Stray bullet death: Ọ bụghị onye uweojii gbagburu mmadụ n'Alor- Ndị uweojii Anambra

Nnaemaka Nnabuenyi Image copyright Chinonso Ugoagha

Ndị uweojii na steeti agọọla na ọ bụghị onye otu ha gburu onye mgbọ tungburu n'Alọ, Anambara steeti.

Akụkọ na-efegharị na soshal midia na-ekwu na onye uweojii gbagburu otu dịmkpa n'Umuokwu, Alọr na Anambra steeti a kpọrọ Nnaemeaka Nnabuenyi ụbọchị Fraide.

Dịka kepu kepu ahụ si kwuo, ehi tọpụrụ n'ụdọ n'ụbọchị Ekeresimesi, onye uweojii nọ ọrụ n'ụlọ ọgaranya ebe o mere, were gbaa ehi egbe.

Egbe hapụ ehi tụọ dịmkpa nọrọ onwe ya bụ Nnaemeaka Nnabuenyi.

Image copyright Chinonso Ugoagha

Mana ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ bụ Haruna Mohammed kwuru na ọ bụghị onye otu ha kpara mkpamkpa ahụ.

Mohammed kwuru na ndị uweojii ka na-enyocha ya bụ okwu iji mata onye mere ihe ahụ, ma dọọ aka na ntị ka ndị mmadụ kwụsị ịkọ ihe edoghị ha anya.

A nwụchiela nwoke zubara n'ime ụgbọelu

Image copyright @flyairpeace/Twitter

Ndị isi ọrụ ọdọụgbọelu a kpọọ FAAN anwụchiela otu nwoke dịka ọ gbarịlịrị izubanye n'ụgbọelu n'ọdọụgbọelu 'Murtala Muhammed International Airport' dị na Legọs ụbọchị Fraide.

Nwata nwoke ahụ amabeghị aha ya gbarịrị iriba n''wheel ụgbọelu Air-Peace na-aga Owere n'ụtụtụ oge ụgbọelu ahụ na-achọ ifepụ.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media caption'Di m sị anyị lawa na ọ na-abịa - Nwaanyị si South Africa lọta

Ọnụ na-ekwuru ụgbọelu ahụ bụ Stanley Olisa kwuru n'ozi o wepụtara na o mere n'ụtụtụ Fraide ebe elekere itoolu.

"Otu nwoke nwere ike ịdị afọ iri abụọ si n'ọhịa tipụta gbalịa isi n'ụkwụ ụgbọelu tibata n'ime ụgbọelu."

"Anyị gbara ndị ọrụ nchekwa ụgbọelu ama, ha bịa nwụchie ya."

Nke abụghị mbụ mmadụ na-ezubanye n'ụgbọelu na-achọ ifepụ gawa obodo ọzọ na Naijiria.

N'afọ 2013, Daniel Ihekina, nwata nwoke dị afọ 15 zubanyere n'ụlọelu si Benin gawa Legọs.

Anyị meere Sowore na Dasuki ebere - Malami

Image copyright Twitter/@MalamiSan
Nkenke aha onyonyo Abubakar Malami, ọkaiwu ukwu nke gọọmentị etiti.

Ọkaiwu gọọmentị etiti na-akọwa na ọ bụ ebere ka gọọmentị wee tọhapụ Omoyele Sowore na Sambo Dasuki bụ ndị e ji n'ụlọ mkpọrọ ndị DSS.

Abubakar Malami kwuru na gọọmentị nwere ikike ijigide mmadụ abụọ ahụ n'agbanyeghị n' ụlọikpe enyela iwu ka a tọhapụ ha.

Na Morroco

Image copyright Youtube
Nkenke aha onyonyo Mohamed Sekkaki

A tụọla otu onye na-eme ihe onyonyo 'Youtube' mkpọrọ afọ anọ ma rie ya nha puku dọla anọ maka ịkparị onye eze ndị Morroco.

A nwụchiri nwoke a aha ya bụ Mohamed Sekkakị na mbido ọnwa Disemba maka ihe onyonyo o mere nke ndị isi obodo sị na ọ kparịrị eze ha.

EPL

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Onye nkuzi ndị Manchester City bụ Pep Guardiola

Manchester City ga-ezute Wolves n'asọmpi English Premier League ụbọchị Fraịde.

Wolves meriri Man City oge ha zutere onwe ha n'ọnwa Oktoba, ka anyị lewenu ma Man City enwerike imegwata.

Ụgbọelu akpọkasịala ma gbuo ihe ruru mmadụ 15

Image copyright Reuters

Ihe akwa arịrị mere ka ụgbọelu bu mmadụ iri itoolu na asatọ (98) kpọkasịrị na mba Kazhastan ma gbuo ihe ruru mmadụ iri na ise.

