Imo state: 'Ihe mere anyi ji nwụchie ndị wakporo Hope Uzodinma'

Ndí órú Isopadec

Ebe foto si, Imo State Police Command

Ndị uweojii Imo steeti akpachiela ndị sị na ha bụ ndị ọrụ Isopadec mmadụ iri na ise dịka ha wakporo ahịrị ụgbọala nke Gọvano Imo steeti bụ Hope Uzodinma n'Owere.

Ha bokwara ndị ahụ ebubo "iji egbe na ngwa ọgụ ndị ozọ iwu megidere iwu ma butekwa ọgbaghara."

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeeti ahụ bụ Orlando Ikeokwu kwuru n'ozi o wepụtara na ndị ahụ ji egbe na mma wakpoo ụgbọala gọvanọ Imo steeti bụ Hope Uzodinma n'ụzọ Concord, ebe 'New Owerri' dịka ọ na-aga Obinze maka ọrụ.

"Ndi uweojii na-eme ngagharị bụ ndị ebekuru ha were gaa ebe ihe mere ma nwụchie mmadụ iri na ise, ndị enwetara otu egbe, mma abụọ, otu ihu mmọnwụ, otu ịga nakwa igodo."

Aha onyonyo,

'Ndị chekwa Imo steeti sị m esola ndị otu m mee ngagharịiwe' - Onyeisi ndị Pensioners

Ndị uweojii bokwara ebubo na ndị ahụ na-eti mkpu maka ụgwọ ọnwa atọ ha sị na gọọmenti ji ha, kụwasiri ugegbe ụfọdu ụgbọala so gọvanọ eme njem.

Ikoku gara n'ihu kwuo na e nyefele ndị ahụ anwụchiri n'aka ndị uweojii nzuzo maka nnyocha.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: