Abia State: Onweghi egbe ọbụla ndị Ugwu bubatara n'Aba - Ndị uweojii

Abia State: Onweghi egbe ọbụla ndị Ugwu bubatara n'Aba - Ndị uweojii

Akụkọ na-efegharị na soshal midia gbasara egbe a hụrụ n'ụlọ ekpere ndị alakụba na mpaghara Uratta dị n'Aba bụ okpotokpo asị.

Onye kwuru nke a bụ Geoffrey Ogbonna, ọnụ na-ekwuru ndị uweojii nke Abia steeti.

Ogbonna kwuru na akụkọ ahụ bụ akaọrụ ndị chọrọ ibutere Abia steeti aha ọjọọ.

Ọ gwara ndị mmadụ ka ha kpofuo ya bụ akụkọ ka nkịrịka akwa.

Gere olu Geoffrey Ogbonna na ihe onyonyo dị n'elu.

BBC Igbo kpọkwara otu onye bi na mpaghara Uratta, bụ ebe akụkọ ahụ kwuru na a hụrụ egbe ndị ahụ.

Onye ahụ kwuru na ha nụkwara ya bụ asịrị mana onweghi ihe dị etu ahụ ha hụrụla n'okirikiri ha.

O kwuru na ọ bụ eziokwu na e nwere ahịa ebe ndị ugwu na-ere yabasị n'ogbe ahụ, mana onweghị ihe ọbụla pụrụ iche ha hụrụla maọbụ nụ.

Nkọwa foto,

Nnia Nwodo

Akụkọ a na-abịa dịka ndị isi otu Ohaneze Ndiigbo boro ebubo na ndị Boko Haram nwere ike iso na ndị Ugwu na-awụbata n'ala Igbo.

Nnia Nwodo, bụ onyeisi Ohaneze kwuru na ha na ndịisi ndị Ugwu enweela mkparịtaụka gbasara ya bụ ihe mana onwebeghi ihe ha mere maka ya.

O kwuru sị: "Ebe ọ ga-aka njọ bụ na ndị mmadụ nwereike chọwa ihe ha ga-eji zọwa isi onwe ha ma ya bụru na ọ bụ eziokwu na ndị a na-abata bụ ndị obu egbe."