Ihe Wike na Obaseki kwuru maka Obaseki ịlaghachi APC

Ebe foto si, Godwin Obaseki
Nyesom Wike: A jụrụ m Godwin Obaseki ma ọ ga-ahapụ PDP...
Gọvanọ Edo steeti bụ Godwin Obaseki ekwuola na ya agaghị ahapụ PDP bụ pati nabatara ya mgbe APC bụbu pati ya gbakụtara ya azụ..
Obaseki gwara ndị ntaakụkọ ụbọchị Fraide oge ọ gara ikele onyeisiala Naijiria bụ Muhammadu Buhari n'Obi Gọọmenti Etiti dị n'Abuja na-ọ ga-abụ arụ ịlaghachị APC.
Ụfọdụ ndị mmadụ na-atụ uche na dịka o merichara Osagie Ize-Iyanmu na ntuliaka, na ọ ga-alaghachi n'otu APC, mana ọ sị na ọ gaghị eme eme.
Cheta n'ụtụtụ taa, Wike kwuburu na mkparịtaụka ya n'ụlọọrụ ntaakụkọ Channels TV na Obaseki agaghị ahapụ PDP gawa APC n'ihi na "APC abụghị Pati"
O si na ọ bụ "PDP yinyere ya (Obaseki) akwa ma nye ya ochendo oge mmiri na-ama ya."
"APC abụghị otu ndọrọndọrọ ọchị. Ha bụ ndị gabkọrọ aka ịnapụ PDP ike ọchịchị. Ya butere nsogbu ha na-enwekọrịta ugbua."
"Ha bụ ndị gbakọtara kpaa nkata megide Goodluck Jonathan."
Inec enyela Godwin Obaseki asambodo mmeri dịka Governor Edo state
Ebe foto si, Inec
Ngalaba ntuliaka bụ 'Independent National Electoral Commission' (Inec) enyela Godwin Obaseki na Phillip Shuaibu asambodo mmeri dịka Gọvanọ na osote Gọvanọ Edo steeti.
Onyeisi Inec n'Edo steeti bụ May Agbamuche-Mbu nyere ha asambodo a nke a kpọrọ 'Certificate of Return' na bekee, n'ụbọchị Tuzde.
O kwuru sị: "A na m ekwupụta taa na Godwin Nogheghase Obaseki onye otu ndọrọndọrọ 'Peoples Democratic Party' emeriela ntuliaka dịka gọvanọ nke Edo steeti bụ nke e mere n'abalị iri na itoolu nke ọnwa Sepụtemba afọ 2020."
Obaseki meriri Osagie Ize-Iyamu onye pati 'All Progressives Congress' na ntuliaka ahụ.
Ihe mere m ji soro ndị Edo na-anụrị maka mmeri Obaseki na ntuliaka Edo 2020 - Okorocha Rochas:
Aka chiburu Imo steeti bụ Rochas Okorocha ekwuola na ọ na-ekele ndị Edo steeti maka etu ha si tunyere Godwin Obaseki meriri ntụliaka ọkwa gọvanọ a ka mere ụnyahụ na steeti ahụ.
Okorocha onye kwuru na ọ naghị ekele pati ọbụla si na ọ dị mma ka ndị Edo si pụta tunyere onye ha bu n'obi.
O kwukwara na nke a gosiri na ha jịkọrọ aka buso mmegide dị na steeti ahụ.
O kwuru na mgbe ọ hụrụ Adams Oshiohmole, Hopoe Uzodimma nakwa ndị ọzọ ka ha na-achụ nta vootu na steeti ahụ tupu ntụliaka , ka ọ nọ wee mara ọ ga-abụ "Ben Johnson" maọbụ enweghị mmeri ga-adịrị onye ji ọkọlọtọ APC azọ ọkwa gọvanọ na steei ahụ.
Ihe ndị mmadụ na-ekwu na soshal maka okwu Rochas Okorocha gbasara ntụliaka Edo steeti
Onyonyo gosiri okwu ndị a Okorocha kwuru gbasara ntụliaka Edo.
