Russia-Africa Summit: Ihe asaa Buhari na Putin kpara

Nigerian Presidency Image copyright Nigerian Presidency

Ọ bụghịzị ihe ọhụrụ na Buhari na Putin nke mba Rọshị nwere mkparịtaụka na Sochi, Rọshịa ụnyahụ.

Ka anyị keere gị ya na ngwugwu bụ ihe ha kpatara na ya bụ nzụkọ ha nwere.

Ihe ha kwuru

  • Buhari na Putin kwetere na ha ga-agbakọ aka mezie ụlọọrụ na emepụta mmanụ Bekee kpọrọ 'refinary' nke ndị Naịjirịa.
  • Ha kwetakwara ịrụkọ ọrụ na imepụta gasị site n'ijiko aka ha na ndị ọrụ gasi nke Rọshịa akpọrọ Gazprom.
  • Ndị isi abụọ ahụ kwekọrịtakwara ịdozi Ajokute steel Rolling Mill nke Naịjịrịa dịka Onyeisiala Buhari rịọrọ ya.
  • Putin na Buhari kwekọrịtara ịmalite irụpụta ụlọọrụ nke nuklea nke ga-enye aka ịrụpụtakwụ ọkụ latrik na ihe ndị ọzọ.
  • Ha sị na ha ga-etinye anya na ịhazịgharị ọdịmma na nrụrịkọta nke ndị agha mba abụọ ha bụ nke ụkwụ jiri kemgbe.
  • Buhari na Putin sịkwa na ha ga-etinye anya n'ihe gbasara ọrụ ugbo na agụmakwụkwọ.
  • Buhari rịọrọ Putin ka onye aka mee ka Naịjrịa soro na otu ndị nwere agba na United Nations Security Council, bụ nke Putin kwere ya nkwa na ya ga-eme.

Akụkọ ga-amasị gị

Ihe nkiri ga-amasị gị:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionKing Jaja of Opoba: Ndị ntọ tọọrọ ya mgbe ọ gbar afọ 12