Bayelsa State: Ihe mere onyeisi ụlọomeiwu nke Bayelsa jiri gbaa arụkwaghịm

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ndị ụlọomeiwu Bayelsa n'afọ 2005

Onyeisi ụlọomeiwu nke Bayelsa steeti bụ Monday Bubou-Obolo agbaala arụkwaghịm.

Osote onyeisi ụlọomeiwu ahụ bụ Abhraham Ngobere ewerela ọchịchị ugbua.

Nke a na-abịa dịka e duchara Duoye Diri dịka gọvanọ steeti ahụ.

Akụkọ na-ekwu na Bubou-Obolo rituru n'ọkwa ya n'ihi na ya na Diri si n'otu mpaghara steeti ahụ pụta.

Cheta na ọ bụ ụlọikpe kachasị mere Diri gọvanọ dịka ha kagbuchara mmeri David Lyon nke pati All Progressives Congress.

Chinedu Orji Image copyright Abia state house of Assembly

Ndị uweojii akwụsịla ngagharịiwe ahụ ndị mmadụ chọrọ ime maka ebubo ana ebo nwa T. A. Orji na nwa ya bụ Chinedu Orji n'Abia steeti

Mana anyị nụkwara na ngagharịiwe a nke a sị bụ ka a chụtuo Chinedu Orji n'ọkwa onyeisi ụlọomeiwu Abia Steeti ga aga n'ihu n'Abuja.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Abia steeti bụ Godfrey Ogbonna gwara ndị ntaakụkọ na ha enwetebeghi akwụkwọ ndị na-akwado ya bụ ngagharịiwe.

Mgbe onye ntaakụkọ gwara ya na ndị isi ndị uweojii enwetalarị akwụkwọ nke ha n'Abuja ma nyekwa ikike ka ya bụ ngagharịiwe gaa n'ihu.

Ogbonna zara na ha enwetebeghị ntụziaka ndị isi ha gbasara ya bụ ngagharịiwe nke mere na ha agaghị ekwe ka ya bụ ngagharịiwe gaa n'ihu n'Abia steeti.

Lassa fever abatala Legọs

Lassa fever na Nigeria Image copyright Reuters
Nkenke aha onyonyo Ọrịa lasa fiva (Lassa Fever) dịka ka ọ bụ ndị ọrụ ahụike ka ọchere aka mgba

Gọọmentị Legọs Steeti ekwuola na ọrịa ịba Lassa abatala na Steeti ha.

Kọmishọna ahụike na steeti ahụ bụ Akin Abayomi kwuru na onye bu ọrịa a nọzị n'ụsọ ebe ọ gaghị emetu ndị ọzọ ahụ n'ụlọọgwụ LUTH.

Ahịhịa dị na udu mmanụ ụgbọelu

Ụgbọelu Boeing Image copyright Getty Images

A hụrụ ahịhịa n'ime udu mmanụ ụgbọelu a kpọrọ fuel tank n'ụgbọelu Boeing 737 Max be nke a rụrụ ọhụrụ.

Onye isiụlọọrụ Ụgbọelu Boeing sị na ọ maghị ka mmiri si banye n'opi ụgbọghịrị ma gbarụọ ihu kwuo na ha agaghị anabata ụdị ihe ahụ n'ọrụ ha.

N'egwuregwu

Deontay Wilder na Tyson Fury Image copyright ALLSPORT/Getty Images

N'egwuregwu Deontay Wilder aṅụọla iyi na ọ ga-abụ ọkaibe n'iti ọkpọ dị ka Muhammad Ali ma ya lụọ ọgụ nchekwa nturu ugo ya nke ụgbọrọ iri na otu.

Wilder kwuru nke a dịka ọ na-akwado ọkpọ nke ya na Tyson Fury ga-akụ n'ụbọchị Satọde.

Gee akụkọ ndị a n'otu nkeji

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile
Federal Polytechnic Nekede Image copyright fedpolynekede.edu.ng

Nwa onyeisiala Naịjirịa bụ Fatima Buhari mere njem mberede na Federal Polytechnic Nekede, Owerri, ụbọchị Monde.

Ya bụ nwaada gara njem nleta na ya bụ ụlọakwụkwọ ekwughị ihe ọbụla ka o ruru ebe ahụ.

Mana dịka ọnụ na-ekwuru ya bụ ụlọakwụkwọ bụ Ever Nwosu siri kwuo, "ihe ụlọakwụkwọ anyị na-amasị ya".

Nwosi sị na Fatima gara leta ọtụtụ iche iche ebe dịka ngalaba na-amụ maka ahụike.

Mgbe BBC jụrụ ya ihe nwere ike ibute mmasị nwaagbọghọ a n'ụlọakwụkwọ ha, Nwosu sị na ya enweghị ike ịkọwa mana ụlọakwụkwọ ha nọ n'isi ụlọakwụkwọ ndị nka na ụzụ na Naịjirịa dịka ndị National Board for Technical Education (NBTC) si kwuo.

O kwukwara na ọ bụ Federal Polytechnic Nekede bụ Mahadum nka na ụzụ akacha achọ na ụle Jamb dịka ndị ụlọọrụ ahụ siri kwuo.

Nwosu sị na ọ ga-abụ ihe ndị a mere anya onye ọbụla ji dị na ya bụ ụlọakwụkwọ.

Okwukwara na-onweghị ihe ụlọakwụkwọ ahụ rịọrọ ya mana atụrụ anya na ọ nwere ike ịgwa ndị isi ihe ọ hụrụ n'ụlọakwụkwọ ahụ na njem ya.

Ndị omekome awakpola obodo ọzọ na Borno steeti

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ogbunigwe so na ihe ndị Boko Haram jị ebuso Naịjirịa agha

Na tuzdei ka ndị ekperima a wakporo Kwarangulum na Ntsiha bụ obodo abụọ nọketere Chibok.

Ọnụ na-ekwuru otu obodo ọzọ nọketere ebe ahụ bụ Allen Manasseh kwuru na-agbakwuru ọtụtụ ụlọ ọkụ n'obodo ndị ahụ dị na Borno steeti.

Boss Mustapha ekwuola uche ya

Image copyright Boss Mustapha/Twitter

Ndị isi ọchịchị gọọmenti etiti ekwuola na ịchutu ndị isi ọrụnchekwa na mberede ga-emebi ihe na Naịjirịa.

Ọ bụ odeakwukwo ukwu gọọmenti etiti bụ Boss Mustapha kwuru nke a n'emume ndị otu Christain Association of Naịjirịa mere.

Ndị eji eji na Japan enwerela onwe ha

Image copyright EPA

Ọzịọma pụtara na Japan n'ụtụtụ Wenezde a na-egosi na onye mbụ agbala ụkwụ n'ala site n'ọgbọmmiri Diamond Princess eji eji izuuka abụọ maka nnyọcha Coronavirus.

Nnyocha gosiri na mmadụ narị ise, iri anọ na abụọ butere ya bụ ọrịa n'ụgbọmmiri ahụ a na-ekpori ndụ n'ime ha.

Uefa Campions league

Image copyright Reuters

N'egwuruegwu agbara ụnyahụ Atlatico Madrid gbara Liverpool otu ọkpụ.

N'aka ọzọ, Borisia Dortmund ji ọkpụ abụọ asatara otu merie Paris St. Germane.

Gee akụkọ ndị a na nkeji

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Akụkọ ga-amasị gị