisiala tinyere aka n'akwakwọ nyere ikike ka Minista na-elekọta ya bụ Ministri anya nwee ike ịgbanwe aha ahụ.

N'akwụkwọ ahụ osete onyeisi mgbasa ozi Ministri bụ Philomena Oshodin tinyere aka, ọ sị na aha ahụ ga-eme ka ya bụ Ministri bụrụ ọgbara ọhụru n'ihe na nke mbụ a taala akị.

Ọ sị na ya bụ aha ọhụrụ ga-eme ka Ministri ahụ nwee ike ịwebata mgbawe ọgbara ọhụrụ nke teknuzu n'usoro gọọmenti si eme ihe.

Oshodin sị na ọ bụ ekpere Minista ya bụ Isa Ali Ibrahim Pantami ka onyeisiala zara ya.

Barcelona na Slavia Prague

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Barcelona na Slavia Prague

N'egwuregwu champions league agbara ụnyahụ, Barcelona pịara Slavia Prague ọkpụ abụọ asatara otu, ebe Chelsea ji otu ọkpụ merie Ajax.

Liverpool jikwa ọkpụ anọ charaacha merie KRC Genk dịka Inter Milan ji ọkpụ abụọ merie Borussia Dortmund.

Gee nkeji nke taa

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ịkọ mgbe ọbụla

Ihe nkiri

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionỤlọahịa mmadụ 68 lara n'iyi n'ahịa dị n'Obiagụ n'Enugwu

Akụkọ kachasị