South East in Nigeria: Usoro mmepe ala Igbo amalitela

Ndị Gọvanọ South East na ndị otu na-ahụ maka mmepe obodo bụ SEREDEC ekwekọrịtala na ijikọ aka ọnụ na-akwadọ ọrụ bụ nke ga-eweta ọganihu na mmepe obodo.
Onye isi ndị Gọvanọ ala Igbo bụ Gọvanọ Dave Umahi nke Ebonyi steeti gụpụtara ọtụtụ ọ natara chi dị na steeti ya dịka nnu Uburu, Osikapa Adani nke chọrọ nkwalite maka ọganịhu.
Onye kpọkọtara ọgbakọ "Economic Forum" ma bụrụkwa onyeisi SEREDEC bụ ọkankuzi Bartholomew Nnaji kọwara na ebumnobi ha bụ ka ọ dị mfe mmadụ ma ọ bụ gọọmenti itinye ego n'ọrụ.
Nnaji na ndị otu ya edepụtala ngalaba gụnyere 'Enyimba Industrial City', 'S/E gas pipeline', 'S/E finance Company SEFCO' dịka ebe gọọmenti na ndị nkịtị ga-etinye ego mmepe na mpaghaara ọwụwanyanwụ Naịjiria.
Ọkammụta Barth Nnaji bụ onyeisi SEREDEC
Ya bụ mmemme nkparịta ụka emere n'Enugu bụ nke gọvanọ ndị ọwụwa anyanwụ niile na ndị ọnụ na-erụ n'okwu maka mmepe obodo nọ na-ya.
Ụzọ ọjọọ egbuola anyị - Ndị ọkwọ ụgbọala
Dọkịta Pascal Dozie bụ onyeisi kọmitii
Pascal Dozie bụ onye isi kọmitii mbụ kwuru na oge eruola mgbe ndị ọwụwaanyanwụ ga ewepụ "nkem nkem " ma tinye "nke anyị nke anyị" ka ọganịhu wee bịa.