Akụkọ na Hope Uzodimma anabataghị mpụtara ntuliaka Edo bụ ụgha- Ọnụ na-ekwuchitere ya
Ebe foto si, Facebook/Hope Uzodimma
Onye mgbasa ozi gọvanọ Imo steeti bụ Nwachukwu Oguwike ekwuola na akụkọ na-ekwu na Hope Uzodimma anabataghị mpụtara ntụliaka Edo bụ okpotokpo asị.
O kwukwara na akụkọ kwuru na gọvanọ Uzodimma tụnyere ego ruru ijeri naira atọ bụ asị.
O kwuru na ndị na-ede akụkọ ụgha a chọrọ itetọ aha gọvanọ Uzodimma na ihe niile o kwenyere na ya.
Oguwike kwuru na mbọ niile a na-agba site n'ịkọ akụkọ ụgha a bụ ka ewepụ uche Uzodimma n'ọrụ ọ na-arụrụ ndị Imo steeti mana nke a agaghị abịa na mmezu.
Na mbụ, akụkọ fegharịrị n'elu soshal midia na gọvanọ Hope Uzodimma anabataghị mpụtara ntụliaka ọkwa gọvanọ e mere n'Edo steeti ma na-akpọ ya ihe ihere.
Lee mpụtara ntuliaka Edo 2020
"A ga m enyocha mpụtara ntụliaka Edo steeti" - Osagie Ize-Iyamu
Ebe foto si, Ize-Iyamu/Twitter
Osagie Ize-Iyamu nke APC ekwuola na ọ ka na-etinye anya na mpụtara ntuliaka a, tupu o kwuo ihe ọzọ ọ ga-eme.
Ize-Iyamu nwetara vootu 223,619 iji bụrụ onye nke abụọ a kacha tụnyere vootu na ntuliaka ọkwa gọvanọ e mere n'Edo steeti, kelekwara ndị kwadoro ya.
Onyeisiala Buhari ekeleela Gọvanọ Obaseki maka mmeri ya
Ebe foto si, Obaseki/Twitter
Onyeisiala Muhammadu Buhari ebunyela Gọvanọ Godwin Obaseki ụkpa ekele maka imeri ntuliaka ya n'Edo steeti.
N'agbanyeghi na Onyeisiala Buhari bụ onye pati APC bụ ebe Obaseki si banye PDP tupu e mee ntuliaka, o kwuru na ihe kacha ya mkpa bụ na ntuliaka na-aga nke ọma na-ebughi ọgbaghara ọbụla.
Ụkpa ekele esila n'elu na ala na-awụbatara Gọvanọ Obaseki maka mmeri ya
Ebe foto si, SEYI MAKINDE/TWITTER
Ndị mmadụ amalitela ikele Gọvanọ Godwin Obaseki maka ịzọta oche ọchịchị Edo steeti ọzọ.
Ndị gụnyere Atiku Abubakar zọburu ọkwa onyeisiala Naịjirịa n'afọ 2019 na Gọvanọ Seyi Makinde nke Oyo steeti so na ndị bunyere Obaseki ụkpa ekele.
Gọvanọ Nyesom Wike nke Rivas steeti, Sinetọ Ike Ekweremadu na-anọchite ndị Enugwu West n'ụlọomeiwu ukwu, Gọvanọ Ifeanyi Okowa nke Delta steeti, so na ndị so ya na-enwe aṅụrị maka mmeri ya.
Ihe ndị ọzọ na-ekwu maka mmeri ya:
Bashir Ahmad bụ ọnụ na-ekwuchitere Onyeisiala Muhammadu Buhari kwuru na ọ dị mma na ọchịchị onyekwuouche ya mezuru n'Edo steeti, n'agbanyeghi na ọ bụghị ha meriri.
Ihe ndị ọzọ kwuru:
Obaseki ejirila mmeri kụpụta Ize-Iyamu ọnụ ikputu ọzọ
Ebe foto si, PDPAKWAIBOM/TWITTER
Gọvanọ Godwin Obaseki enwetela ikike ịchị Edo steeti afọ anọ ọzọ dịka o meriri ntuliaka ọzọ.
Ka o merichara, o kwuru okwu maka etu o si nabata mmeri ya, ma kelee ndị tụnyere ya vootu mere ka o nwee ike ịchị ọzọ.
