Boris Johnson

  1. Mba Briten ga-abanye 'lockdown' ọzọ n'ụbọchị Tọzde - Johnson

    Boris Johnson

    Boris Johnson bụ praịm minista mba Briten ekwuola na ha ga-abanye mmechi obodo ọzọ bido n'ụbọchị Tọzde bụ ụbọchị ise nke ọnwa Nọvemba.

    O kwuru nke a n'ihi na ọrịa coronavirus anyụwakwala ha anya ebe ọ dị ọjọọ ọzọ n'Ịngland.

    O kwuru sị na "ugbua bụ oge ịkpa ike n'ihi na enweghizi ihe ọzọ anyị ga-eme."

    Johnson kwuru na ndị mmadụ ejila ọsọ gbapụ gaa na-abụ nri ha ga-azụkọ, n'ihi na ụlọahịa ebe a na-ere ihe ndị dị mkpa agaghị emechi.

    O kwukwara na ụlọọrụ ebe ndị mmadụ enweghi ike isi n'ụlọ na-arụ ọrụ agaghị emechikwa.

    Site n'ihe o kwuru, ndị mmadụ ga-esinwu n'ụlọ pụọ maka ihe gụnyere:

    • Ịga akwụkwọ
    • Ịga ọrụ ma ọ bụru na ị gaghị anọnwu n'ụlọ rụọ ọrụ
    • Ịga gbatịa ahụ
    • Ịga ụlọọgwụ
    • Ịga zụọ ihe oriri nakwa ihe ndị ọzọ dị mkpa
    • Ilekọta ndị ọzọ chọrọ nlekọta

    O kwuru na mmechi obodo a ga-adịgịde ruo ụbọchị abụọ nke ọnwa Disemba, mgbe ha ga-amalitekwa imepe obere obere site na mpụtara ha ga na-ahụ na mpaghara dị iche iche.