Sex for Grades: Onyenkuzi mahadum Legos eritela nga afọ iri abụo na otu

Image copyright Getty Images

Atụọla onyenkuzi na Mahadum Legọs bụ Afeez Baruwa nga afọ iri abụo na otu maka iwakpo nwaagbọghọ gbara afọ iri na asatọ na-achọ ụzọ ibata Mahadum.

Ọ bụ ọkaikpe Josephine Oyefeso kpere ya bụ ikpe na ụloikpe elu dị n'Abuja n'ụbọchị Frịde.

Oyefeso kwuru sị 'Enweghị m ike ịghọta ihe nwatakịrị a na-agabiga maka mwakpo a. Onye a ikpe mara megidere nwata nwaanyị a, ezinụlọ ya, ndị agbata obi na Chineke'.

Maka ngalaba ga-achịkọta ndị gbajọrọ Boko Haram.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Boko Haram egbuola ihe karịrị mmadụ puku iri abụọ ebe ha chụpụrụ mmadụ ruru nde na mpaghara Naịjirịa, Chadị kamgbe ha malitere n'afọ 2009.

Atụmatụ iwu Ibrahim Gaidam na-anọchite Yobe East n'ụlọ omeiwu n'Abuja wepụtere n'ụbọchị Tọsde chọrọ ka ehibe ngalaba ga na-ahụ maka ndị gbajọrọ Boko Haram.

Iwu a ọtụtụ ndi omeiwu na-agbarụrụ ihu chọrọ ka esepụtere ndị Boko Haram gbajọrọ ịkwa mgbọ ute nabata.

Nke a na-abịa dịka ndị agha Naịjirịa kwuru na ha na-akuziri mmadụ 608 gbajọrọ Boko Haram etu ha ga-esi lọghachite ọha.

Nke a bụ izizi a gụru iwu a n'ụlọ omeiwu.

Gọọmentị Anambra agbapeela Ahịa 'Electronics' Nnewi

Ya bụ ahịa Electronics Nnewi agbachiri kemgbe ụbọchị Tuzde amalitela ahịa ọzọ.

Onye ahịa na-achọghị ka akpọọ aha ya sị na gọọmentị ekwetala ka ha julata oyi maka ya bụ ahịa achọrọ ibufe n'ụzọ Nwaanyi Imo dị na Nnewi, Anambra steeti.

Ndị ahịa sị na iwe ha ejighị chọọ ịpụ bụ maka na agwabụghị ha agwa tupu a sị ha puọ.

Onye ahịa ahụ sị na ndị obodo tinyere ọnụ na ya bụ okwu bụ nke mere ka gọọmentị jụtụ oyi ka ha na ha nwe nghọta ka ya bụ ọpụpụ ga-esi dị.

Dịka ka nwoke si tụọ n'ilu, "akpaa akpa, arahụ n'ute".

Ihe nkiri maka Nnewi

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionGịnị ka ị ma maka ‘Nwaanyị Nnewi’?

Ndị agha Naịjirịa na Borno steeti

Image copyright AFP

Gọvanọ Borno steeti bụ Babagana Zulum ekwuola na ndị agha Naịjirịa kwesiri iwe mmadụ otu puko narị ọzọ ka esonye ebuso Boko Haram agha.

Zulum sịkwa na steeti ya kwesiri iwepụta ọkara n'ime ndị agha maka ọ bụ n'isi ụlọ ya ka ya bụ agha na-ada.

Maka ndị Chaịna pịara nwata ihe na kenya

Ụlọikpe na Kenya akagbuola akwụkwọ Minista maka ọdịmma imeobodo bụ Fred Matiang'i' tinyere aka maka ịchụla ndị Chaịna anọ.

Ndị Chaịna anọ a ji ụtarị pịapụ onye isiojii na arụrụ ha ọrụ mkpụru ọkwụrụ na ya.

Ịghalo abatala n'egwu

Image copyright Manchester United

A na-atụ anya na Odion Ighalo ga-eso malite egwu mgbe Manchester United ga-ezute Club Brugge n'asọmpi Europa League n'abalị Tọzde.

Ighalo gbara asọmpị izizi ya oge Man Utd zutere Chelsea n'abalị Monde mana e tinyere ya ka ọ fọdụrụ nkeji ise ka asọmpi ahụ gwụ.

Babagana Zulum na ọgụ Boko Haram

Image copyright The Governor of Borno State
Nkenke aha onyonyo Professor Babagana Umara Zulum visit Auno wia Boko Haram kill 30 passengers

Dịka Boko Haram na otu Islamic State na-akpa ike na mpaghara ugwu aka na-achị Borno steeti bụ ebe ọkachasị metụta ekwuola ka ewere ibu ọnụ na ekpere sowe ya bu ihe.

Gọvanọ Babagana Zulum si na-agbanyeghị etu ndị mmadụ ga-esi hụ oku a, ọnọdụ ya nọ mere ya bụru ihe ziri ezi.

n̄Ọ sị na atụmatụ a ga-abụ enyemaka gụnyere ihe ndi agha na-eme.

Okwu ya na-abịa dịka ndị omekome a wakporo otu obodo dị na Chibok ụnyaahụ.

Ebumọnụ a ka eme ụbọchị 24 nke ọnwa Febụwarị.

Ọkachamara Zulum sị na ya ga-ersoro buo ya bụ ọnụ.

Ndị China sị na ọgwu ịba Chloroquine na-egbu coronavirus

Image copyright Getty Images

Ọgwụ ejibu agwọ ịba n'Afịrịka akpọrọ Chloroquine bụ ihe nagalaba na-ahụ maka sayensi na Cahịna sị na-erere ha n'ịgwọ ndị butere nje Coronavirus.

Akụkọ si ụlọntaakụkọ gọọmentị akpọrọ China Global Televison Network sị na ndị ọkachamara maka nje kwekọrịtara na ọ bụ ọgwụ bụ ejecha agwụ maka nje a.

Ọgwụ a na-erebu ọfụma maka ọgwụgwọ ịba tupu nje na-ebute ya bụ ọrịa bịara mara ya ahụ.

Ụlọ ọrụ ntaakụkọ ọzọ akpọrọ Xinhua dekwara na a nwaara ọgwụ a na ụlọọgwụ iri na isi obodo Chaịna bụ Beijing nakwa mpaghara abụọ ọzọ.

Ndị sị na haq anwụchiela onye eche na o gburu nwaanyị na-arụ n'Aso Rock

Uweojii Nigeria Image copyright Getty Images

Aka ndị uweojii akparala otu nwoke eche na aka ya dị na ogbugbu Laetitia Naankang Dagan bu onye na-arụ ọrụ n'obi onyeisiala n'Abuja.

Ha sị na onye a aha ya bụ Edirin Ohonre 'abụwala abụọma' ka ha sị gbuo ya bụ ọchụ mana ọkpọtabeghị ọkaiwu ga-ekpechitere ya ọnụ ya.

Ndị omekome a gburu nwada Laetitia Naankang Dagan gbara afọ iri anọ na asaa n'ụbọchị Monde n'ụlọ ya dị n'Abuja.

Onyeisi ọrụ ya bụ nwaanyị na-ahụ maka mgbasaozi bụ Attah Esa sị na ya bụ nwanyị bụ onye Plateau steeti bịara ọrụ ụbọchị Mọnde bụ ebe ọ nọ rụọ elekere asatọ nke abalị, mana e gburu ya n'elekere iri na otu nke abalị.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Abuja bụ Anjuguri Manzah sị ha jidere ya bụ nwoke site na ama ndị ngalaba nzuzo ndị uweojii a kpọrọ Criminal Investigation Department (CID) gbaara ha.

Ha kwuru na ha chọpụtara na ya bụ nwoke e jidere nwere ndị ọzọ ya na ha kpara arụ a bụ ndị nke nọ n'ọsọ ugbua.

Manzah dọrọ ọhaneze akanantị ka ha kpachara anya maka a sịrị ndị mmadụ na-akọ na soshal midia gbasara ogbugbu nwaanyi a.

Ọrịa Lassa na LUTH

Image copyright Reuters
Nkenke aha onyonyo Oke bụ anụmanụ n'ebu ọria lassa

Ụnụ anụla na-edowela mmadụ iri isii na atọ ebe a ga-enyocha ha maka ịba lassa na Lagos University Teaching Hospital.

Ụnyaahụ ka onyeisi ya bụ ụlọọgwụ bụ Akin Abayomi kwuputara na ya bụ ọrịa abatala Legọs.

Ọchụ egburu na Hanau

Image copyright Reuters

N'ofesi, ndị omekome egbuola mmadụ asatọ ma meruo mmadụ ise ahụ n'obodo Hanua dị na Germany.

Ndị uweojii obodo ahụ sị na ha ka na-achọ ndị mere ya bụ ihe bụ ndị amabeghị uche ha.

RB Leipzig na Tottenham

Image copyright Getty Images

N'egwuregwu, RB Leipzig ji otu ọkpụ gool merie Tottenham be ha ụbọchị Wenezde.

N'otu aka ahụ Atalanta ji ọkpụ anọ asatara otu merie Valencia na be nke ha n'egwuregwu Champions League agbara ụnyaahụ.

Gee akụkọ ndị a n'otu nkeji

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Akụkọ ga-amasị gị

Isiokwu Ndị Emetụtara