Akụkọ kwuru na ụgbọelu Bek Air ahụ danyere n'ụlọelu ogogo abụọ, na-erughi nkeji ole na ole o si n'ọdọụgbọelu Almaty felie.

Ihe ruru mmadụ 60 gụnyere ụmụaka, merụrụ ahụ na-anata ọgụgwọ n'ụlọọgwụ ugbua.

Ụgbọelu ahụ si obodo Almaty na-aga Nur-Sultan bụ isiobodo mba ahụ, tupu ọ daa.

Ụgbọelu ahụ enwurughi ọkụ, mana ọ gbajiri abụọ ka ọ dabachara n'ime ụlọ ahụ.

Burna Boy

Image copyright @burnaboygram
Nkenke aha onyonyo Burna ritere uru dịka ọkaibe na otiegwu mba ofesi

Ndị mmadụ na-etu otiegwu a ma ama bụ Burna Boy aha dịka ọ zụrụ ụgbọala chara chara ọzọ.

Cheta na e depụtara aha ya dịka ndị nwereike inweta nturuugo Grammy maka 'ọbaegwu kacha mma n'ụwa' n'afọ 2020.

'Typhoon Phanfone'

Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Ndị bi n'obodo Ormoc na-egwufe na mmiri

N'ofesi, Ọnụọgụgụ mmadụ ole nwụrụ n'ajọ ifufe Typhoon Phanfone mere na mba Filipịns eruola iri abụọ na asatọ.

Ndị ọrụ gbatagbata na mba ahụ ekwuola na a ka na-achọ ihe ruru mmadị iri na abụọ.

Egwuregwu

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Trent Alexander-Arnold

N'egwuregwu, Liverpool ejirila pọintị iri na atọ agafe Leicester City bụ ndị ha nyụrụ anya n'ụbọchị Tọzde.

Ebe kepu kepu si mba Itali apụta na-akọwa na Zlatan Ibrahimovic dị afọ iri atọ na isii, nwereike ịlọghachite AC Milan bụ ebe ọ gbaburu bọọlụ mbụ.

Gịnị mere #StarboyFest na #KizzDanielLive ji ewu?

Ndị mmadụ na-ama otiegwu Kizz Daniel njakịrị maka etu o si tinye emume ya ụbọchị Wizkid tinyere nke ya.

Ha na-asị na nke ya emeghi ọfụma etu o kwesịrị makana Wizkid kpọkọrọ ndị niile gaara eme ka nke ya kpoo ọkụ etu o chere.

E mechiela ụzọ Shagamu

Image copyright FRSC
Nkenke aha onyonyo Ihe mberede ọkporoụzọ mere n'okpuru Akwa Shagamu

I si mpaghara Ọdịda-anyanwụ aga ala Igbo? Mara na e mechiela akwa Sagamu dị n'Ogun steeti bụ ụzọ ị kwesịrị isi gafee.

Nke a na-eme dịka ụgbọala abụọ na-ebu mmanụ agbịdị kụkọtara onwe ha ma nwuru ọkụ gbara akwa ahụ n'ụbọchị Ekeresimesi, nke mere ka ndị nhazi njem okporoụzọ bụ FRSC kwuo na ọnọdụ akwa ahụ adịghịzị mma.

Nke mere ọhụrụ

Dịka e mechiri ụzọ Shagamu maka ọkụ gbara akwa, ndị na-elekọta ụzọ bụ FRSC, ekwuola na a ka nwere etu a ga-esi gafere akụkụ ụzọ ahụ.

Ha kwuru na ha emechiela akụkụ ebe ọkụ ahụ gbara, ma na-agba mbọ ịhụ na ha jikwatara akwa ahụ.

Gụzuo maka ya ebe a: Ị na-aga ala Igbo? Mara na e mechiela Akwa Shagamu

Liverpool 4 - Leicester City 0

Liverpool asọghị ndị ha bịara ileta n'ụlọ anya, ka ha ji goolu anọ chara acha gbajuchaa Leicester City afọ.

Kelechi Iheanachọ bụ nwaafọ Naịjirịa na-agbara Leicester City esoghi gbaa ya bụ bọọlụ mana Wilfred Ndidi so gbaa akwụsịnwughi mmebọ e mebọrọ ha n'azụ ụlọ ha.

Gere akụkọ BBC Igbo n'otu nkeji:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ịkọ mgbe ọbụla

Ihe nkiri a ga-amasị gị:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionChristmas Message: Lee ka ndị a ma ama sị agba Ekeresimesi