Patrick Chuka na-eji mkpịsị odee ese ihe akọwaala etu o si malite

Patrick Chuka na-eji mkpịsị odee ese ihe akọwaala etu o si malite

Patrick Chuka bụ nwaamadị na-eji mkpịsị odee ese ihe.

Chuka dị afọ 20 gwara BBC Igbo na ọ bụ ya ji aka ya kuziere onwe ya etu e si eji mkpịsị odee ese ihe.

Chuka bi na mba Amerịka ugbua, kwukwara na ise ihe bụ akaraka ya.

O kwuru na otu ihe na-enyetu ya nsogbu n'ọrụ a, bụ ịhụ ndị ga-agba ya aka ahịa.

Mana nke a egbochighi ya inye ndị ntorobia ibe ya na-eme nka ndụmọdụ, ebe ọ gwara ha ka ha gbasie mbọ ike ma na-achụsi nrọ ha ike.

Gere ihe o kwuru n'uju:

Ndị mere akụkọ a bụ Chiagozie Nwonwu na Chiemela Peter Mgbeahuru