Obaseki nọ n'okpuru pati PDP, nwetara vootu 307,955 iji bụrụ onye mbụ, ebe onye na-eso ya n'azụ bụ Osagie Ize-Iyamu nke APC nwetara vootu 223,619.
N'ime mmadụ 557,443 e nyere ikike ịtụ vootu, a tụrụ vootu 550,242. ebe 537,407 n'ime vootu ndị a atụrụ dị mma, 12,835 adịghị mma.
Ihe ndị ọzọ tụtara: APN: 57, APP: 78, LP: NNPP: 258, NRN: 573, 267, SDP:323.
Ọkammụta Akpofure Rim-Rukeh bụ onye mkpokọta gụpụtara mpụtara ndị a.
Lee etu mpụtara ntuliaka n'Edo steeti si gaa
A malitela ịgụ vootu n'Edo ka ụfọdụ ebe tụchara vootu
Amalitela ịgụ vootu n'ụfọ ọdọ ntuliaka n'Edo site dịka ndị mmadu binyechara aka n'akwụkwọ iji họta onye ga-achị ha dịka gọvanọ ruo afọ anọ.
Lee etu mpụtara ntụlịaka Edo site na mpaghara si kwuru
Mpụtara n'Orhionmwon bụ okpuruọchịchị ebe Ize-Iyamu si
Ndị denyere aha ha maka ịtụ votu: 118671
Ndị nwereikike ịtụ Votu: 24868
Mmadụ ole tụrụ Votu: 24213
APC: 10458
PDP: 13445
Akagburu vootu mmadụ 7600 na wọọdụ 7, kagbuo 7896 na wọọdụ 8 maka ọgbaghara dapụtara mgbe ha na-eme ntụliaka.
Mpụtara mpaghara Estako Central LGA
Ndị denyere aha ha maka ịtụ votu: 50004
Ndị nwereikike ịtụ Votu : 16092
Mmadụ ole tụrụ Votu: 16042
APC: 8359
PDP: 7478
Mpụtara mpaghara Estako East LGA
Ndị denyere aha ha maka ịtụ votu: 157291
Ndị nwereikike ịtụ Votu : 28464
Mmadụ ole tụrụ Votu: 27824
APC: 17011
PDP: 10668
Mpụtara mpaghara Akoko Edo LGA
Ndị denyere aha ha maka ịtụ votu: 121027
Ndị nwereikike ịtụ Votu : 46967
Mmadụ ole tụrụ Votu: 43994
APC: 22963
PDP: 20101
Mpụtara mpaghara Esan Central LGA
Ndị denyere aha ha maka ịtụ votu: 55569
Ndị nwereikike ịtụ Votu : 17931
Mmadụ ole tụrụ Votu: 17914
APC: 6719
PDP: 10794
Mpụtara mpaghara Igueben LGA
Ndị denyere aha ha maka ịtụ votu: 46828
Ndị nwereikike ịtụ Votu : 13404
Mmadụ ole tụrụ Votu: 13382
APC: 5199
PDP: 7870
Mpụtara mpaghara Ikpoba Okah LGA
Ndị denyere aha ha maka ịtụ votu: 310073
Ndị nwereikike ịtụ Votu : 61731
Mmadụ ole tụrụ Votu: 61,430
APC: 18218
PDP: 41030
Mpụtara mpaghara Esan North LGA
Ndị denyere aha ha maka ịtụ votu: 84741
Ndị nwereikike ịtụ Votu : 20825
Mmadụ ole tụrụ Votu: 20369
APC: 6556
PDP: 13579
Mpụtara mpaghara Uhunmwode LGA
Ndị denyere aha ha maka ịtụ votu: 73416
Ndị nwereikike ịtụ Votu : 16741
Mmadụ ole tụrụ Votu: 16635
APC: 5972
PDP: 10022
Mpụtara mpaghara Esan west LGA
Ndị denyere aha ha maka ịtụ votu: 99983
Ndị nwereikike ịtụ Votu : 25530
Mmadụ ole tụrụ Votu: 25459
APC: 7189
PDP: 17434
Mpụtara mpaghara Oredo LGA ( Ebe Gọvanọ Obaseki si)
Ndị denyere aha ha maka ịtụ votu: 309968
Ndị nwereikike ịtụ Votu : 64783
Mmadụ ole tụrụ Votu: 63880
APC: 18365
PDP: 43498
Akabgụrụ mpụtara na ward 7 na ward 2 maka nrụrụaka na ndị bu agbata votu gbaa ọsọ.
