Owerri Building Collapse: E jighi akụrụngwa dị mma rụọ ụlọ ahụ dara ada n'Owere - OCDA
Owerri Building Collapse: E jighi akụrụngwa dị mma rụọ ụlọ ahụ dara ada n'Owere - OCDA
Akụkọ ka na-apụta n'ụlọelu ogoogo asatọ nke dara ada n'Owere, Imo steeti n'ụbọchị Tọzde.
Onyeisi ngalaba 'Owerri Capital Development Authority' bụ Innocent Ikpemezie kwuru nke a na mparịtaụka ya na BBC Igbo n'ụbọchị Fraịde.
Ikpemezie kwukwara na e nyeghi ndị ahụ ikike ịrụ ụlọelu ogoogo asatọ kama nke ogoogo asaa.
O kwuru na ọ bụrụ na azọpụtachaa ndị tọrọ n'ime ụlo ahụ, gọọmentị ga-eweghara ala ahụ.