Coronavirus Tips: Ọ bụghị eziokwu na ndịọrụ gọọmentị na-ebufe ndị mmadụ coronavirus

Coronavirus Tips: Ọ bụghị eziokwu na ndịọrụ gọọmentị na-ebufe ndị mmadụ coronavirus

Gọọmentị Legọs kwuru na ha ga-amalite ịga n'ụlọ n'ụlọ inyocha ndị a na-eche na ha nwere ike ibu ọrịa coronavirus.

Mana akụkọ malitere iwu na soshal midia bụ na ọ bụ ndịọrụ gọọmentị na-ekesa ndị mmadụ ya bụ nje.

Nke a bụ okpotokpo asị.

Ọzọ, ọbụghị mmadụ niile ka a na-enyocha maka ọrịa, ka ọ bụ ndị e chere na ha na ndị nwere covid-19 mekọtara ahụ, maọbụ ndị bi n'ogbe ebe ndị nwere ya bụ ọrịa buru ibu.

Biko gbaara akụkọ ụgha ọsọ.