Mpụtara mpaghara Esan South LGA
Ndị denyere aha ha maka ịtụ votu: 73907
Ndị nwereikike ịtụ Votu : 19896
Mmadụ ole tụrụ Votu: 20203
APC: 9237
PDP: 10563
Akagburu mpụtara ward 1, ward 2 na ward 10 maka nrụrụaka
Mpụtara mpaghara Estako West LGA
Ndị denyere aha ha maka ịtụ votu: 158899
Ndị nwereikike ịtụ Votu : 48846
Mmadụ ole tụrụ Votu: 47367
APC: 26140
PDP: 17959
Mpụtara mpaghara Ovia North East LGA
Ndị denyere aha ha maka ịtụ votu: 143009
Ndị nwereikike ịtụ Votu : 28607
Mmadụ ole tụrụ Votu: 28371
APC: 9907
PDP: 16987
Mpụtara mpaghara Owan West LGA
Ndị denyere aha ha maka ịtụ votu: 61193
Ndị nwereikike ịtụ Votu : 23294
Mmadụ ole tụrụ Votu: 23253
APC: 11193
PDP: 11485
Mpụtara mpaghara Owan East LGA
Ndị denyere aha ha maka ịtụ votu: 91769
Ndị nwereikike ịtụ Votu : 34819
Mmadụ ole tụrụ Votu: 34761
APC: 19295
PDP: 14762
Mpụtara mpaghara Egor LGA
Ndị denyere aha ha maka ịtụ votu: 219841
Ndị nwereikike ịtụ Votu : 39709
Mmadụ ole tụrụ Votu: 39351
APC: 10202
PDP: 27621
Ezupuru akpati votu na Ogidi Ward 3 na unit 4,5 na 18
Ọgbaghara ọ dapụtara n'Edo steeti?
Kepu kepu malitere ifegharị na soshal midia na a na-agba egbe n'ụfọdụ akụkụ Edo steeti n'ihi ntuliaka a.
Mana mgbe BBC kpọtụrụ Joseph Imafidon bụ onyeisi ndị uweojii na mpaghara Iguododo na gburugburu ya, o kwuru na enweghi ihe dị etu ahụ mere.
Ndị ntaakụkọ BBC nọkwa na Benin kwuru sị na ha anụghị ụda egbe maọbụ ọgbaghara ọbụla.
Obaseki na Ize-Iyamu emeriela n'ọgbọ ntuliaka ha
Gọvanọ Godwin Obaseki emeriela n'ọgbọ ntuliaka ya bụ wọọdụ 4 unit 19 dị na Emokpae Primary School.
N'ime vootu 246 a tụrụ, o nwetara vootu 184 ebe Osagie Ize-Iyamu nke APC na-eso ya n'azụ nwetara vootu 62.
Ndị ọzọ bụ ADP nwetara abụọ ebe LP nwetara naanị otu, ebe a gụfuru vootu ise.
Akwụkwọ e ji edekọ vootu ole a tụnyere
Ebe Ize-Iyamu meriri na wọọdụ ya bụ wọọdụ 5 unit 26 dị na Iguododo Primary school.
O nwetara vootu 292 ebe Obaseki nke PDP nwetara vootu 21.
Ndị mmadụ nọ ebe ha nọ tụọ vootu na-eche ka a gụọ vootu ma mara onye kacha nwete vootu tupu ha alaa, dịka ha chọrọ ịchekwa vootu ha.
Ndi mmadụ na-eche ka agụọ vootu ha
Obaseki sị na obi adịghị ya mma maka agwa Inec na ntuliaka Edo
Obaseki sị na ya nọ n'anwụ ruo otu awa n'ọkara tupu o tụọ vootu
Gọvanọ Godwin Obaseki ekwuola na obi adịghị ya mma ebe ngalaba ntuliaka Naịjirịa bụ Independent National Electoral Commission (Inec) nọ, maka na ha akwadoghi ntuliaka a ọfụma.
Ọ sị: "E nweburu m nchekwube na Inec ga-akwado ọfụma maka ntuliaka. Anọ m ruo otu awa na ọkara tupu m tụọ vootu. Ọ bụ ihe iwe."
Ọ gakwara n'ihu kwuo na dịka ntuliaka a bụ nke otu ụbọchị, ya che na Inec ga-akwado ọfụma. Ọ dịghị mma n'obi ma ncha."
Ọ sị; "Kaadị njirimara ndị tozuru ịtụ vootu nọ na-akpụ akpụ ebe ọbụla.
Adams Oshiomhole sokwa kwụrụ n'ahịrị
Aka chụbụru Edo steeti bụ Adams Oshiomole sokwa pụta ịtụ vootu ma kwụrụ n'ahịrị
Adams Oshiomhole bụbu onyeisi pati APC nakwa gọvanọ Edo steeti kwukwara na ọ bụghị ihe ọma na igwe kaadị reader anaghị arụ ọrụ ebe ọ nọ, ma kwuo na Inec na-agharịpụ ha maka akwadoghi ọfụma.
Cheta na Oshiomhole chịrị Edo steeti afọ asatọ tupu Obaseki abanye ọchịchị.
Ize-Iyamu ahapụla obodo ya gawa Benin ka ọ tụchara vootu
Onye na-azọ ọchịchi n'okpuru pati APC bụ Osagiue Ize-Iyamu ahapụla obodo ya gawa Benin dịka o tụchara vootu.
Ize-Iyamu tụrụ vootu n'obodo ya bụ Iguododo dị na mpaghara Orhionmwon.
Ize-Iyamu na onyeisi ndị uweojii no ọrụ nchekwa n'obodo ya
Tupu ọ hapụ obodo ya o kwuru na ntuliaka, dịka ya siri hụ ya, na-aga nke ọma.
Mana, ka ọ pụrụ, nhazi niile emere maka mgochi coronavirus hasara dịka ndị mmadụ kwụsịrị ị nọ na nkwụcha.
Ndị na-atụ vootu n'obodo Iguododo dị na mpaghara Orhionmwo
Obaseki na nwunye ya atuọla vootu
Godwin Obaseki na nwunye tụrụ vootu nke ha n'Emokpae Model Primary dị n'Oredo.
N'agbanyeghị na ndị mmadụ na-asịbu ya gafee n'ihu, Obaseki si na ya ga-em ka ndị ọzọ ma nọrọ n'anwụ ruo mgbe oruru oge ya ịtu vootu.
Mm,adu karịrị, dịka anwụ na-achasị ike mana oge nke ha ruru ha nwere tụọ vootu.
Aka na-achị Edo steeti bụ Godwin Obaseki na nwunye ya kwụ n'ahịrị dịka ha bịara ịtụ vootu n'ụlọ akwụkwọ Emokpae Model Primary dị n'Oredo.
Ọgbaghara adaala dịka Obaseki bịara ịtụ vootu n'obodo ya
Dịka Obaseki bịara ebe a na-atụ vootu n'Emokpae Model Primary School ọgbaghara malitere dịka eboro otu onye ebubo na ọ chọrọ itisa ebe ahụ.
Ndị mmadụ nọ ebe ahụ kpụpụrụ onye ahụ yi uwe ojii tupu ọgbaghara o bu bịa akarịa
Obaseki n'onwe ya atụbeghị vootu dịka ọ ka nọ n'ahịrị eche oge oruru ya.
Obaseki ekweghi ịhapụ ịkwụ na-ahịrị, si na ọ ga-anọ ruo mgbe oge ya ruru ịtụ vootu.
Mmadụ ka nkụ na-ebe ahụ, nke mere ka ọtụtụ mmadụ na-aba mba na ahịrị adịghị aga ma ncha.
Ọbaseki siri ọnwụ na ya ga-akwụ n'ahịrị dịka ndi ọzọ
Ize-Iyamu atụọla vootu nke ya
Osagie Ize-Iyamu tụrụ vootu ya na obodo ya bụ Iguododo dị na mpaghara Orhionmwon.
Ka ọ tụchara vootu, Ize-Iyamu kwuru na ụmụnwaanyị na-aka ụmụnwoke atụ vootu na be ha. Nke a bụ iji saa ajụjụ ihe mere na ụmụnwoke karịrị ụmụnwaanyị.
Ọ sị: "Ụmụnwaanyị na-atụsị vootu ike ebe. Ha ka ga-apụta. Ụfọdụ n'ime ha ga-aga ugbo tupu ha a bịa ịtu vootu."
Ọ bụ na Emokpae Model Prinary School dị n'okpuru ọchịchi Oredoka Gọvanọ Godwin Obaseki ga-atụ vootu nke ya
Ndị mmadụ amalitela ịtụ vọọtụ
Amalitere ịtụ vootu n'Edo ọsọ ọsọ dịka a na-achọ ịhọpụta onye ga-achị Edo steeti.
Lee etu o si aga:
Ndi ntaakụkọ BBC na-ekwu na ndị mmadụ na-atụ vootu n'udo dịka ndị ọru nchekwa nọkwa ọrụ
Ndị mmadụ amalitela ịkwụ n'ahịri maka ịtụ vọọtụ n'Edo
Ọ bụ n'ọnụ ụtụtụ ka ndị mmadụ maliterea ịkwụ n'ahịrị maka ịtụ vootu a ga-eji họpụta aka ga-achị Edo steeti.
Ndị ntaakụkọ BBC nọ n'Edo na-ezita foto na-egosi etu o si aga
Ndị ọrụ Inec na-ebe Ize-Iyamu ga-atụ vootu
Exchefughi na covid-19 ka na-akpa mkpa na Naịjirịa. Lee ihe eji anyụcha aka Inec dewere n'ebe a na-atụ vootu
Akpati eji atụ vootu adịrịla njikere
A na-enyocha ndị mmadu ahu maka mgbochi coronavirus
Ndị ọrụ Inec adịrịal njikere na ọdọ vootu a
Ọ bụ mmadụ nde 1.7 tozuru ịtụ vootu n'Edo
Ihe a bụ ugboro abụọ mmadụ abụọ a ga-achịpụ ya n'Edo, mana ha tụgharịrị pati iji mee ya
Ngalaba na-ahụ maka ntuliaka bụ nke Bekee kpọrọ Independent National Electoral Commission (Inec) kwuru ọ bụ mmadụ nde 1.7 tozuru ịtụ vootu a ga-eji họpụta aka ga-achị Edo steeti na ntuliaka Satọde.
Ọ bụ mmadụ 2,210,534 denyere aha ha n'akwụkwọ maka ịtụ vọọtu mana ọ bụ sọsọ 1,726,738 nwetere caadị njirimara ndi tozuru ịtụ vootu.
Ọ bụ okpuru ọchịchị ime obodo 18 dị n'Edo, nke nwere ebe a ga-anọ tụọ vootu 2,627.
N'ime ndị a denyere aha ịtụ vootu, ụmụnwaanyị dị 1,051,209 ebe ụmụnwoke dị 1,159,325.
Ọ bụ pati 15 so azọ oche gọvanọ a mana ọbụ Peoples Democratic Party (PDP) na All Progressives Congress (APC) ka ọtụtụ che bụ ndị nwy ha bụ ndọrọndọrọ ọchịchị.
Aka na-achị steeti ahụ bụ Godwin Obaseki nọ na PDP ebe Osagie Ize-Iyamu nọ na APC.
Na ntuliaka nke e mere 2016, Ize-Iyamu zọrọ ọchịchi n'okpuru PDP ebe Obaseki ji ọkọrọtọ APC merie.
Ndị uweojii karịrị 300 awakpoola ụlọndina ebe Gọvanọ Nyesom Wike nọ n'Edo steeti
Ebe foto si, Gov Wike Twitter
Aka na-achị Rivas steeti bụ Gọvanọ Nyesom Wike etiela mkpu dịka ọ na-ekwu na ndị uweojii karịrị narị atọ chere ya aka mgba n'ụlọndina ebe ọ nọ n'Edo steeti.
Nke a na-abịa dịka Gọvanọ Wike onye nọ ọrụ dịka onyeisi ndị na-achụmnta vootu ndị pati ya bụ People's Democratic Party (PDP) kwuru na a na-egbochi ya na ndị gọvanọ ibe ya, ịrụ ọrụ ọ bịara ịrụ na steeti ahụ.
O tiri mkpu sị na e ji ndị uweojii ndị a na-adọkasị ha ahụ, iji tinye ha ụjọ n'ahụ.
N'otu aka ahụ, PDP na onwe ha eziputala akwụkwọ mkpesa ebe ha kọwara etu ndị ọrụ nchekwa si nọgide ndị gọvanọ nọ na pati ha n'Edo steeti.
Cheta na echi bụ Satọde, Septemba 19 bụ ụbọchị ntuliaka ọkwa Gọvanọ nke steeti ahụ.
Onyeisi ndị uweojii amachiela ngagharị ụgbọala n'Edo n'ihi ntuliaka Satọde
Ebe foto si, Nigeria Police
Onyeisi uweojii Naijiria bụ Mohammed Adamu, enyeela iwu na agaghị enwe ngagharị ụgbọala bido n'Elekere 11:59 nke abalị Fraide rue ELekere isii nke mgbede Satọde.
N'ozi nke ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Naijiria bụ Frank Mbah binyere aka, o kwuru na ya bụ ntuziaka bụ iji hụ nae gbochiri nfesa ngwaọgụ maọbụ ọgwụ ike nakwa ịhụ ihe niile gara n'anya ya n'oge ntuliaka.
Cheta na ndị uwe ojii ziburu ndị uweojii ruru popuku iri atọọ n'Edo maka ntuliaka ahụ.
Ihe mberede okporoụzọ adakwasala ndị ọrụ 'Daar Communication' na-aga Edo steeti maka ntuliaka
Ebe foto si, @AIT_Online
Ndị ntaakụkọ sị n'ụlọọrụ 'Daar communications' adanyela n'ihe mberede okporoụzọ ụbọchị Tozde dịka ha na-aga Edo steeti maka Ntuliaka Gọvanọ a ga-eme na steeti ahụ na ngwụcha izu.
Ndị nọ ebe ihe mere kwuru na mmadụ atọ n'ime ha merụrụ ahụ dịka ọdachi ahụ zutere ha n'Auchi.
E bugara ndị merụrụ ahụ n'ụlọ ọgwụ a kpọghị aha ya maka nleta.
Otu onye ọrụ AIT achọghị ka a kpọọ aha ya gwara BBC Igbo n'ekwentị na onweghị onye tufuru ndụ ya na ihe mberede ahụ.
O kwukwara na e bugara ndị merụrụ ahụ ụlọọgwụ ebe ha natara nleta ma gaa n'ihu na njem ha.
Inec amalitela ikesa akọrọngwa a ga-eji mee ntuliaka n'Edo steeti
Ụlọọrụ na-ahụ maka nhazi ntuliaka ba Naijria bụ 'Independent Electoral Commission' (Inec), amalitela nkesa akụrụngwa dị oke mkpa maka ntuliaka ọkwa Gọvanọ Edo state.
Cheta na ntuliaka a ga-adị n'ụbọchị Satọde, abalị iri na itoolu nke afọ 2020.
Akụrụngwa nke bụ maka okpuru ọchịchị Akoko Edo, hapụrụ ngalaba ụlọakụ etiti bụ CBN dị na Bini, gawa Akoko Edo n'ụgbọala pụrụ iche etinyere ihe a ga-eji amata ebe ọbụla ya bụ ụgbọala nọ.
Dịka onye ntaakụkọ BBC bụ Karina Igonikon si were kọwaa, Akoko Edo so n'okpuru ọchịchị mbụ a ga-ebuga akụrụngwa ntuliaka n'ihi na ọ dị anya site na Bini, Isiobodo Edo steeti.
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: